Ahụla ozu ụmụ akwụkwọ UNIZIK abụọ n'ime ụlọ obibi ha

Ndị nkuzi mahadum bụ ASUU chọrọ ịgba abụbụọrụ

Ebe foto si, Unizik/Facebook

Ihe anya mmiri mere n'ụbọchị Sọnde, abalị iri abụọ nke ọnwa Febuwarị 2022, na Mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Awka, Anambra steeti, dịka a hụrụ ozu ụmụ akwụkwọ abụọ n'ime ụlọ ha.

Ụmụakwụkwọ ndị ahụ bụ otu nwoke na otu nwaanyị. Nke nwoke bụ onye ọbịa n'ụlọ nke nwaanyị.

Kọmịshọna ndị uweojii Anambra Steeti bụ Echeng Echeng kwuru na nchọpụta gosiri na ọ bụ anwụrụ si n'igwe ọkụ latrik a na-akpọ 'Carbon Monoxide' kpatara ọnwụ ụmụ akwụkwọ ahụ.

Ụlọ obibi ụmụ akwụkwọ
Nkọwa foto, Ụlọ obibi ebe a hụrụ ozu ụmụakwụkwọ abụọ ahụ

Echeng Echeng dọrọ aka na nti ka ndị mmadụ kpachapụ anya etu ha si eji igwe ọkụ 'generator' eme ihe maka na anwụrụ si na ya nwere ike igbu mmadụ.

Ọ kọwara na ọ bụghị naanị igwe Jenaretọ, kama igwe ọbụla ji mmanụ ụgbọala arụ ọrụ.

Echeng kwuru sị, " Mgbe ndị uweojii gbakara ụzọ a were banye, isị 'Corbon Monoxide' na-esisi ike n'ịme ụlọ ahụ".

O kwuru na-adọnyela ozu ndị a n'ụlọ a na-echekwa ozu ma sị na enweghị ihe gosiri na e nwere mwakpo maọbụ ọgbaaghara ọbụla.

Echeng kwuru ka mmadụ niile nwere igwe Jenaretọ dopụ ya ebe ikuku ya agaghị erute ebe mmadụ nọ.

BBC Igbo garuru ebe ya bụ ihe mere ma hụ na-agbachiela ụlọ ebe a hụru ozu mmadụ abụọ a.

Ime ụlọ ebe a hụrụ ozu ndị a
Nkọwa foto, Ime ụlọ ebe a hụrụ ozu ndị a

Otu onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ime ụlọ ebe ahụrụ ozu a kwasara akwasa ma sịkwa na a hụrụ ọfụfụ n'ọnụ nke nwaanyị.

Onye na-elekọta ya bụ ebe obibi ụmụ akwụkwọ ekweghị ikwu okwu maka ihe a merenụ. Ọ sị na enyefeela ya n'aka ndị uweojii.

Gịnị bụ 'Carbon Monoxide'

Onye na-agbanye igwe ọkụ 'Generator'

Ebe foto si, Getty Images

'Carbon monoxide' bụ ikuku gaasị na-enweghị ụcha, onweghị isi, onweghị ihe ọ na-atọ.

Ọ bụ gaasị na-emebi ihe n'ime ahụ mmadụ ma mmadụ kuru ya n'ume.

Ụdị gaasị a bụ nke na-esi n'igwe generator, maọbụ n'ụgbọala maọbụ n'ọgbatumtum apụta.

Mgbe 'carbon monoxide' banyere n'ime ahụ mmadụ, ọ na-eme ka ikuku ndụ a kpọrọ 'oxygen' ghara irute n'obi mmadụ, ụbụrụ nakwa akụkụ ahụ ndị ọzọ dị mkpa.

Nke a ga-eme ka mmadụ gharịpụ ma kubie.

Etu ị ga-esi gbanahụ ọdachi sitere na 'Carbon Monoxide'

  • Dọwa Igwe ọkụ gị n'ebe anwụrụ ya agaghị na-abata n'ime ụlọ
  • Nyochaa igwe ọbụla i nwere nke na-eji mmanụ ụgbọala arụ ọrụ
  • Tinye igwe na-enyochapụta ikuku ọjọ, a na-akpọ ya 'carbon monoxide detector'
  • Kwee ka ikuku ndụ na-abata n'ime ụlọ gị ma ọ bụrụ na e nwere igwe ọkụ a-asụ na nso ebe ahụ