Ihitte Uboma Isinweke Killings: Ihe Ipob kwuru maka ndị unknown gunmen gbagburu ndị ọrụ Inec n'Imo state

Ebe foto si, Screengrab/Getty IMAGES
Ọnụ na-ekwuru otu Indigenous People of Biafra bụ Emma Powerful akatọla mwakpo ndị unknown gunmen wakporo ndị ọrụ Inec n'Ihitte Uboma dị n'Imo steeti.
O kwuru na otu ahụ na-adọ aka na ntị ka ndị na-eme mwakpo ndị a kwụsị maọbụ dị njikere ịnata ntaramahụhụ ihe ha na-eme.
N'ọnụ ya, "Ipob agaghị agbachi nkịtị ndị omekome a na-emebi Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, anyị ga-ekpuhe ndị nọ n'isi ọrụ ọjọọ ndị a"
Power kwukwara na aka Ipob dị ọcha maka ndị na-atụ ha aka n'okwu mwakpo a ma kwuo na ọ bụ Naịjirịa na-akpa nkata ihizi ihe ndị ka ọ dị ka aka Ipob a nọ na ya.
O kwuru na "Ha (gọọmentị Naịjirịa) na-eme nke a ka ndị nkwado anyị gbakọta anyị azụ n'ọrụ ịchụ nwereonwe Biafra"
Powerful gara n'ihu kwuo na Ipob ma na aka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nọ n'isi mmiri na-akpalite ọgbaghara n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ma kwee nkwa na ha ga-agba n'anwụ ndị na-eme ihe ndị ndị a nakwa ndị na-akwado ha.
Etu ndị unknown gunmen si gbagbuo onye Inec na-edebanye aha maka PVC

Ebe foto si, Screengrab
Ndị oji egbe egbu gbagburu otu onye ụlọrụ Independent National Electoral Commission n'Imo steeti ụnyahụ bụ Aprịl 15, 2022.\
Onye ntaakụkọ anyị kwuru na aha nwa amadi ahụ ndị o ji egbe egbu gbagburu bụ Anthony Nwokorie.
Odachi a mere n'Isinweke bụ isi ụlọọrụ okpuruọchịchị Ihitte Uboma dị n'Imo steeti.
Ndị omekome ahụ ruru iri batara mgbe ndị mmadụ na-edebanye aha n'akwụkwọ maka inweta PVC ha maka ntụliaka 2023, gbagbuo otu onye ma chụsasia ndị ọzọ.
Ndị omekome ahụ kwuru na iwe na-ewe ha na ndị mmadụ ma-edebanye aha n'akwụkwọ maka ntuliaka 2023.
Anya hụrụ ihe a merenụ gwara onye ntakụkọ anyị nke a ma kwuo na agbara Nwokorie egbe n'obi nke mere o ji daa nwụrụ ozugbo.
Mike Abattam bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii gwara onye ntaakụkọ anyị na ọdachị a mere.
Onye nnọchite anya ụlọọrụ okpuruọchịchị Ihitte Uboma bụ Onyekachi Njoku katọrọ mwakpo ahụ ,ma kwete na otu onye ọrụ Inec nwụru na mwakpo ahụ.
Festus Okoye bụ onyeisioche "Information and Voter Education " kwuru na Inec akwụsịla ndebanye aha n'okpuruọchịchị Ihitte Uboma nwa mgbe nta,
Akụkọ ka na-abia









