Fake news: Gọv Obianọ agọọla na akụkọ na onye ọrụ atụnyereghị Buhari a chụọ ya n'ọrụ bụ ụgha

Ebe foto si, GovernorObianoFacebook
Gọọmentị Anambara agọọla na onweghị mgbe gọvanọ steeti ahụ bụ Willie Obiano nyere iwu ka ndị ọrụ oyibo na ndị Anambara tụnyere Buhari vootu na ntuliaka na-abịa.
Akụkọ wusara na soshal midia nakwa steeti ahụ ụbọchị Wenezde bụ na Obiano nyere ndị ọrụ bekee niile iwu site na akwụkwọ ozi 'Memo', ka ha tụnyere Buhari vootu na Satọde ma ọ bụghị otu a, a chụọ ha n'ọrụ.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo na Don Adinuba bụ Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi nakwa nkuzi nyere ọha na eze na steeti ahụ nwere n' ekwentị, o kwuru na ya bụ akụkọ a na-akọ bụ ozi adigboroja nke Bekee kpọrọ, 'Fake News.'
Ọ boro ebubo na ya bụ akụkọ asị bụ onye okwupụta okwu nyere Maazi Pita Obi, bụ Valentine Obienyem' bụ ya bidoro ya bụ akụkọ, gbakwunyere na-enweghị mgbe ọbụla Gọvanọ Obiano ji akọ akụkọ asị banyere Pita Obi dị ana-akọ na akwụkwọ akụkọ dị icheiche, nakwa na ìgwè nzikọrita ozi ohaneze bụ ịntanetị.
2019: Inec ewepụtala ọnụọgụgụ ndị denyere aha nakwa ndị natara PVC
N'ozi ha wepụtara na Twitter, Inec wepụtara ọnụọgụgụ ndị denyere aha maka ntụlịaka 2019 nakwa ndị natara PVC.
Ihe karịrị nde mmadụ iri asatọ denyere aha, ebe nde irir asaa na ụma wetara PVC ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Tụọ vootu,atụfula ike gị site na ịnọrọ n'ụlọ-Atiku

Ebe foto si, @Atiku
Atiku Abubakar bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha PDP na ntuliaka 2019 arịọla ụmụ Naijiria do,do,do pụta n'igwe tụọ vootu na Satode na-abịa.
Atiku onye kwuru nke a ụbọchị Tọọzde n'okwu ọ gbasara n'igwe okwu soshal midia kwuru na ihe onye apụtaghị na-ekwu bụ na etu ala Naijiria dị ugbua dị ya mma n'ahụ.
Ebonyị ehiwela kọmịti ga-enyocha ọdachi Izzi

Ebonyi steeti ehiwela kọmịti ga-elebanye anya n'ebe mmiri si banye opi ụgbọghụrụ n' ọgbaghara butere ọkụ gbara ụlọ iri atọ n'Izzi nke onyenchikota ya bụ Rev. Abraham Nwali.
Gọvanọ Umahi, onye gbara nke a n'anwụ ụbọchị Tọọzde ka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abakaliki kwere nkwa na ya ga-emeziri ndi e mebiri ihe ha ihe emebiri ma ya merie ntuliaka a.
Onye ihe Man.City na-amasị merụrụ nnukwu ahụ

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu
Otu onye ihe otu egwuregwu Manchester City na-amasị bụ ony n'ezi ọnọdụ ọjoo n'ụlọogwụ ka ebichara ya aka n' asọmpi Champions League ha na Schalke na Germany ụbọchị Wednezde.
Eunice Atuejide apụọla n'ọsọ ndị na-azọ ọkwa onyeisiala

Ebe foto si, Eunice Atuejide
Akụkọ na-eru anyị ntị kwuru na Atuejide awụsala ngwa ọrụ ndọrọndọrọ ya.
O kwuru nke a n'akwụkị̀ọ ozi o sitere BBC Igbo n'ekwentị na-akọwa na ihe dị ya mkpa bụ na o bu ala Naịjirịa n'uche ya.
Cheta na Oby Ezekwesili bụ nwaanyị ọzọ na-azọ ọkwa onyeisiala chịsara ngwa ọrụ n'izuụka ole na ole gaara aga.









