Abba Kyari in court today: Nwunye Abba Kyari kubituru ume n'ụlọikpe taa

Ramatu Kyari bụ nwunye Abba Kyari bụ osote kọmishọna uweojii a na-enyo maka ihe gbasara mgbere ọgwụ ike, adaala shọbọọ n'ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja.
Ramatu dara n'ala ka obere oge gachara mgbe Jọstis Emeka Nwite bụ ọkaikpe nọ n'isi ikpe ahụ jụrụ ibinye aka n'akwụkwọ di ya na mmadụ isii ndị ọzọ a na-enyo maka okwu mgbere ọgwụ ike ahụ tinyere ka a tọhapụ ha nwa mgbe nta ruo mgbe e kpebiri ikpe ha.
Ramatu dara mgbe ọ hụrụ ka ndị ụlọọrụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) kpọ Kyari na ndị otu ya apụ n'ụlọikpe ahụ.
Ndị otu NDLEA na ụfọdụ ndị ọkaiwu bupuru ya buga ya n'otu imeụlọọrụ dị n'ụlọikpe ahụ, dịka ndị ntaakụkọ Channels TV na-ekwu na a nụrụ ebe otu nwaanyị ya na ya so na-ekwu na o nwere ọrịa nchinume (asthma).
Nke a mere dịka ụlọọrụ NDLEA rịọrọ ụlọikpe ka ha ghara ịtọhapụ Kyari na ndị otu ya nwa mgbe nta.
Ha gwara ụlọikpe na Kyari nwere ike iri mbombo ọsọ maọbụ ghara ịbịa ikpe ma a tọhapụ ya.
Ka ọ dị ugbua, e yigharịala ikpe a ruo 28 nke ọnwa Maachị afọ 2022.
Etu ikpe ya si gaa n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Maachị

Ụlọikpe dị n'Abuja nke na-ekpe ikpe dị n'etiti National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) na Abba Kyari bụbu osote Kọmishọna uweojii, eyigharịala ụbọchị ikpe ya ruo 14 Maachị, 2022, dịka Ọkaikpe Emeka Nwite si kwuo.
Ụlọọrụ na-ahụ maka nwuchi ndị tinyere aka n'ọgwụike bụ NDLEA, kpụpụrụ Kyari ụlọikpe nke ukwuu n'Abuja.
Ka Kyari malitere okwu ya, ọ rịọrọ ọkaikpe na o meghị ihe niile ha sị na o mere.
Ya na ndị otu ya ruru mmadụ ise ka a na-enyo ma aka ha adị n'orire ọgwụike cocaine ruru 21.25kg.

Cheta na ụlọikpe Amerịka ezitara ozi ka anwụchi Abba Kyari n'Epreel 2021 maka ebụbo eboro ya na Ramon Abbas onye e ji "Hushpuppi" nyere ya ego aka azụ, nke mere e jị kwusi ya ọrụ.
Kyari na ndị otu ya gbara n'ihu ọkaikpe Emeka Nwite maka ịzara ọnụ ha n'ebubo asatọ atụkwasara ha n'isi.
Ya bụ ebubo e boro ha na-ekwu na Kyari na ndị otu ya buru ọgwụike dị 17.55kg nke ha enweghị ikike gọomentị ịme.
A ka na-achọ Kyari achọ n'Amerịka.
Ka ọ dị ugbua, ọkaikpe ukwu Naịjirịa bụ Abubakar Malami etinyela aka n'akwụkwọ inye ikike ka a kpụrụ Kyari ga Amerịka maka ikpe ya na Ramon Abbass Hushuppi.

Mba Amerịka tụrụ anya na Kyari ga-abịa zara ọnụ ya maka ebubo ibuba ego gbara ọkpụrụkpụrụ na mba ahụ.
N'ọnwa Apreelụ 2021, ụlọikpe na Califonia nyere ikike ka akpọta Kyari ụlọikpe ebe ha ahụ maka ikpe ya.
Maka ya bụ akwụkwọ mba Amerịka degaara gọomentị Naịjirịa ka Mallam ji nye ikike ka akpụga ya ebe ahụ maka ịzara ọnụ ya.
Ọ sị na ihe ya ji ahapụ ka Kyari gawa mba Amerịka bụ na ọnweghịzị ikpe ọzọ ọnwere ịza na Naịjirịa.

Onye bụ Abba Kyari?
Abba Kyari bụ onye uweojii a ma ama nọbu n'isi ibuso ndị omekome na ndị ntọrị mmadụ agha.
Ọ bụ osote komishọna ndị uweojii tupu akwụsị ya n'ọrụ n'afọ 2022 n'ihi mmekọrịta ya na onye ndị mba Amerịka na-enyo maka wayo na nrụrụaka bụ Ramon Abbas e ji Ray Hushpuppi mara.
A mụrụ ya na 17 March 1975.
Gịnị bụ NDLEA?
NDLEA bụ National Drug Law Enforcement Agency.
Ọ ngalaba dị n'okpuru Ministrị ikpe kwụmọtọ. Ha bụ ụlọọrụ ndị na-elebaanya n'ịkọ, irụpụta, ịṅụ, irepụ maọbụ ibugharịa ọgwụike.
NDLEA dịka a na-akpọ ya n'ịchafụ bụ ngalaba ehibere site Decree 48 nke 1989, n'oge Onyeisiala ndịagha bụ Ibrahim Badamosi Babangida.
E hibere ha n'oge mgbe nsogbu ọgwụike na-amụbanye na mba ụwa niile.









