Deborah Yakubu: Ụkọchukwu OPM enyela nne na nna ya onyinye ụlọ na ihe ndị ọzọ

Deborah Yakubu na Chinyere Gift Chibuzor

Ebe foto si, Chinyere Gift Chibuzor

Nnukwu enyemaka na iti aka n'obi abịarala nne na nna Deborah Yakubu bụ nwata akwụkwọ e gburu na Sokoto maka ebubo na ọ kparịrị okpukperechi alakụba nakwa onyeisi ha bụ Mohammed.

Enyemaka a si n'aka ụkọchukwu a ma ama bụ Chibuzor Gift Chinyere, onye nwe ụlọụka Omega Power Minstry.

Chinyere kwuru na ọ ga-enye nne na nna Deborah Yakubu ụlọ na ọrụ, ma nyekwa ụmụnne ya agụmakwụkwọ n'efu.

Ụkọchukwu a kwuru sị: "Ahụrụ m onyonyo ebe nne na nna Deborah kwuru na ha agaghị eziga nwa ha ọbụla ụlọakwụkwọ ọzọ. Chineke ekwela."

"Aga m akpọfe ha Port Harcourt ebe ha ga-ebi n'ụlọ ha agaghị akwụ ụgwọ ụlọ na ndụ ha ọzọ."

"Ụmụ ha niile ga-enwe agụmakwụkwọ n'efu n'ụlọakwụkwọ OPM."

"Aga m achọtara nna ya ọrụ ma mepekwaara nne ya ahịa."

Deborah Yakubu

Nna Deborah bụ Emmanuel Garba gwara BBC na o mefuru ihe karịrị otu narị puku naịra iji si Sokoto bulata ozu nwa ya na be ha dị na Niger steeti.

O kwuru na agụmakwụkwọ Deborah mere ka o ree ụlọ ya iji nwee ike ịkwụrụ ya ụgwọ akwụkwọ.

"Olileanya m niile nụ na ọ bụ n'afọ a ka o kwesịrị ịgụcha," Emmanuel Garba kwuru.

"Mana ewerela m ihe niile gbasara ọnwụ ya nyefee Chineke n'aka."

Anyị ga-eme ngagharị udo n'ime ogige anyị maka ogbugbu Deborah Yakubu - CAN

Onyeisi 'Christian Association of Nigeria' bụ Samson Ayokunle

Ebe foto si, CAN

Otu Christian Association of Nigeria ekwuola na ha ga-eme mkpagharị udo n'ime ogige ha dị na steeti dị icheiche gbasara ogbugbu e gburu nwata akwụkwọ Deborah Yakubu na Sokoto.

Ha kwuru nke a site n'akwụkwọ ozi ha wepụtara n'ụbọchị Satọde, Mee 14, nke odeakwụkwọ ha bụ Joseph Bade Daramola.

N'akwụkwọ ozi ahụ, Daramola kwuru na ọ bụ onyeisi otu CAN bụ Samson Ayokunle nyere ntuziaka ahụ.

O kwuru sị: "Onyeisi CAN bụ Samson Ayokunle enyela ntuziaka ka ndị isi ụka niile hazie ngagharị udo iji kwanyere nwa anyị nwaanyị bụ Deborah Yakubu."

"Ngagharị udo a ga-adị n'ụbọchị 22 nke ọnwa Mee n'elekere atọ nke ehihie n'ime ogige isi ụlọọrụ CAN na steeti niile dị na Naịjirịa."

"Ngagharị udo a agaghị abụ n'okporo ụzọ maọbụ n'ezi, iji gbochie ọgbaaghara na itufu ndụ ndị mmadụ."

"Steeti ebe enweghị isi ụlọọrụ CAN nwereike ime nke ha n'ime ogige ụlọụka ọbụla ha họọrọ."

"Anyị na-arịọ ndị nwereike iji akụrụngwa mgbasaozi dị icheiche mee ka ụwa hụ ihe anyị na-eme ka ha mee nke a."

