Tunji Disu Profile: Lee ihe ndị i kwesịrị ịma maka nwoke a a họpụtara ịnọchi anya Abba Kyari

Tunji Disu

Ebe foto si, Lagos Monitoring Team

Nkọwa foto, Tunji Disu ga-anọchịte anya Abba Kyari

Onyeisi ndị uweojii Naịjiria bụ Usman Alkali Baba ahọpụtala Tunji Disu ka ọ nọchite Abba Kyari na ọkwa orụ ịbụ onyeisi Police Intelligence Response Team (IRT).

Akwusiri Abba Kyari ọrụ n'ike n'ihi ebubo ịna aka azụ n'aka Abass Ramon onye e ji Hushpuppi mara.

Usman Alkali kwupụtara nhọpụta nke a n'ụbọchị Monde dịka ndị otu Nigeria Police Commission mere nzukọ kpebie nke a. Onye bụ Tunji Disu?Tupu ahọpụta Tunji Disu maka ọkwa ịnọchị Abba Kyari:

  • Ọ bụbụ onyeisi ngalaba ọrụ uweọjii na-ahụ maka enyemaka ọnọdụ gbata gbata na Legọs Steetị nke bekee kpọrọ Rapid Response Squad (RRS).
  • Disu bụbụkwa osote Kọmịshọna ndị uweojii n'Abuja, rụkwa na ngalaba "operations" n'isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Abuja.
  • N'oge gara aga ọ rukwara ọrụ dịka osote onyeisi ngalaba na-eme nyocha mpụ n'Rivas Steetị nke beekee kpọrọ State CID.
  • Maazị Disu sobụkwa na ndị uweojii otu African Union họpụtara ịrụ ọrụ ichekwa ụdọ na mba Sụdan
  • O gụrụ asusu bekee na mahadum nọ na Legọs bụ Lagos State University (LASU).
  • Ọ gukwara akwụkwọ ruo ogogo "Masters" na mahadum nọ na Ondo Steeti bụ Adekunle Ajasin University.
  • O gukwara akwụkwọ ndị ọzọ banyere ọrụ ncheckwa na mahadum ole m ole na Naijịrịa nakwa mba ofesi.