CAN: Họọ ndị ọrụ nchekwa ọhụrụ

Ebe foto si, Supo Ayokunle Facebook Page
Otu jikọrọ ndị otu Kraist nke a kpọrọ CAN n'aha ịchafụ rịọrọ ka onyeisiala bụ Muhammadu Buhari hazigharia ndị o tinyere n'ọrụ nchekwa ala Naijiria 'ndị si n'otu ofufe' dịka atụmatụ onye keta,ibe ya keta nke akpọrọ "Federal Character" siri hibe.
CAN kwuru nke a n'ọgbakọ ndị ndụ ha nwere n'Abuja .
N'akwụkwọ ozi CAN zigara ndị ntaakụkọ ka ha mechara nzukọ ahụ ha kwuru sị: "Ala anyị nwere ọtụtụ agbụrụ na ọtụtụ ofufe. Anyi na-etiku onyesis ala Buhari ka ọ soro atụmatụ onye keta,ibe ya keta na-ike ọrụ gọọment nile.
"Anyị na-arịọkwa ka ọ hazigharịa ụlọ ọrụ nile na-ahụ maka nchekwa ala nyị ma tinye ndị ọhụrụ nwere ebumnobi tọrọ atọ."
Mana oge BBC kpọrọ Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Lai Mohammed n' ekwentị jụọ ya echiche gọọmentị etiti gbasara oku CAN kpọrọ, Mohammed kwuru na o nweghị ihe o nwere ikwu na ya bụ okwu.
CAN gosịrị obi mwute maka ọtụtụ mmadụ e gburu na Benue, Taraba, Adamawa na Zamfara steetị ma katọ ndị ọrụ nchekwa maka egbochinwughị mkpamkpa ndị ahụ.
Ha na rịọ kwa ndị ezi na ụlọ ndị nwụrụanwụ ka ha yicha anya ma chikọta obi ha.
Ntuliaka 2019
N'ihe gbasara ntuliaka 2019, CAN rịọrọ ndị otu Kraist niile na Naijiria ka ha denye aha n'akwụkwọ ntụlịaka nke afọ 2019.
Ma rịọkwa otu na-ahụ maka ntụlịaka na Naijiria bụ INEC ka ha kwụsị ịdenye aha ndị na-etorubeighị n'akwụkwọ.