"A ga-ejikwa ohere ahụ kpee ekpere maka ezinụlọ Deborah na ndị enyi ya, maka udo n'obodo Naịjirịa, nakwa ka Chineke nye ndị nke ya ezigbo ndị ndu na ntuliaka nke na-abịanụ."

Gọọmentị Kaduna amachiela ngagharị okpukperechi ọbụla dịka ọgbaaghara dara na Sokoto

Nasir El-Rufai

Gọvanọ Nasir El-Rufai nke Kaduna Steeti amachiela mkpagharị okpukperechi ọbụla na steeti ya.

El-Rufai mere nke a dịka ọgbaaghara na-ada na Sokoto Steeti ugbua ebe ndị ntorobịa na-emebisi ngwaahịa ndị mmadụ ma na-agba ọtụtụ ihe ọkụ.

A na-atụ egwu na ọgbaaghara a nwere ike ifesa na steeti dị icheiche na mpaghara Ugwu Naịjirịa.

Kọmishọna okwu nchekwa ime obodo dị n'aka na Kaduna Steeti bụ Samuel Aruwan wepụtara akwụkwọ ozi wee kwuo na ọ bụ ọgbakọ ndị isi nchekwa na steeti ahụ kpebiri itinye mmachi ahụ.

Aruwan kọwara na ha tinyere mmachi a n'ihi na ha chọpụtara na ụfọdụ ndị ekperima na-akwado ihazi ngagharị iji kwadoo maọbụ katọọ ọgbaaghara na-ada na steeti ọzọ na mpaghara Ugwu.

Awakpoghị ụlọ m na Sokoto - Bishop Kukah

Bishop Mathew hassan Kukah

Ebe foto si, Sokoto Diocese

Bishọpụ ụka Katọlik na dayọsis Sokoto bụ Mathew Hassan Kukah akọwaala na ndị mere ngagharịiwe na steeti ahụ n'ụbọchị Satọde, awakpoghị ụlọ ya dịka akụkọ si efegharị.

Kukah kwuru na ebe a wakporo bụ Ụlọ ụka Holy Family nakwa ụlọụka St Kevin ebe a gbara otu ụgbọala ọkụ ma kurie ụfọdụ ihe tupu ndị uweojii achụsaa ha.

O kelere ndị uweojii maka etu ha si gbata ngwangwa rụọ ọrụ ha iji gbochie ndị ahụ na-eme ngagharịiwe imebi ihe karịa.

Kukah gara n'ihu kwuo na akwụsịtụla ịka ụka n'ụlọụka Katọlik niile dị na Sokoto ugbua, ruo mgbe ebe niile dalatara jụụ.

Ọgbaghara adaala na Sokoto maka nwuchi ndị gburu Deborah Yakubu

MURTALA ST

Ebe foto si, MURTALA ST

Ọgbagbara adaala na Sokoto steeti dị na Naịjirịa ebe ndị ntoroọbịa ka na-ewe iwe maka ihe ha kpọrọ etu Deborah Yakubu si katọọ chi ndị alakụba bụ"Prophet Muhammad"

Ndị ntorọbịa ahụ na-ekwusi ike ka atọghapụ ndị uweojii nwụchịrị maka aka ha ịdị n'ogbugbu Deborah bụ nwata akwụkwọ "Shehu Shagari College of Education."

Ndị ntọrọbia gụnyere ụmụnwoke na ụmụnwoke na-eme ngaghariwe n'akụkụ Sokoto di iche iche gụnyere ụlọ Sultan nke Sokoto akpọrọ Alhaji Sa'ad Abubakar III nakwa ihu ogige gọọmenti steeti ahụ dịka ha mụnyere taya ọkụ.

Mgbe BBC gbara mbọ ịnụta n'ọnụ ndị uweojii gbasara ọgbaghara ahụ dapụtara na Sokoto, ha azaghị oku.

