Rape in Nigeria: Etu nwaanyị a wakporo n'ike si mụọ ejima atọ n'Imo

Aha onyonyo, Etu ị ga-eme ka 'prostate' gị na-achị sọ ọchị

Nwaanyị mụrụ ejima atọ n'Imo steeti atụọla ọtụtụ mmadụ akpata oyi.

Ihe kpatara nke a bụ na ọ bụ mwakpo ka otu ofeke wakporo Nkechinyere Ezenwa wee tụwa ya ime.

Nkechinyere kọọrọ BBC Igbo etu ya bụ ihe si mee oge ọ na-ebugharị unere (banana) n'Owere.

O kwuru sị: "Otu nwoke kpọrọ m ka m bịa resị ya ahịa n'otu ụlọ arụchabeghị arụcha."

Ụmụ ejima atọ

Ebe foto si, Opara Joy

Nkọwa foto, Ụmụ ejima atọ Nkechinyere mụrụ n'ime ụbọchị atọ

"M wee gaa ebe ahụ, ọ wakpo m n'ike."

"O nweghị onye gwara."

"Mgbe m chọpụtara na-adị m ime, a gaghachiri m ebe ahụ, mana ahụzighi m nwoke ahụ."

Nkechinyere , onye kwuru na ọ bụ naanị nne ya ka ọ gwara ihe mere sị, "Amaghịkwanụ m onye ọ bụ."

Aha onyonyo, Mwakpo ụmụnwaanyị

Nkechinyere kwuru na ọ mụrụ ụmụ ejima atọ ahụ n'ime abalị atọ.

N'ụbọchị 17nke ọnwa June ka ime mewere ya ọ gaa n'ụlọọgwụ nta wee mụọ otu nwa.

O kwuru sị: "Onye nọọsụ ahụ gwara m na nwa nke ọzọ anwụọla n'ime afọ m. Ka anyị gaa nnukwu ụlọọgwụ ka e wepụ ya."

"Mgbe anyị gara ụlọọgwụ mee nnyoch, a chọpụtara na ụmụaka abụọ ka nọ n'ime afọ m. Ha abụọ dịcha ndụ."

Nkechinyere Ezenwa

Ebe foto si, Opara Joy

Nkọwa foto, Nkechinyere ka nọ n'ụlọọgwụ ugbua maka na ụmụ ya ka nọ na 'incubator'

Ndị ụlọọgwụ wara Nkechinyere afọ wee kupụta ejima abụọ nke fọrọ afọ.

Ha atọ nọ na igwe ebe a na-etinye ụmụaka akabeghi aka nke bekee na-akpọ 'incubator'.

Nkechi kwuru na ụgwọ ụlọọgwụ ha ruru otu narị puku naịra (N100,000).

Ha ka nọ n'ụlọọgwụ ahụ ugbua.