Abba Kyari Update: Ndị uweojii anwụchiela Abba Kyari na ndị uweojii anọ ọzọ hafee ha n'aka ndị NDLEA

Onyeisi ndị uweojii bụ Alkali Baba enyela iwu ka a nwụchie Abba Kyari na ndị uweojii anọ ndị ọzọ e boro ebubo ibu ọgwụike.
Nke a na-abịa dịka ndị ọrụ mgbochi ibu ọgwụike bụ 'National Drug Law Enforcement Agency' (NDLEA) kpọpụtara aha Kyari dịka onye a na-achọ achọ.
N'akwụkwọ ozi ndị uweojii wepụtara na mgbede Mọnde, ha kwuru na ha ehibekwala nnyocha imeụlọ nke ha iji ruo n'isi ya bụ okwu.
Ihe ndị uweojii kwuru gbasara ebubo NDLEA boro Abba Kyari
- N'ụbọchị 19 nke ọnwa Jenụwarị 2022 ka ndị uweojii ngalaba 'Intelligence Response Team' (IRT) nwụchiri mmadụ abụọ bu ọgwụike 'cocaine' si Ethiopia bata Naịjirịa
- N'ụbọchị 25 nke ọnwa Jenụwarị ka ndị uweojii hafere okwu ahụ n'aka ndị NDLEA
- Mana nnyocha gosiri na ụfọdụ ndị uweojii gara ije adịghị mma gbasara nnwụchị ndị ahụ buru ogwụ ike nakwa ọgwụike ha buru
- Nnyocha gosikwara na ndị ahụ na-ebu ọgwụike na ndị NDLEA na-arụkọ. Mmadụ abụọ ahụ e jichiri kwuru na ọ bụ ndị NDLEA na-enyere ha aka ibufe ya bụ ọgwụike
- Mmadụ abụọ ahụ e ji eji kwuru na o teela aka ha na ndị NDLEA rụkọwara ọrụ, kamgbe afọ 2021
- Ndị uweojii aka ha dị na nrụrụaka a gụnyere DCP Abba Kyari, ACP Sunday Ubuah, ASP Bawa James, ASP John Umoru (onye a na-achọ achọ), Inspr. Simon Agrigba na John Nuhu.
- Anwụchiela mmadụ anọ ndị a, ma ewepụ onye nke na-agba ọsọ, ma nyefee ha n'aka ndị NDLEA
- Ndị NDLEA kwesịkwara ime nnyocha , nwụchie ma kpọpụtakwa aha ndị otu ha bụ ndị ha na ndị ekperima na-ebu ọgwụ ike na-arụkọ
"Akụkọ Abba Kyari dịka onye a na-agwọ ibi, ya na-eto afọ" - Ọkaiwu Goddy Uwazurike

Ebe foto si, Goddy Uwazurike/Abba Kyari
Ọkaiwu a ma ama na Naịjirịa bụ Goddy Uwazurike ekwuola na Abba Kyari "dịka onye a na-agwọ ibi afọ a na-eto ya".
Uwazurike kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC gbasara akụkọ pụtara n'ụbọchị Mọnde, Febrụwarị 14, na nwa amadị a bụ Abba Kyari bụ onye a na-achọ achọ n'obodo Naịjirịa.
Abba Kyari bụ onye uweojii a ma ama nọbu n'isi ibuso ndị omekome na ndị ntọrị mmadụ agha.
Mana ndị ọrụ nchekwa mba Amerịka na nke ndị Naịjirịa na-ebo ya ebubo na ọ bụkwa onye omekome n'onwe ya.
Uwazurike kwuru na okwu a pụtara ọhụrụ gbasara Abba Kyari emeela ka ikuku kuo, ka a hụ ike ọkụkọ.
"E nwere mgbe ọ bụ a kpọọ aha Abba Ktari, onye ọbụla a na-eto ya na-ekwu na ihe adịla mma, mana ugbua ihe niile zoro ezo agbaala n'anwụ," Uwazurike kwuru.
"Nke a pụtara na e kwesịrị inyocha ihe niile Abba Kyari mere oge ọ nọ n'ọrụ uweojii, ma ndị niile ọ nwụchiri tinye n'ụlọ mkpọrọ."
Uwazurike chetara ihe otu nwoke eji 'Evans' mara, bụ onye a na-ebo ebubo ịtọ mmadụ, kwuru gbasara Abba Kyari.
Ọ sị: "Evans kwuru n'ụlọikpe na nwoke a (Abba Kyari) nọ n'ihu ya gbagbuo mmadụ olemole, nke mere ya ji were ụjọ dee ihe ọbụla ọ gwara ya ka o dee."
"Ruo taa, ndị uweojii elebeghị anya n'ebubo ahụ Evans boro Kyari."
"Mana ọ bụzi ndị Amerịka na ndị Dubai bịara nyochapụta wee kwuo sị lekwa onye nwoke a bụ Aba Kyari bụ n'ezie."
Dịka akụkọ ọhụrụ a pụtara gbasara Abba Kyari, ụfọdụ kwuru na soshal midia na nke a bụ ụzọ aghụghọ iji ghara ịkpụga ya mba Amerịka ka e kpee ya ikpe dịka ndị uweojii mba ahụ na-achọ ya.
Otu onye aha ya bụ Dr Penking na Twitter dere sị: "Nke a bụ etu ndị NDLEA si chọọ inyere onye uweojii a aka ka a ghara ịkpụga ya USA."