Imam Abubakar

Ebe foto si, Imam Abubakar

Ya bụ ngaghariwe bidoburu dịka nke udo mana o mechara ghọrọ ọgbaghara dịka ndị mmadụ malitere jiri okwute tụwa n'ụlọ Sultan dịka onye ntakụkọ BBC si hụta.

Onye na-arụ n'obi Sultan gwara BBC na ndị ọrụ nchekwa gbara mbọ ịkwụsị ndị na-eme ngaghariwe ịbanye na bee Sultan onye ha na-ata ụta makana ọ katọrọ ogbugbu Deborah.

Imam Abubakar

Ebe foto si, Imam Abubakar

Ihe gọọmentị Naịjịrịa kwuru maka ogbugbu Deborah Yakubu

Onyeisiala Muhammadu Buhari katọrọ ogbugbu Deborah Samuel

Ebe foto si, Deborah Samuel/Presidency

Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari katọkwara ogbugbu e gburu nwada ụka kraịst na ụlọakwụkwọ dị na Sokoto n'ebubo na ọ kpọrọ ụka alakụba iyi.

Ụfọdụ ụmụakwụkwọ bụ ndị alakụba wakporo ma gbuo Deborah Yakubu maka ebubo na ọ katọrọ onye amụma Muhammad n'ọgbakọ WhatsApp ụmụakwụkwọ Shehu Shagari College of Education dị na Sokoto.

Onyeisiala Buhari sị na agwa ahụ ndị a kpara dị mwute na o kwesịrị ileba anya n'ihe mere tupu e gbuo ya nakwa mgbe e gbuchara ya.

Ọ sị na "o nweghi onye ọ bụ ikike ya iji aka ya ekpebi ihe iwu kwesiri ikpebi na mba a. Tigbuo zogbuo enweghi ike igbo nsogbu ọbụla,".

Buhari nyekwara iwu ka minista mgbasaozi, ndị uweojii nakwa ụlọọrụ nzirita ekwentị "nye aka belata nkesa okwu ụgha nwereike ibute oke agbụrụ na soshal midia".

O tikwara ezinaụlọ Deborah aka n'obi ma rịọ ka onye ọbụla dere jụụ na ndị nchekwa na-enyocha ya

Ihe onyeisi British High Commissioner nke Naịjirịa kwuru maka ọnwụ Deborah Yakubu

Catriona Laing Twitter

Ebe foto si, Catriona Laing Twitter

Catriona Laing bụ onyeisioche British High Commissioner nke Naịjirịa akatọla ogbugbu Deborah Yakubu bụ onye ụka Kraist e boro ebubo maka ịkọ chi ndị alakụba iyi.

Laing depụtara n'akara Twitter ya, na ọ na-akpọku ndị uweojii nakwa ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu ka ha hụnata na ha mere ka ndị aka ha dị n'ogbugbu Deborah nata ikpe diri ha.

Cheta na ndị uweojii nọ na Sokoto kwuru na ha anwụchiela mmadụ abụọ ha kwuru na aka ha dị n'ogbugbu Deborah.

Deborah Yakubu bụ nwata akwụkwọ na-agụ 200 level na mahadum "Shehu Shagari College of Education" dị na Sokoto, Naịjirịa.

Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammad Buhari akatọla ogbugbu nwaagbọghọ a n'ime akwụkwọ ozi Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuru ya wepụtara ma na-ekwu na akụkọ ahụ bụ nke kwesiri ichekasị onye ọbụla nụrụ ya.

Osote ya bụ Yemi Osinbajo katọkwara ya bụ ogbugbu ma too Sultan nke Sokoto nakwa gọvanọ Sokoto nakwa ndị ọchịchị ọzọ maka etu ha katọọ ogbugbu Deborah ma na-ekwusi ike ka ma ndị niile aka ha dị n'ogbugbu ahụ ikpe.