Imo Prison Break: Ọ bụ otu Gọvanọ chịburu Imo steeti haziri ndị wakporo ụlọmkpọrọ n'Owerri - Declan Emelumba

Ebe foto si, Declan Emelumba
Dịka a ka na-achọ ndị ekperima wakporo ụlọ mkpọrọ nakwa isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Owere n'ụbọchị ise nke ọnwa Eprel 2020, Kọmishọna mgbasaozi n'Imo steeti bụ Declan Emelumba ekwuola na ọ bụ otu onye bụbu gọvanọ Imo Steeti haziri ndị ekperima mere ya bụ mwakpo.
Emelumba kwuru nke a oge ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu n'Owere n'ụbọchị Tọzde.
Ọ bụ eziokwu na Emelumba akpọghị onye ọbụla aha, mana ụfọdụ ihe o kwuru rụtụrụ aka onye ọ na-ekwu maka ya.
- Owerri Prison Break: Ọ bụghị ndị Ipob mere ihe mere n'Owerri - Uzodimma
- Owerri Prison Break: Ọ dịghị mma etu onyeisi uweojii jiri bo ipob na emeghị nchọpụta - Uwazuruike
- Ihe a na-eme n’ala Igbo bụ ajọ ekwe na-akụ - Uche Mefor
- Ọ bụrụ na ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ ahazigharịghị nchekwa ọwụwa anyanwụ, ESN ga-eguzosi ike
Lee ụfọdụ Ihe Emelumba kwuru nke nwere ike igosi onye ọ na-ebo ebubo a:

- Onye ahụ bụ onye chịburu Imo steeti dịka Gọvanọ
- Onye ahụ bụ onye gọọmentị Imo steeti jichiri akụnaụba ya nke ha boro ebubo na o nwetara n'ụzọ ezighi ezi
- Onye ahụ gara ụlọikpe ịkwụsị gọọmentị Imo steeti ijichi akụnụba ya
- Onye ahụ ji aka ike chọọ iweghara akụnụba ya nke gọọmentị Imo steeti jichiri
- Onye ahụ ekwubeghị okwu ọbụla iji katọọ mwakpo ndị ekperima na-eme n'Imo steeti na nsonso a
- Otu ndị ntoroọbịa mpaghara Ugwu wepụtara akwụkwọ ozi ebe ha nọrọ katọọ gọvanọ Imo steeti nke nọ ugbua, ma too gọvanọ nke ahụ pụrụ apụ
Ọ bụrụ na i lechaa nkọwa ndị a anya, ị ga-eji uche mara onye Emelumba na-ekwu maka ya, maka na a tụọ ilu nkịrịka nkata, onye agwara amarala onwe ya.
Oge BBC Igbo kpọtụụrụ Emelumba, o kwuru na ya kwuru ihe ndị ahụ n'eziokwu.
O kwukwara na ya ga-akpọghachi anyị azụ ka o tiwaara anyị akụ oyibo nsugbe.
Emelumba na Uzodinma na-ekwu otu ihe

Ebe foto si, Hope Uzodinma
Cheta na Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma kwukwara ihe yitere nke a Emelumba kwuru.
Uzodinma gwara ndị ntaakụkọ Channels na ọ bụghị ndị otu IPOB na-eme mwakpo ahụ dịka ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ si ekwu.
"Anyị ma ndị na-akwado ndị ekperima ka ha na-awakpo Imo steeti," Uzodinma na-ekwu.
"Anyị ma ebe ha nọ mee ya bụ nzukọ nakwa etu ha si mee ya."
"Ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị a na-esi n'ebe dị icheiche akpọbata ndị ekperima ka ha na-awakpo steeti anyị."
Mana Uzodinma akpọghị onye ọbụla aha, kama o kwuru na nnyocha ka na-aga n'ihu, "obere oge, ihe niile ga-apụta ihe".