Ebe foto si, Twitter screengrab
Mana Uwazurike kwuru na nke ahụ abụghị eziokwu.
Ọ jụrụ sị: "Onye e boro ebubo izu ohi ọkụkọ, onye ọzọ ebo ya ebubo iji egbe aga ohi, kedụ nke ka njọ?"
"Ebubo ndị ọrụ nchekwa Amerịka boro Abba Kyari na nke ndị NDLEA boro, kedụ nke ka njọ?"
"Nke a pụtara na aha ya emetọọla kpamkpam, ihe dara ada adago. Abba Kyari bụzi aha onye ọbụla na-agbara ọsọ."
E kwesịrị inyochagharị nnwụchi Abba Kyari nwụchiri Evans - Uwazurike

Ebe foto si, Getty Images
Cheta na Abba Kyari bụ onye uweojii a ma ama nọbu n'isi ibuso ndị omekome na ndị ntọrị mmadụ agha.
Evans bụ nwoke ezigbo aha ya bụ Chukwudumeme Onwuamadike, onye a nwụchiri n'afọ 2017 maka ịbụ onyeisi ndị ntọrị mmadụ.
Na mbụ, Evans kwetara na ya bụ onye ntọrị mmadụ, mana o mechara kwugharịa sị: "abụghị m onye ntọ' kama ọ bụ ndị uweojii manyere m ka m kweta ihe mụ meghị."

Ebe foto si, Police
Uwazurike chetara ihe Evans kwuru gbasara Abba Kyari na etu ndị uweojii si taa ya ahụhụ.
Ọ gwara BBC Igbo sị: "Evans kwuru n'ụlọikpe na nwoke a (Abba Kyari) nọ n'ihu ya gbagbuo mmadụ olemole, nke mere ya ji were ụjọ dee ihe ọbụla ọ gwara ya ka o dee."
"Ruo taa, ndị uweojii elebeghị anya n'ebubo ahụ Evans boro Kyari."
"Mana ọ bụzi ndị Amerịka na ndị Dubai bịara nyochapụta wee kwuo sị lekwa onye nwoke a bụ Aba Kyari bụ n'ezie."
"Nke a pụtara na e kwesịrị inyocha ihe niile Abba Kyari mere oge ọ nọ n'ọrụ uweojii, ma ndị niile ọ nwụchiri tinye n'ụlọ mkpọrọ."
"Etu Abba Kyari si tinye aka n'ibu ọgwụike cocaine" - ndị NDLEA

Ebe foto si, Abba Kyari/Instagram
Ngalaba na-ebuagha megide ọgwụike bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) sị na ha na-achọ onye bụbu osote kọmishọna Uweojii bụ Abba Kyari maka ebubo na aka ya dị n'ịtụ mgbere ọgwụike.
Ọnụ na-ekwuru ha bụ Femi Babafemi gwara ndị ntaakụkọ nke a n'Abuja n'ụbọchị Mọnde, abalị iri na anọ nke ọnwa Febrụwarị 2022.
Ha sị na ọ bụ maka na nwamadị a ekweghi aza ha oku mgbe a kpọrọ ya mere ha ji gbaa ya n'anwụ.
N'akwụkwọ ozi ndị NDLEA wepụtara n'ụbọchị Mọnde, ha kwuru ọ dị mwute na ụfọdụ ndị ọrụ ha bụ inye aka gbochie mpụ na Naịjirịa, bụ ndị ji aka ha na-akwado ka mpụ na-arị elu.
"Taa, anyị na-akpọpụta otu n'ime ndị ọrụ nchekwa ahụ, bụ DCP Abba Kyari, dịka onye a na-achọ achọ," Babafemi depụtara.
"Dịka nchọpụta anyị mere si gosi, NDLEA kwenyere na Kyari so n'otu na-esi mba Brazil na Ethiopia na-ebubata ọgwụ ike cocaine na Naịjirịa, nke a mere o ji dị mkpa na ọ ga-aza ụfọdụ ajụjụ bụ ndị pụtara dịka anyị na-eme nnyocha."
Ebubo NDLEA boro Kyari kpọmkwem

