Orsu LGA Gate Ipob painting: Ntecha ọkọlọtọ Ipob ahụrụ n'Orsu bụ okpotokpo asị - Gọọmenti Imo steeti

Ebe foto si, Screengrab
Foto gosiri ebe e ji ọkọlọtọ otu Indigenous People of Biafra (Ipob) hazie geeti isi ụlọọrụ okpuruọchịchị Orsu dị n'Imo steeti na-efegharị kamgbe abalị Tuzde na soshal midia bụ nke na-akpata ọtụtụ okwu.
Gọọmenti Imo steeti ekwuola na ya bụ foto bụ akụkọ ụgha.
Declan Emelumba bụ kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na steeti ahụ gwara BBC Igbo na "okwu geeti a enweghị isi."
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya bụ ntecha ọkọlọtọ Ipob
Otu onye anụrụ olu ya na ya bụ ihe onyonyo na-efegharị na soshal mida nke gosiri geeti a e ji ntecha ọkọlọtọ Ipob wee techaa kwuru:
"ụnụ na-ahụ anya na gọọmenti agbanwela, isi ụlọọrụ okpuruọchịchị Orsu bụzi isi ụlọọrụ Biafra."
Nke a mere ka ụfọdụ mmadụ na-ekwu na ya bụ ntecha gosiri na otu ndị na-achọ nwereonwe ewegharala ọchịchị n'ụfọdụ ebe n'Imo steeti.
Ihe Ipob kwuru maka ya bụ ntecha

Ebe foto si, AFP
Onụ na-ekwuru otu Ipob bụ Emma Powerful gwara BBC Igbo na ọ bụghị ndị otu Ipob ji ntecha ọkọlọtọ otu ahụ hazie geeti okpuruọchịchị Orsu dị n'imo steeti.
Powerful kwuru na ọ bụ ndị omekome na-achọghị ọganihu Ipob mere nke a ma na-achọ ibokwasi ya otu Ipob.
N'ọnụ ya, "Onye ọbụla nwereike ị ga-akpa udiri mkpa mkpa a ma bokwasi ya Ipob mana onye ahụ kpachara anya ya makana anyị ga-eme ya ihe ha atụghị anya."
O kwuru na Ipob adịghị ka otu Boko Haram mgbe ọ nụrụ na ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ ndị otu Ipob tinyere ntecha ahụ iji gosi na ha azọkọrọla okpuruọchịchị Orsu ma napụ ya n'aka gọọmenti Imo steeti.
Powerful gara n'ihu kwuo na otu Ipob nwudoro ụfọdụ ndị omekome na-emetọ aha ha mana o kwuru na ọ gaghị agwa ọha ihe ha mere ndị omekome ha nwudoro.
O nwere ihe pụrụiche ntecha ọkọlọtọ Ipob na geeti Orsu LGA pụtara?

Ebe foto si, Screengrab
Ọkaiwu Goddy Uwazurike bụ ọkaiwu a ma ama kwuru na mkpa mkpa na-akpa n'okpuruọchịchị Orsu bụ nke ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-akpasu.
Uwazurike kwuru na ọ bụ ndị agha ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị nọ n'Orlu Senatorial district nakwa okirikiri ya gụnyere Orsu na-eme ihe ndị a , mana ha mecha e bo ya Ipob.
N'ọnụ ya, "o kwuru na ndị agha ahụ na-abụ ha gbuchapụ isi mmadụ ha ga dowe ya n'okporoụzọ iji bute ụjọ n'obodo."
O kwuru na etu ahụ ndị omekome si were ntecha ọkọlọtọ Ipob na geeti Orsu LGA gosiri na ha chọrọ ka ndị agha na ndị uweojii Naịjiria ga buru ngwa agha ha gawa ọgụ ebe ahụ.
N'ọnụ ya , "ihe a ka Bekee na-akpọ "set up" (i sinyere mmadụ ọnya). Ihe na-eme n'Orsu ga -emegide banye afọ ọzọ ruo mgbe onye ọhụrụ ga-eweghara ọchịchị Imo steeti."
Goddy Uwazurike na-anọchite anya Ohaneze Ndigbo n'ikpe Nnamdi Kanu mgbe ọbụla nwa amadi a pụtara n'ụlọikpe dị n'Abuja.
Ọ bụbụ onyeisi otu aka Ikenga bụ otu na-ahụ maka ọdimma ndị Igbo.
Onye bụ Nnamdi Kanu?
Nwannekaenyi "Nnamdi" Kanu chọpụtara otu na-alụ ọgụ nnwereonwe ndị Igbo bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) n'afọ 2014.
Otu ahụ chọrọ ka steeti ndị dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa kewara ma hibe mba a kpọrọ Biafra.
Nke a abụghị ihe ọhụrụ dịka ndị ọchịchị Igbo n'afọ 1967 kpebiri na a ga-enwe Biafra steeti mana ka alụchara agha nke butere ọnwụ mmadụ ruru otu nde , atụmaatụ ahụ abiaghị na mmezu.
Kanu malitere redio Biafra n'afọ 2009 nke e hibere na London ma na-ezipu ozi nye ndị Igbo bi na Naịjirịa.
Ọ gara mahadum na Naịjiria, (University of Nsukka) tupu ọ gawa London.
Ọ lụọla nwaanyị ma jide ụmụ.
Gịnị bụ Ipob?
Ipob pụtara 'Indigenous People of Biafra'.
Ọ bụ otu na-azọ ka mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa bụrụ obodo nke aka ya.
Mana gọọmentị Naịjirịa akpọọla ha otu na-eyi ndụ egwu, ma kwuo na o megidere iwu mmadụ isonye n'otu ahụ.
Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Ipob.









