Orsu Attack: Ndị oji egbe atọ na otu Inspector anwụọla na mwakpo e mere ụlọọrụ ndị uweojii n'Imo Steeti

Ụlọ ụrụ ndị uweojii n'Orsu

Ndị uweojii Imo Steeti ekwuola na otu onye otu bụ onye "Inspector" na mmadụ atọ ndị oji egbe bịara ịwakpo ụlọ ọrụ ha Awo-Idemili nke okpuruọchịchị Orsu, Imo Steeti lara mmụọ dịka ha na-akwakọrịta mgbọ.

N'akwụkwọ mgbasaozi Michael Abbatam bụ ọnụ na-ekwuru onyeisi ndi uweojii n'Imo binyere aka, ndị uweojii sị na ndị a bịara mwakpo a tụrụ ogbunigwe n'elu ụloọrụ ndị uweojii a nke mere ka ọkụ banye n'ụlọ ahụ.

Ha sịkwa na ọ bụ n'ime abalị Tọzde ka mwakpo a mere.

Ọ sị: "Ọ bụ ọtụtụ ndị oji egbe bịara mwakpo a. Ọgbunigwe ha tụrụ mụnyere ọkụ n'ụlọ nakwa ụgbọala nọ n'ụlọọrụ ahụ." Abbatam sị na ndị uweojii nọ n'ogige ahụ bara ndi oji egbe a ọgụ ma chụpụ ha.

Ọ sị: "Mmadụ atọ n'ime ha nwụrụ ebe ndi ọzọ bụ mgbọ egbe gbaba n'ime ọhịa."

Dịka ndị uweojii siri kwuo, ha napụrụ ndị ahụ otu egbe 'pump action' na egbe ọka abụọ nwere ọnụ abụọ.

Ndị bi na mpaghara ahụ si na ọ bụ dịka ọ na-akụ elekere itoolu n'abalị ka ihe a mere.

Awo-Idemili
Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị mmadụ n'Awo-Idemili agbapụla maka ihe a mere.

Ndị uweojii na-arịọ ndị Orsu ka ha nyere ha aka tuọ ndị a ha na-achọ aka, ọkachasi ndị a hụrụ na-agwọ mmerụ ahụ mgbọ egbe. Ha sị ka ụlọọgwụ gbakwaara ha ama.

'Etu e siri gbuo onye uweojii'

Awo-Idemili

Ebe foto si, Alamy

Onye ntaakụkọ BBC gara ebe ahụ kwuru na ndị obodo sị na dịka mwakpo a mere, ndi uweojii nọ n'ụlọọrụ ahụ gbara ọsọ mana otu onye n'ime ha dara, nke nyere ndị omekome a ohere igbu ha ma bepu ya isi.

Onyeisi ụlọọrụ ndị uweojii merụkwara ahụ, dịka ndị hụrụ oge ihe a mere kwuru.

Ha sịkwara na e mebiri ụgbọala onyeisi ndị uweojii a.

Otu anya ọzọ hụrụ mkpa mkpa a sị na oge ndị uweojii bịara ebe ahụ dịka ọ kụrụ elekere iri na abụọ nke abalị, ndị omekome a agbapụla.Anya ndị hụrụ ihe a sịkwa na ha ahụghị ndị omekome nwụrụ na mwakpo a dịka ndị uweojii siri kwuo n'akwụkwọ ozi ha zipuru.

Ọtụtụ mmadụ anwụọla na mwakpo na-eme n'obodo dị iche iche n'Ọwụwa Anyanwụ.

Ndị uweojii na-ekwu na ihe karịrị mmadụ narị bụ ndị otu ha anwụọla site 2020 ruo 2021 ebe Amnesty International na-ekwu na ihe karịrị mmadụ narị na iri ise anwụọla n'aka ndị ọrụ nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ n'oge ahụ.