Enoch Adeboye, CAN na ndị ọzọ chọrọ a gbaara Buratai na ndị isi agha ndị ọzọ ụgbọ nwamkpi

Ebe foto si, BBC/Secondus/RCCG
Igbo sị na ebe ọbụla nwata na-ebe akwa na-arụ aka, ma ọ bụrụ na nne ya anọghị ya, nna ya anọrọ ya.
Etu a ka ọ dị ugbua n'ihe banyere ọnọdụ nchekwa na Naịjịrịa dịka ọtụtụ ndị mmadụ, otu, ọgbakọ nakwa okpukperechi na-asị na ọ dị njọ.
Dịka nchọpụta otu mbaụwa a kpọrọ 'Internations' mere n'afọ 2019, gosiri na Nigeria bụ mba kachasị gbaa ọnyụba na nchekwa dịka pasentị ndị mbịarambịara nbi na ya na anọ n'oke egwu maka ndụ ha.
Ọ bụghị naanị ndị ọcha bịara ala Naijiria, ọtụtụ ụmụ Naijiria atụnyela ndụ ha n'aka Boko Haram, ndị ọchịehi, ndị ohi na ndị ntọ n'afọ
Ụmụ Naijiria na-ajụ sị "ọ bụ na ọkpụ isi amaghị akpụ ka ọ bụ na agụba adịghị nkọ?" n'ihi oke ogbugbu na ntọrị ndị mmadụ na mpaghara Naịjirịa dị iche iche.
Ọtụtụ n'ime ha na-akpọ oku sị ka a chụọ ndịisi ndị agha na Naịjirịa nke gụnyere ndị agha ala bụ Tukur Buratai; nke ndị agha ụgbọelu bụ Air Marshal Sadique Abubakar; na ndị agha ụgbọmmiri bụ Vice Admiral Ibok-Ete Ekwe Ibas.
Ka anyị tụlee ụfọdụ otu ndị na-akpọ oku a na mgbe ga kpọrọ ya.
Ndị ụlọomeiwu ukwu (Sinetị)

Ebe foto si, Senate/Facebook
N'ụbọchị 21 nke ọnwa Julaị afọ 2020, ndị ụlọomeiwu ukwu bụ Sịnetị sị ka ndịisi ndị agha Naịjirịa rituo n'ọkwa ha.
Ndị Sịnetọ Ali Ndume malitere atụmatụ a na nzukọ ndị omeiwu sị ọ bụ n'ihi ọnọdụ nchekwa na kawanye njọ na Naịjirịa.
Nke a na-abịa dịka a wakporo ma gbuo ọtụtụ ndịagha na Katsina Steetị nakwa kepukepu sị na ọtụtụ ndịagha Naịjịrịa gbara arụkwaghịm n'ọrụ.
Sinetọ Francis Fadahunsi kwadoro ihe Ndume kwuru ma sị ka ndịisi agha kpachapụ iche n'ọkwa ha.
Mana nzaghachị oku a, ụlọọrụ onyeisiala Muhammadu Buhari sị na ịchụ ndịisi agha n'ọrụ dị onyeisiala n'aka.
Ha kwukwara na onyeisiala ga-eme ihe o chere ga-adịrị ndị Naịjirịa mma.
Ohanaeze Ndigbo

Otu jikọtara ndị Igbo n'ụwa gbaa gburugburu bụ Ohanaeze Ndigbo kwadoro ihe ndị ụlọomeiwu kwuru sị ka a chụọ ndịisi agha Naịjirịa.
Onyeisi ha bụ Nnia Nwodo kwuru nke a n'akwụkwọ ozi Emeka Attamah bụ onye ndụmọdụ ya wepụtara.
Ọ jụrụ sị kedụ ihe pụrụiche n'ebe ndịisi agha a nọ nke mere na Onyeisiala Buhari achọghị ịgbanwe ha n'agbanyeghi na oge ịla ezumike nka ha agaala.
Ọ sị na nke a akarịa ịchọ ọ dị mma ndị Naịjirịa bụ nke onyeisiala sị na ọ bụ ihe ya chọrọ.
Otu ndọrọndọrọ ọchịchị

Ebe foto si, Uche Secondus/Facebook
Otu ndọrọndọrọ ọchịchị dịka 'Peoples Democratic Party (PDP) 'Action Democratic Party' (ADP), n'oge dị ịche iche akpọọla oku sị ka a chụọ ndịisi ndị agha.
onyeisioche PDP bụ Uche Secondus nọọrọ n'ụbọchị Fraịde 24 Julaị 2020 sị ka onyeisiala Buhari gbaa arụkwaghịm n'ọrụ n'ihi otu ihe a kpụ n'ọnụ "Nchekwa".
Secondus kwuru nke a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ọgbakọ ha kpọrọ "Ọdịda Naịjirịa dịka mpụ, na ọnọdụ nchekwa ọjọo na-elomi ya" emere n'Abuja.
Ọ sị na ọ dịka ike ịtụ asị na ha emeriela iyi ndụ egwu nke ọchịchị APC ji bịa agwụla ha nke mere na ha amaghịzi ihe ọzọ ha ga-eme.
N'otu aka ahụ, ụbọchị 8, ọnwa Juun, afọ 2020 mgbe ADP na-eme emume ncheta afọ atọ nke pati ha ka onyeisioche ha bụ Yabagi Sani kpọrọ oku a.
Sani sị na Onyeisiala Buhari kwesịrị ige ntị n'oku a nde kwuru nde ndị Naịjirịa na-akpọ sị ka a chụọ ndịisi ndị agha.
CAN, Adeboye na ndị ọzọ

Ebe foto si, PastorEAAdeboye/Twitter
N'ụbọchị 3 Febụwarị, afọ 2020 ka otu jikọtara ndị ụka kraịst na Naịjirịa bụ CAN n'ịchafụ mere ngagharị ekpere maka ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.
Ha mere nke a n'ihi oke ogbugbu na ntọrị a na-eme ndị ụka kraịst ọkachasị na Kaduna nakwa mpaghara Naịjirịa ndị ọzọ.
N'otu aka ahụ onyeisi ụka'Redeemed Christain Church of God' bụ Enoch Adeboye na ndị ụka mekwara ngagharị ekpere a.
Ọ bụ eziokwu na ha akpọghị oku ka a chụọ onye ọbụla n'ọrụ mana ihe ha mere gosiri na obi adịghị ha mma n'ihi ndụ ndị otu ha na-ala n'iyi.
Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu nchekwa bụ TY Danjuma bụbu minista nchekwa sị na o mepee ọnụ kwuo ihe na-eme na Naịjirịa na o nweghi onye ga-eri ụra ọzọ.
Danjuma kwuru nke a na mahadum Ibadan na mgbape akwụkwọ e mere n'ọnwa Disemba afọ 2019.
Cheta na egbuola ọtụtụ ndị otu kraịst gụnyere ndị ụkọchukwu na Steetị ndị dịka Kaduna, Benue, Nasarawa, Abuja na ebe ndị ọzọ.
Tinyekwara ike ndị Boko Haram na-akpa n'ugwu Awụsa, ndị ọchịehi (herdsmen) n'Ọwụwa-Anyanwụ, ndị ohi (Bandit) na Zamfara dgz.
Mgbe APC nke Onyeisiala Buhari n'isi ya banyere were ọchịchị n'afọ 2015, nkwa ha kwere bụ na ha ga-eji otu afọ kpochapụ ndị oyi ndụ egwu na Naịjirịa.
Mana dịka afọ ise gacharala, ọ dị ka a ga-asị na "ihe na-ebe ka na-ebe" n'ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:









