'Aka Governor Okezie Ikpeazu adịghị na nwuchi Emperor Ogbonna'

"Nwuchi ndị uweojii nzuzo nwuchiri Emperor Ogbonna esighi n'aka Gọvanọ Okezie Ikpeazu".
Onye kwuru nke a bụ ọnụ na-ekwuru Ikpeazu bụ Onyebuchi Ememanka oge BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ gbasara okwu ahụ.
Onye bụ Emperor Ogbonna?

Ebe foto si, Facebook/Emperor Ogbonna
Emperor Ogbonna bụ ọkaiwu onye na-akatọ ọchịchị gọvanọ Ikpeazu.
N'ọnwa Maachị afọ 2020 ka ndị uweojii nwuchiri ya n'ihi mkpesa Ikpeazu kpesara gbasara ya.
Ikpeazu kwuru na Ogbonna kọtọrọ aha ya na soshal midia ma tụgide ya asị.
Mana Ogbonna kwuru na ọbụghị ya dere edemede ahụ kọtọrọ aha gọvanọ, kama o kesara ya.
Ndị uweojii mechara kpụpụ Ogbonna ụlọikpe ebe ọkaikpe nọ nye iwu ka a kpọchie ya na mkpọrọ.
Ogbonna nọ na mkpọrọ tupu ọrịa coronavirus amalite nke mere ka a kpọchie elu na ala.
Oge e mechara kpọghee ụlọikpe, ọkaikpe ahụ nyekwara iwu ka a tọhapụ Ogbonna n'ụbọchị 28 nke ọnwa Eprel.
Mana ndị uweojii nzuzo bụ DSS gara n'ụlọikpe ahụ ma nwụchikwaa Ogbonna ọzọ, kpọrọ ya laa Abuja.
Ebe ahụ ka ọ ka nọ na mkpọrọ ndị DSS ruo taa.
Ihe gọọmentị Abia kwuru

Ebe foto si, Onyebuchi Ememanka
Ọnụ na-ekwuru gọvanọ Ikpeazu bụ Onyebuchi Ememanka gwara BBC na aka ha adịghịzi na ihe ọbụla na-eme Ogbonna.
Ememanka kọwara sị: "Ọ bụ eziokwu na gọvanọ wegara mkpesa n'aka ndị uweojii oge Ogbonna dere ihe iji kọtọọ aha ya."
"Mana okwu ahụ apụọla n'ụlọikpe ebe ọkaikpọ nọkwa nye iwu ka a tọghapụ ya."
"Ngwa ngwa a tọhapụrụ ya, aka gọọmentị Abia apụọla na ya bụ okwu."
"Anyị amaghịzi ihe ndị DSS ji buru ya gawa Abuja."
Ememanka gara n'ihu kọwaa na Ogbonna dekwara ihe n'oge gara aga na-akọtọ ọchịchị onyeisiala Mohammadu Buhari.
"O nwere ike ịbụ maka nke a kpatara ndị DSS ji nwuchie ya, amaghị m."
"Mana aka gọvanọ Okezie Ikpeazu adịghị na ya."
Ihe ndị otu na-anọchite Ogbonna kwuru

Ebe foto si, Facebook/Emperor Gabriel Ogbonna
Otu dị icheiche na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye nke a kpọro 'Civil Society Organisations' nakwa 'Human Rights groups' akpọọla oku ka gọọmentị tọhapụ Ogbonna na-egbughi oge ọbụla.
Ha gunyere The Gavel NG, SERAP, 'Connected Development' (CODE) na ndị ọzọ.
Ọnụ na-ekwuru ndị 'Gavel' bụ Oluwafemi Ajibade, gwara BBC Igbo na ụlọikpe dị n'Umuahia enyela iwu ka a tọhapụ Ogbonna.
Ụlọikpe ahụ nyekwara iwu ka DSS kwụọ Ogbonna ego dị otu nde naịra na ụma ise, mana ndị DSS emeghị nke a.
O kwuru na ọ bụ ihe jọgburu onwa ya na ngalaba gọọmentị dị iche iche anaghị erubere ụlọikpe isi.
Ajibade gara n'ihu kwuo na ezinụlọ Ogbonna ataala nnukwu ahụhụ kamgbe a kpọchiri ya na mkpọrọ.
BBC Igbo gbara mbọ inweta otu n'ime ezinụlọ Ogbonna n'ekwentị mana ọ mịtabeghị mkpụrụ ugbua.
Anyị ka na-achọ ịnụ ọnụ okwu ha.
Mana dịka anyị na-ede akụkọ a, akụkọ ọzọ pụtara na otu ụlọikpe enyela iwu ka a tọhapụ Ogbonna.
Ụlọikpe ahụ nyekwara na Ogbonna ga-eweta nde naịra iri abụọ ma kpọtakwa mmadụ abụọ ga-ebinyere ya aka n'akwụkwọ.
Mana ọkaiwu Ogbonna kwuru na ha ga-etinye akwụkwọ ọzọ ka e belatara ha ihe ụlọikpe chọrọ ka ha mee.









