Nnamdi Kanu Terrorism trial: Onyeisi otu IPOB agbaala akwụkwọ ọhụrụ ịjụ ka e kpee ya ikpe na nzuzo

Ebe foto si, Getty Images
Onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu agbaala akwụkwọ n'ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja ịgbagha atụmatụ ọhụrụ Ụlọikpe Ukwu Etiti wepụtara nke kwuru ka e kpee ya ikpe na nzuzo.
Cheta na Gọọmentị Etiti nwụchiri Nnamdi Kanu na mba Kenya n'ọnwa Juun afọ 2021, kpụlata ya Naijiria ma kpụpụ ya ụlọikpe ebe a na-ekpe ya ikpe maka ebubo ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị na iyi ndụ egwu.
Na nsonso a, Ọkaikpe Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja bụ Jọstis John Tshoho wepụtara akwụkwọ usoro a ga na-agbaso n'ikpe metụtara iyi ndụ egwu a Naijiria bụ nke machiri ịgbasa ozi maka etu ikpe si aga n'ụlọikpe.
Mana n'akwụkwọ nke Kanu gbara site n'aka Ọkaiwu ya bụ Ifeanyị Ejiofor ụbọchị Monde, ọ rịọrọ ka ụlọikpe kpebie na atụmatụ ọhụrụ ahụ Tshoho wepụtara megidere Iwu Naijiria nke afọ 1990 ma kagbuo ya..
Kanu bụ onye kpọnyere aha Jọstis John Tshoho, na onyeisi nhazi ụlọikpe(Chief Registrar) na ndị ọ gbara akwụkwọ chọrọ ka a machie ha na ndị na-agara ha ozi maọbụ na-anọchite ha na ndị ọrụ ụlọikpe Ukwu nke Etiti itinye usoro ọhụrụ ahụ n'ọrụ rue ebighị ebi.
Akwụkwọ ikpe ahụ rịọrọ ka Ụlọikpe Ukwu nke Etiti kwupụta, "na ikike nke onye mbụ (Ọkaikpe) nwere n'Iwu Naijiria Akụkụ nke 254 bụ sọ naanị n'ime ogige Ụlọikpe, ọ bụghị na gburugburu ya nke bụ oke na ọrụ ndị ọrụ nchekwa dịka ndị uweojii, ndị uweojii nzuzo(DSS) wdg.
Ihe ọzọ Kanu rịọrọ bụ " ntụzịaka nke ga-ekwupụta na Usoro Iwu nke Uloikpe Etiti dịka o si metụta ikpe iyi ndụ egwu megidere Iwu Naijria, ya mere na ọ gaghị adị ire."
Ka o si gaa taa dịka Ọkaiiwu Ifeanyị Ejiofor gara leta Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Barr Ejiofor
N'aka nke ọzọ, Ejiofor gakwara zute Nnamdi Kanu n'ogige ndị DSS n'Abuja taa bụ Monde ma gbaa ama na ya na Kanu '"lebara anya n'ụsoro ikpe ha ga-eji akụpụ kpamkpam ebubo asaa ndị fọrọ a ka na-ebo ya"
Ejiofor gara n'ihu sị, "Onye ndu kelere Ụmụ Chineke maka nkwudosi ike ha. Obi dị ya ụtọ na ụnụ ji nghọta na otu obi na-aga".
" Onyendu kwusiri ike maka ike nkwụcha ọkachasị n'oge dịka ugbua , na-agbanyeghị nkusu nile a na-akusu ụnụ."
"Ọ sị ụnụ jisie ike n'ekpere na ịrịọ Chukwu Okike Abiama."
Onye bụ Nnamdi Kanu?
Nnamdi "Nwannekaenyi" Kanu hibere ma bụrụ onye ndu otu a ma dịka Indigenous People of Biafra (Ipob) n'afọ 2012.
Otu ahụ chọrọ ka steeti ndị dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kewapụ na Naịjiria ma bụrụ mba a kpọrọ Biafra.
Nke a abụghị ihe ọhụrụ dịka ndị ọchịchị Igbo n'afọ 1967 kpebiri na a ga-enwe Biafra, mana ka a lụchara agha nke butere ọnwụ mmadụ ruru otu nde, atụmaatụ ahụ abiaghị na mmezu.
Kanu malitere Redio Biafra nke e hibere na London n'afọ 2009 ma na-agbasa ozi nye ndị Igbo bi na Naịjirịa.
N'afọ 2018 ka gọọmentị Naịjiria nke Muhammadu Buhari bụ onyeisi ha, kpọrọ Ipob ndị oyi ndụ egwu.











