Ọ bụghị eziokwu na m chụpụrụ nwaanyị ajadu bụ nwunye nna m - Uchenna Igboanugo

Uchenna Igboanugo na Theresa Igboanugo

Ebe foto si, Uchenna Igboanugo

Uchenna Igboanugo bụ onye a na-ebo ebubo na ọ kwaturu ụlọ nwunye nna ya bụ Theresa Igboanugo apụtala gọ agụgọ maka ebubo a na-ebo ya.

Ọ bụ n'ihe onyonyo o mere ka o kwuru na ọ kwatughị ụlọ nwunye nna ya kama na ọ bụ ebe a na-aga mposi na usekwu ka ọ kwaturu.

O kwuru sị, " Lee ụlo nna m hapụrụ ya, ọ bụ ọnụ ụlọ anọ na ebe ntukwu ka ọ nwere, lee ebe m kuturu n'ihi na m chọrọ ịrụrụ ya ụlọ mposi na usekwu n'ime ụlọ ya".

Uchenna kọwara na ọ bụ maka na ọ chọrọ itinye ọdọ mmiri nke a na-akpọ borehole na bekee mere o jiri kutuo ya bụ ụlọ.

O kwuru," Obi adịghị m mma mgbe m hụrụ ihe onyonyo na-ekwu na m chụpụrụ ha n'ụlọ nna m. Kamgbe ka m na-akụ aka ka ha mepere m ụzọ ka m rụọ ụlo mposi na useku n'ime ụlo ha ma enweghị onye mepere m ụzọ. . . lee ndị ọrụ nọ ebe a eche".

Aha onyonyo, Widowhood in Nigeria: Etu m si gbalahụ mkpagbu a na-akpagbu ndị di ha nwụrụ

Uchenna kwuru na ọ bụ ihe akpara akpa tupu o kutuo ya bụ ụlọ.

O gosiri ihe onyonyo nke ziri ka ndị o kwuru bụ nwunye nna ya na nwa ya nwaanyị na-atuzi aka etu a ga-esi kutuo ya bụ ụlọ.

Ihe Oluchukwu Igboanugo bụ nwa Theresa Igboanugo kwuru maka ya bụ ihe

Kama nwa nwaanyị Theresa Igboanugo bụ Oluchukwu Igboanugo gwara BBC Igbo na enweghị mgbe Uchenna na ha jiri kpaa nkata ọbụla gbasara ikutu ụlọ ahụ.

O kwuru sị, " Uchenna bụ nwa nwanne m, ọ bụ n'ụbọchi frịde ka uchenna biara sị anyị na ọ bịara ịkutu usekwu anyị were tinye ọdọ mmiri".

Nne m jụrụ ya na ọ kutuo usekwu anyị na ọ bụzi ebee ka ọ chọrọ ka ọ nọro siwe nri.

O kwuru sị na dịka ha na-ekwu na nwanne Uchenna nke ọbere bidoro kpọwa ndị mmadụ n'ekwentị.

Oluchukwu kwuru sị, " Nwanne uchenna nke ọ bere kpọrọ ndị mmadụ n'ekwentị were sị na ndị ọ na-akpọ bụ ndị ga-akutu ya bụ ụlọ na eleghị anya n'azụ".

O kwuru na nne ya tiwere mkpu were kpọkuo ndị obodo.

Ọ kọwara na mgbe ndị obodo bịara na ha jụrụ uchenna ebe ọ chọrọ ka Theresa siwe nrị ma ọ kuto ya bụ usekwu.

Oluchukwu kwuru sị, " Ọ nweghị mgbe anyị na Uchenna jiri kpaa nkata ọnụla maka ikutu ya bụ ụlọ".

Oluchukwu gwara BBC na ọnụ ụlọ ha pere mpe ma sịkwa na etinye ọdọ mmiri bọrehola n'ihu ụlọ ha na mmiri si na ya ga-amabi mbara ụlọ ha.

Ihe butere okwu a?

Ọ bụ dịka ihe onyonyo na-efegharị na Soshal Midia na Uchenna Igboanugo chụpụrụ nwunye nna ya na nwanne ya nwoke nke nna ya mụrụ n'ụlọ nna ha.

Ya bụ akụkọ na shoshal Midia kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Satọde ka Uchenna chụpụrụ Theresa Igboanugo n'ụlọ dịka ọ kuturu ebe mposi na usekwu ya.

Akụkọ a kwukwara na Uchenna ji ike chụpụ nwanne ya nwoke bụ nwa Theresa n'ihi na ọ ka ya nwee ego.

Kama Uchenna na-ekwu na ọ bụ ndị obodo kpere ikpe chụpụ ya n'ihi etu o siri ree ala nna ha.

Uchenna kwuru sị, " Enweghị m ike ịchụpụ nwaanne m nwoke onye tọrọ m, onye mụtarala onye ha ka m".