Akụkọ na m chọrọ ịba mahadum Imo Abba Kyari bụ okpotokpo asị- Hope Uzodimma

Ebe foto si, Getty Images
Okwu na-efegharị na gọọmenti Imo steeti chọrọ ịbagharị mahadum Imo steeti Mallam Abba Kyari University bụ okpotokpo asị.
Onye mgbasa ozi gọvanọ Imo steeti bụ Oguwuike Nwachuku gwaara BBC nke a.
Akụkọ pụtabụrụ na gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma kwuru na na ha na-akwado ịbagharị mahadum ahụ aha onye bụbụ onyeisi ọrụ Buhari nwuru n'ihi coronavirus.
Akụkọ ụgha ahụ kwukwara na gọvanọ Uzodimma na ndị ọnụ na-eru n'okwu na-enwe mkparịtaụka gbasara ya bụ atụmaatụ.

'Peter Obi egoghị ụlọ ọbụla n'Enugwu'

Ebe foto si, Val Obienyem
Valentine Obienyem bụ ọnụ na-ekwuru Peter Obi bụ onye bụbụ gọvanọ Anambara nakwa onye soro zọọ ọkwa dịka osote onyeisiala n'okpuru patị PDP sị na onweghi ụlọ ọbụla o goro n'Enugwu.
Maazị Obienyem sị na ya hụrụ akụkọ na twitter na-ekwu na Peter Obi goro ụlọ Dọkịnta Chu Okongwu dị n'Oba Close, na GRA Enugwu.
Ọ si; " Ka m kwusie ya ike na Maazi Petetr Obi egoghi ụlọ ọbụla dị n'Enugwu maọbụ ebe ọbụla na Naịjirịa."
Ọ sị na Maazị Obi nwere ụlọ n'Onisha.
"Oge Ọkaiwu Sullivan Chime na-achị Enugwu steeti, o nyere Obi ala chara acha mana ọ gwara ya na ya achọghị ya makana ya agaghị ebinwu ebe ọzọ abụghị Anamabra ka ọ chịchara steeti ahụ afọ asatọ,"
Ọ sị na Obi sị na ọ bụ sọsọ ya bụrụ na onwere ebe ọrụ kpọgara ya bụ na ya ga-ebi n'ebe abụghị Anambara.
Maazị Obienyem sị na gọvanọ Abịa na Delta nyekwara Maazi Obi ofu onyinye ahụ mana ọ jụrụ.
N'onu ya, ọ sị, "Obi na-ekwu kwamgbe na ya abụghị ogbenye. Ọ bụ onyeisi ọtụtụ ụlọ ọrụ tupu ọ bụrụ gọvanọ.
"Ọzọkwa bụ na nna ya bụ ọgalanya ama ama n'Ọnisha ma bụrụkwa onye nwe UlO ahịa akpọrọ "Ideal Supermarket" bu nke kachasị tupu alụọ agha n'Ọnisha ahụ kwa.
"Ụmụnne ya jikwa ihe."
Ọ sị na ihe Maazị Obi na-arụ ugbua bụ ịga ụlọ akwụkwọ na-enyere ha aka nke bụkwa ihe na-enye ya ọṅụ dịka ihe ọ chọrọ bị inyeghachi ọha.
"Maazị Obi nwere ego ọ ga-eji zuo ụlọ ebe ọbụla ọ chọrọ mana ọbụghi ihe di ya n'obi ugbua," Maazi Obienyem si.
Peter Obi na-ewu na Twitter Naịjirịa kemgbe ụtụtụ ụbọchị 20 nke ọnwa Epreelụ 2020 dịka ndị mmadụ na-ede "hashtag" SaintPeterObi asi na o goro mbada ụlo n'Enugwu.

Egbuola nwoke gbagburu mmadụ 16 na Kanada

Ebe foto si, earthshod_kuunda
Ndị uweojii ekwuola na otu nwoke aha ya bụ Gabriel Worthman gbara afo iri ise na otu ji egbe gbagbuo mmadu iri na isii nke gụnyere otu onye uweojii n'obodo Nova scotia nke dị na mba kanada n'ụbọchị satụde alaala mụọ dịka ndị uweojii na achọ ijide ya.
Otu onyeisi ndị uweojii bụ Chris Leather gwara ndị ntaakụkọ na ha chọtara nwoke a n'ụbọchi sunde n'ebe gwongworo ya a nọ.
Leather kwuru na ha amatabeghị ebum n'ụche nwoke a ma kọwaa na Worthman yi ụfọdụ uwe ndi uweojii ma nyara kwa ugbọala nke dka nke ndị ụweojii nke mere ka ijide ya sie ike.
Ọ kọwara na mkpamkpa bụ nkata agbara nke ọma ebe nwoke a ji ụgbọala ndị uwe ojii na uwe ha were gbuo ọchụ a.
Leather kwukwara na ha gwara ndị mmadụ ka ha nọrọ n'ụlọ ma meche ụzọ ha mgbe ha na-achọ Worthman.

Onyeisi otu ndị uweojii bụ Brian Suave kwuputara obi iri-uju ha ọkachasị onyeuweojii bụ Constble Heidi Stevenson onye nwụrụ n'aka nwoke a ma too ndị uweojii niile tinyere aka n'ijide nwoke a ọkachasị ndị merụrụ ahụ.
Onye ọchịchị obodo Nova Scotia kwuru na obodo a ahutubeghị ụdịrị mkpamkpa mbụ ma sị " amaghị m na ọ bụ ụdịrị akụko a ka m ga-eji teta ụra n'ụbọchi taa, na otu onye omekome na-agba egbe aghara aghara".
N'otu aka ahụ ka onyeisiala mba Kanada bụ Justin Trudeau kwuru na akara twitter ya " Obi anyị nọnyere ndi niile mkpamkpa a metụtara, anyị so unu eri uju".