Ebe foto si, Abba Kyari
Ndị NDLEA kwuru na nnyocha ha malitere n'ụbọchị 21 nke ọnwa Jenụwarị 2022, oge Kyari kpọrọ otu onye NDLEA ma gwa ya ka ha nwee nzukọ.
"Na nzukọ ahụ, Kyari kwuru na ndị otu ya nwuchiri ndị na-ebu ọgwụ ike bụ ndị bu 'cocaine' ruru kilogram 25 si mba Ethiopia bata n'ọdọụgbọelu Enugwu."
"Mana Kyari chọrọ ka ya na ndị otu ya were ụfọdụ n'ime ọgwụike ahụ, ree ya, ma kee ego ya ha na ndị ọrụ NDLEA."
"Onyeọrụ NDLEA ahụ gwara ndị isi ya maka ihe a Kyari kwuru, ha wee nye ya ikike ka o kweta n'ihe Kyari na-ekwu."
Babafemi kwuru na ha ma ụma mee ka ha kwetara ihe Kyari kwuru iji mata kpọmkwem ihe o bu n'uche.
Ha kọwara na Abba Kyari na ndị otu ya mechara wetara ndịọrụ NDLEA ego dị $61,000, bụ ego ha kwuru na ha retara n'ọgwụike ahụ nke ha bupụru.
Oge NDLEA mechara gwa Kyari na ihe a bụ ọnya ka ha kweere ya, ha kpọrọ ya ka ọ bịa n'ụlọọrụ ha maka nnyocha, mana ọ bịaghị.
"N'ụbọchị Tọzde, abalị iri nke Febrụwarị afọ 20222, anyị kpọrọ Abba Kyari oku ka ọ bịa zaa ụfọdụ ajụjụ, mana ruo ugbua, ọ zabeghị oku anyị kpọrọ ya," ndị NDLEA kwuru.
"N'ihi nke a onweghị ihe ọzọ anyị nwere ike ime na-abụghị ịkpọpụta aha ya dịka onye a na-achọ achọ."
Ndị NDLEA kwuru na ha ma na ndị otu ha sonyere na nnyocha a nọzị n'ihe ize ndụ ugbua, dịka ọtụtụ na-eyi ha egwu na a ga-egbu ha, "mana anyị ga-eme ihe niile anyị nwere ike iji chekwaa ndị otu anyị."
Okwu Abba Kyari na Hushpuppi

Ebe foto si, AbbaKyari/Hushpuppi/Instagram
Hushpuppi bụ nwaafọ Naịjirịa ezigbo aha ya bụ Ramon Abbas.
A nwụchiri ya na mba Dubai n'afọ 2019 n'ebubo na ọ bụ onye ohi ịntaneetị nke ọtụtụ na-akpọ onye 'yahoo yahoo'.
Nnyocha ndị ọrụ nchekwa FBI nke mba Amerịka mere gosiri na Hushpuppi na-ezigara Abba Kyari ego kwa mgbe kwa mgbe.
Ha chọpụtakwara na Abba Kyari na-enyere hushpuppi aka site n'ịnwuchi onye ọbụla wetara mkpesa maka ya n'aka ndị uweojii.
Abba Kyari kwuru na ebubo niile ahụ bụ asị asị, mana otu ọkaikpe na mba Amerịka zitere ozi ka a nwụchie Abba Kyari ma kpụta ya n'ụlọ ikpe.
Ka nke a na-eme, ndị uweojii Naịjirịa kwụsịrị Abba Kyari ọrụ ma malite inyocha ya maka ebubo ndị ahụ.
Ya bụ nnyocha ka na-aga n'ihu tupu ndị NDLEA ewepụtakwa ebubo nke a.












