Millanson Afam Ukatu: Etu NDLEA si jide ide ego tụrụ ọgwụike Abba Kyari ji azụ ụlọ bupụrụ

Ebe foto si, NDLEA
Ngalaba na-ahụ maka ibu agha megide ọgwụike bụ NDLEA anwuchiela ide ji ego bụ Afam Mallinson Emmmanuel Ukatu maka ebubo na ọ bụ ya nwee ọgwụ ike ahụ e ji maka ya nwụchie Abba Kyari bụbu osote kọmishọna uweojii.
Cheta na Ndlea kpụpụrụ Abba Kyari n'ọnwa Febuwarị, afọ 2022 maka ebubo na ya na ndị na-ebu ọgwụ ike na-egbunye n'otu akpa dịka ihe onyonyo gosiri ebe ya na ụfọdụ ndị ọrụ NDLEA na-akpa maka ịtọhapụ ndị e jidere maka ibu ọgwụ ike cocaine.
Dịka ozi mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru Ndlea bụ Femi Babafemi,wepụtara ụbọchị Monde si kwuo, Ndlea mara imi n'ala mee nnyocha ọnwa asatọ were sipụta ma nwụchie Ụkatụ n'ọdọụgbọelu Murital Muhammed Airport dị na Legọs, n'abalị nke ọnwa Eprel, afọ 2022.
Ndlea gbara ama na Ụkatụ, onye bụ onyeisioche ụlọọrụ Mallinson Group, ụlọọrụ na-emepụta ọgwụ nakwa plastịk ji ụlọọrụ ya ekpuchi na ọ na-atụ ọgwụike.
Ha kwuru sị, " Nnyocha gosiri na ọ bụ onye na-atụbata ụdị Tramadọl Hydrochloride ndị oke ya dị gram 120mg, 200mg na 250mg bụ ndị iwu mabidoro."
"Ukatu nwe ụlọrụ ebe a na-emepụta ọgwụ na ebe a na-emepụta plastik bụ ebe o ji ekpuchi ọgwụike ọ na-atụbata na Naijiria."

Ebe foto si, NDLEA
Ndlea malitere inyo Ukatu kemgbe afọ gara aga oge ha jidere ndị ọrụ ya bụ ndị o bunyere igbe Tramadol 225mg bụ ndị o zigara ka ha resị ndị uweojii , na amaghị na ndị ahụ bụ ndị uweojii. bụ ndị Abba Kyari zigara dịka onyeisi ngalaba uweojii pụrụ iche bụ IRT n'ịchafụ.
Ha kwetara iresị ndị uweojii ahụ Tramadol ahụ n'ọnwụ nde naira 17 mana ihe a na-ere ọgwụ ahụ bụ nde naira 18 maọbụ nde nara 20 n'ahị azụ ụlọ.
Ka ndị otu Abba Kyari nwụchichara Pius Enidom na Sunday Ibekwete bụ ndị ọrụ Ukatu, ha dugara ha n Ojọta,Legọs ebe ụlọọrụ Millinson na-edowe ngwahịa, ebe ha nwetara igbe ebe a na-edowe ngwaghịa.

Ebe foto si, Abba Kyari
Ndị ọrụ Abba Kyarị nwetara igbe ọgwụ Tramadol 197 Tramadol ọzọ nke ego ya gbakọtara dị ijeri naira atọ(N3bn) mana naanị igbe 12 ka ha bunyere Ndlea n'ụgbọala ngwongworo nka ọ gachara izụka atọ.
Ha ekwuteghị okwu igbe 190.
Ka ọ dị ugbua , Abba Kyari na ndị uweojii anọ ndị ọzọ welitere isi n'otu ya na-azara ọnụ ha n'ụlọikpe dị n'aBUJA n'ebubo yiri nke a a na-ekwu maka ya.
Onye bụdị Mallinson Afam Emmanuel Ukatu?
- Ụkatu bụ onye nwe ụlọọrụ Mallinson Group of Companies
- Ụlọọrụ ya na-emepụta ọgwụ ma nwekwa nke na-arụ plastik
- Ukatu nwere ụlọọrụ 'Nispo Porcelain company' na-azụ ihe gbasara ihe e ji arụ ụlọ dịka 'tile'PVC' na ceramic'.
- O nwere akpaego n'ụlọakụ ruru 103,dịka Ndlea si kwuo
- Nwa amadị ahụ gụrụ 'Philosophy na mahadum 'University of Nsukka na-azụbu ahịa tupu ọ banye na mmepụta nwa ahịa
- Aha ya na-akpọtụ akpọtụ dịka o ritere nturugo na aka ụfọdụ ụlọntaakụkọ. Iji ma atụ: 'Silverbird 'Man of the Year n'afọ 2018 na Sun Enteprenuer of the Year n'afọ 2019.
Akụkọ ka na-abịa









