Ụlọikpe Amerịka ezitala ozi ịnwụchi Abba Kyari

Ebe foto si, Abba Kyari
Ụlọikpe dị na California na mba Amerịka ezitela ozi ịnata ikike ikpụfete Abba Kyari, onye bụbu osote kọmịshona ndị uweojii nzụzọ Naijiria maka ịtụbawa na mkpọrọ na nkwado ịmalite ikpe ya.
Arịrịọ a na-abia dịka ha chọrọ ibido ọrụ nyocha maka okwu ngabala ndị uweojii pụrụiche n'Amerịka bụ FBI n'aha ịchafụ, kwuru n'isi Abba, ebe ha si na ọ nara Ramon Abbas (Hushpuppi) bụ onye ikpe mara aka azụ.
Ya bụ na inara ikike inwụchi Kyari bụ maka na ha na atụ anya na onye a na-enyocha nwere ike igba ọsọ.

Ebe foto si, America
Chetekwa na akụkọ kwuru mba Amerịka na-enyocha Abba Kyari maka ebụbo Ramon Abbas onye e ji "Hushpuppi" boro ya na o nyere ya ego aka azụ, nke mere e jị kwusi ya ọrụ.
Na akara Facebook Abba Kayri nke ogbochiri oha ihụ ugbua, ọ wepụrụ ma kagbuo ozi o zipụtere ụbọchị nke iri abụọ na iteolu nke ọnwa Julaị bụ ụbọchị akụkọ ebụbo a gbara na soshal midia ebe ọ gọrọ aka na ukwu ya na-ekwu na okwu akụkọ a bụ okwu ugha.
Ugbua mba Amerịka wepụtara akwụkwọ ịrụ aka ndị a, Abba akagbuola okwu a o kwuru na mbụ.
Akwụkwọ ikpe a na-arụ Abba aka depụtara azụmahịa nọ n'etiti ya na Hushpuppi nke gosiri ego Hushpuppi nyere ya site na ụlọakụ nọ na Naịjịria nke Abba nyere akara ọba ego na-anọghị n'aha ya n'ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Februari nakwa n'ụbọchị nke iri abụọ nke ọnwa Mee afọ gara aga.








