Ababanna: Ihe ndị uweojii kwuru maka ebubo imetọ nwa dị afọ 12 a na-ebo otiegwu a

Ebe foto si, Ababanna
Otiegwu a ma ama n'ala Igbo bụ Uba Obinna Agbaso, aha otutu ya bụ 'Ababanna' nọ n'aka ndị uweojii Agbala dị n'Okpuruọchịchị Owerri-Nọt azara ọnụ ya ugbua kemgbe abalị atọ maka ebubo ịwakpo nwatakịrị gbara afọ iri na abụọ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikokwu gwara BBC Igbo na ha ka na-enyocha ya bụ nwaamadị ka ọ dị ugbua.
O kwukwara na ya bụ okwu agbaala oge tupu ndị mụ ya bụ nwa ewetara ya ndị uweojii.
Orlando sị na ya bụ ihe mere ọnwa abụọ na ọkara gara aga, ebe nna nwatakịrị ahụ bụ Victor Okereocha buteera ha ya bụ ikpe abaalị atọ gara aga.
Akwụkwọ akụkọ 'The Nation' kọwara na ya bụ nwaamadị kwasara nwa ahụ iko n'ike ugboro atọ mkpe nna ya anọghị ya.

Ebe foto si, Ababana
Akụkọ anyị nụrụ bụ na ha bi n'otu ebe n'Owere ebe ahụ.
Orlando na-adọ aka na ntị ka onye ọbụla ụdị ihe a mere were ọsọ bịa gwa ndị uweojii ka ọ nwere dị nfe igosi na ya bụ ihe mere n'ezie.
O kwuru na ọ bụ eziogkwu na-aga ejere ya ụlọọgwụ maka nnyocha, mana o nwere ike ịhịatụ nwaahụ ịhụ mmgbama n'ahụ nwa ahụ maka ọ teela aka ya bụ ihe mere.









