Open Grazing Ban: Ipob ahazigharịala mmachị nchigharị ehi Awụsa n'ala Igbo ha tinyere taa bụ April 27, 2022

Ebe foto si, Getty Image/BBC
Otu Indigenous People of Biafra ekwuola na bido taa bụ April 27, 2022 gawa n'ihu, onye ọbụla na-ere ehi gaa tinye ehi ya n'ọdọ ehi nke bekee kpọrọ "Ranching".
Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru otu Ipob kwuru na Ipob bidoro na mbụ machie nchigharị ehi mana otu ahụ mechara chegharịa kwuo na onye ọbụla nwere ehi tinye ya n'ọdọ ehi nke bekee kpọrọ Ranch.
O kwuru na nke a bụ makana ọtụtụ ndị Igbo na-eme azụmahịa ehi nke bụ Ipob agaghị achọ ka ha mebie azụmahịa ndị Igbo.
N'ọnụ Powerful "mee azụmahịa ehi gị mana achịgharila ehi gị n'ala Igbo."
O kwuru na ọchị ehi ọbụla gara n'ihu chịgharịa ehi ha ma ghara itinye ya n'ọdọ ehi , na a ga-awakpo ehi ha maọbụ ihe ọbụla ha hụrụ, ha were.
Powerful kwuru na ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ amachibuola nchịgharị ehi n'ala Igbo mana ugbua Ipob ga-ahụrịrị na ọ ga-eme.
O kwuru na ọ ka mma na ndị Igbo bidoro zụwa ehi Igbo.
Anyị ga-amalite ịhụ na iwu mmachị ịchịgharị ehi dị ire - Ipob
Ọnụ na-ekwuru otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) bụ Emma Powerful ekwuola na ha ga-amalite ọrụ n'immachi ndị ọchị ehi echigharị ehi ha n'akụkụ Ọwụwa anyanwụ Naịjịria dị ịcheịche.
Ipob bụ otu kwuru na ha na-alụ ọgụ nnwereonwe nye ndị Biafra ekwubụọla maka atụmatụ a na mbido afọ 2022 mana n'ozi ọhụrụ a Powerful zipụtara kwuru na ga-amalite mmanye iwu a bido n'ụbọchị iri abụọ na asaa n'ọnwa Eprel, 2022.
Iwu a nke Powerful kwuru na Nnamdi Kanu bụ onye ndu ha kwadoro kwuru na dịka gọvanọ steeti ndị Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa mere mkpebi n'okwu iwu a, na ha bụ ndị Ipob ga-anọ n'isi imanya ya bụ iwu nke ha boro ebubo na ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa ekweghị mmanya ndị mmadụ n'akụkọ Ọwụwa anyanwụ Naịjirịa bụ ebe edeberela iwu dị etu a n'akwụkwọ steeti ndị nọ ebe ahụ.
Ozi Ipob dere: "Onye ọbụla chọrọ ịchị ehi na mpaghara Ọwụwa Anyanwu Naịjirịa ga-edebanye aha ya ma chịa ehi ya n'ebe edopụrụ ya iche"
"Onye ọbụla ahụrụ ehi ya ka ọ na-akpagharị n'ebe na-abụghị ebe edopụrụ ya iche ehi, ihe onye ahụ hụrụ ya were"
Ozi Powerful kwuru na ndị nwee ehi ọbụla ga-abanye Ọwụwa Anyanwụ ga-enwe akara njirimara a ga-aka n'elu ebe ọbụla ha dopụrụ ehi ha iche maka ọzụzụ nke ga-abụ etu a ga-esi mara onye nwe ehi na ebe ehi ndị ahụ si.
Ipob kwuru na ha na-eme nke a iji hụ na-akwụsịrị mwakpo ha sị ndị ọchị ehị na-eme n'akụkọ ọwụwa Anyawụ Naịjirịa dị ịcheịche.

Ebe foto si, Getty Images
Cheta na n'oge gara aga na Ipob machiri ndị mmadụ iri anụ ehi Awusa n'Ọwụwa Anyanwụ nke mere otu jikọrọ ndị na-ebudata anụ na nri n'Ọdịda Anyanwụ a kpọrọ 'Amalgamated Union of Foodstuff and Cattle Dealers of Nigeria' ji kwuo na ha ga-agbaso mkpebi a Ipob site n'ịkwụsị ibudata ahịa na mpaghara ala Igbo mana nke a mechara hapụ ịdị ire.
Iwu ndị ọzọ Ipob bipụtarala n'oge gara aga nye ndị bi n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa gụnyere: Iwu ka a kwụsị igụ abụ ala Naịjirịa, Iwu ịnọ n'ụlọ kwa ụbọchị Mọnde a na-akpọ 'sit-at-home', Iwu ka ndị mmadụ ghara isonye na ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti nke afọ 2021, Iwu ka akwụsị ife Ọkọlọtọ Naịjiria na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

Ebe foto si, Delte State Gov
Kedụ ka okwu mmachi ehi a siri mmalite?
N'afọ ole m ole gara aga, ọnọdụ enweghị nchekwa n'akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa dị ịcheịche malitere kawanyewa njọ dịka otu n'ime ihe ndị mmadụ gabigara bụ okwu etu ndị ọchị ehi si achịrị ehi ha na-emebisi ugbo na ọrụ ubi ndị mmadụ.
Akụkọ mwakpo nakwa ndịna n'ike n'aka ndị ọchị ehi malitere dapụtawa kwa mgbe kwa mgbe.
Ọtụtụ ndị obodo dị ịcheịche malitere hibewe ndị nche na-amachị ndị ọchị ehị ịgafe maọbụ banye obodo ha nke kpalitere ọgbaghara nakwa esemokwu n'etiti ndị obodo dị ịcheịche ndị na ọchị ehi.
Ọtụtụ ndị ọchị ehi n'esikarị n'akụkụ mpaghara ugwu Naịjriịa, chịrị ehi ha gbadata ndịdị Naịjirịa n'ihi ebe ndịdị bụ ebe ọtụtụ ahịhịa nakwa akwụkwọ nri na-eto gbanyụụ.
Mmiri na-akakwa ezo na ndịda Naịjirịa nkere dịrị ehi ha mma.
Ọgbaghara si n'ime esemokwu ndị obodo na ndị ọchị ehi tara isi ọtụtụ ndị mmadụ nke mere ọgbakọ gọvanọ ndị ndịda Naịjirịa ji mee mkpebị n'okwu a.
Gọvanọ ndị steeti niile dị na Ndịda Naịjirịa ekwuola na aka ha anabataghịzị ịchị ehi na-agagharị nke Bekee kpọrọ "Open grazing".
Ọ bụ n'ụbọchi 21 nke ọnwa Mee, 2021 ka ndi Gọvanọ Ndịda Naịjirịa nwere nkwekọrịta a n'Asaba bụ isi obodo Delta steeti nke kwuru na ha na-amachi ọchịchị ehi na ndịda Naịjirịa.
Ọtụtụ steeti na ndịda Naịjirịa gbara mbọ debanye iwu a n'akwụkwọ iwu steeti ha.
Gọọmentị Naịjirịa, site n'ọnụ ọkaiwu ukwu Naịjirịa bụ Ababukar Malami, kwuru na ha anabataghị ihe gọvanọ ndịda Naịjirịa mere.









