Obi Cubana and Abba Kyari at Wedding: Ihe ụmụ ụwa na-ekwu maka foto ha sere ọhụrụ a

Ebe foto si, Abba Kyari Facebook
Foto Obi Cubana na-eme azụmahịa nakwa Abba Kyari bụ onye uweojii Naịjiria sere ọhụrụ a etinyela ọtụtụ okwu n'ọnụ ndị mmadụ.
Kyari tinyere foto ahụ na Facebook ya ma depụta na ọ gara agbamakwụkwọ Maina Alkali, nwa nwoke onyeisi ndị uweojii Naịjiria bụ Alkali Baba.
Agbamakwụkwọ ahụ mere na ụlọ eze Shehu nke Borno, Abubakar El-Kanemi na Maiduguri bụ isi obodo Maiduguri n'ụbọchị Satọde.
Gọvanọ Babagana Zulum nke steeti ahụ, nakwa Mai Mala Buni nke Yobe steeti nakwa Badaru Abubakar nke Jigawa steeti.
Ndị ọzọ biakwara ya bụ agbamakwụkwọ gụnyere onyeisi sineti bụ Ahmad Lawan, gọvano chiburu Borno bụ Kashim Shettima, minista njem ụgbọelụ bụ Hadi Sirika, onye azụmahịa ama ama bụ Aliko Dangote nakwa ndị ọzọ.
Ihe mere ndị mmadụ ji ekwu maka foto Cubana na Kyari sere?

Ebe foto si, Abba Kyari Facebook
Cheta na ngalaba Nigeria Police Service Commission kwụsịtụrụ Kyari ọrụ na July 31st 2021 maka ebubo nrụrụaka ụlọọrụ Federal Bureau of Investigation nke mba Amerịka boro ya nakwa mmekọ ya na Ramon Abass, aka Hushpuppi, a na-enyo maka mpụ na nrụrụaka.
Onyeisi uweojii Naịjiria bụ Usman Alkali Baba gwara ngalaba PSC ka ha kwụsitụ Kyari ọrụ ruo mgbe ha ga-emecha nyocha maka ebubo ngalaba Federal Bureau of Investigation nke mba Amerịka wepụtara maka Kyari.
Otu ihe kachasi mee ndị mmadụ ji akatọ Kyari bụ maka mmekọ ya na ụfọdụ ndị mmadụ ama ama dịka Obi Cubana.
Onye bụ Abba Kyari?

Ebe foto si, Abba Kyari Facebook
Abba Kyari dị afọ iri anọ na isii bụ onye Borno steeti dị na mpaghara ugwu Naịjirịa.
Ọ nwetere asambodo Geography na mahadum nke o ji nwete ọrụ dịka Assistant Superintendent ndị uweojii n'afọ 2000 dịka ọ natachara ọzụzụ na police academy dị na Wudil, Kano steeti.
Ọ bụ mgbe ọ dụgara ndị otu ya nwudere onye ori akpọrọ Ndagi a.k.a spirit a na-achọ achọ kamgbe ka Kyari bidoro wube ebe niile.
Ndagi weghara ọchịchị Numan bụ obodo kachasi n'Adamawa dị na mpaghara ugwu Naịjirịa.
N'afọ 2005, ka ọ banyere ndị uweojii Mobile Police Force ebe ọ banyere ụlọọrụ ndị uweojii Legọs n'afọ 2010.
Kyari mechara bụrụ mmadụ nke abụọ n'ụlọrụ uweojii nakwa onyeisi Special Anti-Robbery Squad (SARS), ngalaba uweojii na-ebuso mpụ agha.
Onye bụ obi Cubana?
Obi Cubana nke ezigbo aha bụ Obinna Iyiegbu, bụ onye oji ego achụ ego a na-anụ aha ya n'ihe gbasara ịgba oringo na Naịjiria, dịka ọ bụ onye nwere ọtụtụ ebe oriri na nkwari.
Obi a na-etu "Okpole Yankee" na-aza Obi Cubana n'ihi aha otu ụlọ oriri na nkwari ya bụ Cubana.
N'agbanyeghi na ọ gụrụ maka ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mahadum University of Nigeria Nsukka (UNN), ọ gwara BBC Igbo na o nweghi mmasị ịzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ugbua ma n'ọdịnihu.
Ọ bụ onye Oba, dị n'okpuru ọchịchị Idemili, n'Anambra steeti.
A mụrụ ya n'ụbọchị 12 nke ọnwa Epreelụ, 1975.
Ya na Ebere nwunye ya ji ụmụ nwoke anọ.
Akwamozu nne ya wuru ewu na soshal midia n'afọ 2021.
N'ụbọchị mbụ nke ọnwa Nọvemba afọ 2021, ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka na Naịjiria bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC), kpọtara maka ịgba ya ajụjụọnụ.










