'Ahụ esighị m ike, biko tọhapụnụ m' - Abba Kyari

Abba Kyari

Ebe foto si, Facebook/Abba Kyari

Abba Kyari, bụbu onyeisi ngalaba ndị uweojii a kpọrọ 'Intelligence Response Team', agbaala gọọmentị Naịjirịa akwụkwọ n'ụlọikpe dịka a nwụchiri ya maka ebubo ibu ọgwụ ike.

Kyari gbara akwụkwọ site n'aka ọkaiwu ya bụ Cynthia Ikena, n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja, ma kwuo na ahụ esighi ya ike ịnọ na mkpọrọ.

Cheta na ndị ọrụ nchekwa na-egbochi ịṅụ ọgwụ ike bụ 'National Drug Law Enforcement Agency' (NDLEA) nwụchiri Abba Kyari.

Ha boro ya ebubo na ya na ndị otu ya ndị uweojii bupụrụ ọgwụ ike ruru kilogram iri na ise.

N'ime akwụkwọ ahụ Abba Kyari gbara n'ụlọikpe, o kwuru na ya na-arịa diabetes nakwa hypertension.

Ọ chọrọ ka a tọhapụ ya na mkpọrọ ndị NDLEA ruo oge a ga-akpụpụ ya ụlọikpe maka ebubo ibu ọgwụike.

Mana ọkaikpe Inyang Ekwo kwuru na ụfọdụ ihe Kyari dere n'ime akwụkwọ ahụ kwesịrị ka ndị ọ gbara akwụkwọ sara ọnụ ha.

Etu e si nwuchie Abba Kyari

Tupu nsogbu ya amalite, Abba Kyari bụbu onye uweojii e ji ama atụ na Naịjirịa, n'ihi etu ya na ndị otu ya si ebuso ndị ekperima agha.

Mana ihe mgbu ya malitere oge a nwụchiri otu nwaokorobịa aha ya bụ Ramon Abaas, onye e ji Hushpuppi mara, n'obodo Dubai, n'ihi izu ohi na ịntanetị.

Nnyocha gosiri na Hushpuppi na Abba Kyari na-arụkọ ọrụ, dịka a chọpụtara na ọ na-ezigara ya ego ugboro ugboro.

AbbaKyari na Hushpuppi

Ebe foto si, AbbaKyari/Hushpuppi/Instagram

Nkọwa foto, AbbaKyari na Hushpuppi

Nke a mere e ji kwụsị Abba Kyari ọrụ n'otu ndị uweojii, ma mlite nnyocha ihe jikọrọ ya na Hushpuppi.

Dịka nnyocha a na-aga n'ihu, otu ụlọikpe na mba Amerịka nyere iwu ka a nwụchie Abba Kyari ma kpụta ya ụlọikpe na mba ahụ, maka na aka ya adịghị ọcha gbasara mmekọrịta ya na Hushpuppi.

Ya bụ okwu ka a ka kpụ n'ọnụ oge ndị NDLEA wepụtara akwụkwọ n'ụbọchị 14 nke Febrụwarị 2022, ma kwuo na Abba Kyari bụ onye a na-achọ achọ, maka ebubo ibu ọgwụ ike.

Ka nke a mere, onyeisi ndị uweojii bụ Usman Alkali Baba, nyere iwu ka a nwụchie Abba Kyari ma nyefee ya n'aka ndị NDLEA.

Ọ bụ etu a ka Abba Kyari si nọrọ n'ụlọ mkpọrọ ndị NDLEA ruo ugbua.