Etu ndị 'unknown gunmen' si gbuo nwoke fọrọ otu izuụka ka ọ gbaa akwụkwọ n'Ebonyi

Ebe foto si, Isaac Chukwu/Facebook
Ndị uweojii Ebonyi steeti ekwuola na ha na-agba mbọ ịnwụchi ndị ojiegbe gbagburu otu nwoke aha ya bụ Isaac Chukwu n'ụbọchị Sọnde, abalị iri nke ọnwa Eprel 2022.
Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ kwuru na ha wetara mkpesa gbasara ọdachi a nke mere n'Ebebe Junction dị n'Abakiliki, isi obodo Ebonyi Steeti.
Isaac Chukwu, onye e ji "Ochudo' mara ,na-akwado ịgba nkwụ nakwa agbamakwụkwọ ya n'ụbọchị 21 na 23 nke ọnwa Eprel a.
Akụkọ kwuru na nwaamadị ahụ bụ onye obodo Enyibichiri Alike dị n'Okpuru Ọchịchị Ikwo n'Ebonyi steeti mechiri ọdọahịa ya , ya na nwaanyị ọ chọrọ ịlụ na-abanye ụgbọala ya n'ebe Elekere Itoolu nke abalị oge ụmụokorobịa wakporo ya ya gbalie egbe elu ma gbakwa ya egbe ugboro atọ.
Loveth Odah kwuru sị, "Ọ bụ onye nwe ụlọ Isaac Chukwu bi na ya wetara mkpesa ahụ n'ụlọọrụ ndị uweojii."
"O kwuru na oge ndị ojiegbe ahụ gbara Isaac egbe, ndị mmadụ bugara ya ụlọọgwụ mana ọ nwụrụ n'ụlọọgwụ."
"Anyị ka na-eche ka ndị ezinụlọ ya bịa weta mkpesa, mana anyị amalitela nnyocha."
"Ọ tụrụ anyị n'anya na ụdị ihe a mere maka na anyị ahụbeghị ụdị ihe dị otu a na nso nso a."
"Onyeisi ndị uweojii bụ Garba Aliyu enyela iwu ka e wefee okwu a na ngalaba 'Criminal Investigative Department'."
Onye bụ Isaac Chukwu?

Ebe foto si, Isaac Chukwu/facebook
N'ozi o tinyere n'akara Facebook ya, Isaac dere na ọ bụ onye Ikwo n'Ebonyi steeti, ma gụkwaa akwụkwọ na mahadum Ebonyi Steeti.
E wepụ nke a, o nwebeghị ọkpụrụkpụ ihe ọzọ anyị matarala gbasara nwa amadị a.
Ndị Uweojii kwuru na ha ka na-eche ịnụ n'ọnụ ndị ezinụlọ ya.
BBC Igbo na-agbakwa mbọ ka anyị na nwa ada ahụ ọ chọrọ ịlụ nwee mparịtaụka.
Etu ndị uweojii Anambra gbochie ndị ekperima chọrọ ịwakpo ụlọọrụ ha dị na Nteje

Ebe foto si, AFP
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Toochukwu Ikenga akọwaala etu ndị uweojii si gbochie mwakpo ndị ekperima n'ụlọọrụ ha dị na Nteje.
Mwakpo a mere n'elekere atọ nke isi ụtụtụ Tọzde, Eprel 14 2022.
Ikenga kwuru sị: "Oge onyeisi ndị uweojii bụ Echeng Echeng kpọ ndị ọrụ ya na-agbata, ndị ekperima ahụ malitere ịgba ha egbe."
"Ndị uweojii zaghachiri site n'ịkwa mgbọ nke ha ma gbagbuo otu n'ime ndị ekperima ahụ ebe ndị ọzọ bu mgbọ egbe gbaa ọsọ."
Ikenga kwuru na ndị uweojii natara onye ahụ ha gburu otu egbe O6 rifle, ọtụtụ mgbọ egbe, nakwa ọgwụ dị icheiche a gwọrọ agwọ.
O kwuru na ndị uweojii ga na-aga n'ihu n'ịrụ ọrụ ha nke bụ iwulite nchekwa n'Anambra steti nakwa na Naịjirịa.















