Manchester United vs Chelsea: E gosila Man Utd na onyeisi nkwọcha anaghị aga ọgụ okwute

Ebe foto si, Getty Images
Otu egwuregwu bọọlụ Chelsea ejirila iwe mekpaa ndị Manchester United ahụ oge otu abụọ a zutere onwe ha na mgbede ụbọchị Sọnde.
Ọkpụ goolu atọ a satara otu ka ha ji merie ha ma gafee n'agba ikpeazụ nke iko FA.
David De Gea bụ okwu a kpụ n'ọnụ n'asọmpi a n'ihi aka mbe o chere ugboro ugboro nke mere e ji merie ndị Man Utd.
Olivier Giroud na Mason Mount nyeteere Chelsea goolu ebe Harry Maguire ji aka ya gbakpuo bọọlụ na neetị ndị Man Utd iji mezuo ya ọkpụ atọ.
Bruno Fernandez ji penariti nyetere Man Utd otu mkpụrụ goolu nke ha ji gbaa aka ahịa.
Ọ bụzị na Chelsea na Arsenal ga-agba asọmpi nke a gbachaa e buru n'iko FA.
Cheta na Arsenal nyụrụ Manchester City ịkpakwụ n'ụbọchị Satọde.
Ọkpụ abụọ asataghị asata ka Arsenal ji merie Man City.










