Obi Cubana net worth: Ihe ọ sara BBC Igbo maka ọgwụike na etu o si akpata ego

Aha onyonyo, A maghị m maka egbeigwe ka ọfọdụzị inye ya ego - Obi Cubana

Na mkparịtaụka Obinna Iyiegbu a ma dịka Obi Cubana na BBC Igbo nwere n'ọnwa Ọgọstụ 2021, ọ sara ajụjụ dị iche iche gụnyere ihe gbasara akụnaụba ya.

Ọ sakwara ajụjụ gbasara ihe mere o ji gụọ klọb ya aha gbasara ọgwụike, ihe gbasara ebubo na ọ na-eji klọb ndị ahụ asa ego a kpaghị n'ụzọ ziri ezi nakwa ihe ndị ọzọ.

Ọ gwara BBC Igbo etu o si malite njem ya na etu o si kpata ego ma bụrụ ọgaranya a na-anụ aha ya ugbua.

Nke a na-abịa dịka akụkọ na-efegharị na-ekwu na ndị ụlọọrụ na-ahụ maka ọgwụike na Naịjiria bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA), nwụchiri ya n'ụbọchị Tọzde, Jenụwarị 13, 2022.

Chetakwa na ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka na Naịjiria bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC), kpọtara maka ịgba ya ajụjụọnụ n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Nọvemba afọ 2021.

Kedụ ebe Cubana malitere?

Iyiegbu sị na ọ bụ n'Abuja ka o malitere ụlọ ọrụ Cubana.

Ọ sị: "Ọ bụ Ibiza ka anyị ji malite. Ibiza bụ n'ilo ka ọ dị ruo oge ndi gọọmentị chụpụrụ anyị n'ebe ahụ ma sị na ọ bụghị ihe ekwesiri ime ebe ahụ."

Ọ sị na ha mechara gawa Pọt Hakọt tupu ha agawa Owerri.

Gbasara Egbeigwe

Obi Cubana kwuru na ya amaghịdị maka okwu banyere Kingsley Orji, bu onye na-eme ejije Nollywood e ji Egbeigwe mara, ka ọ fọdụzịa ịsị na ya ga-akwụrụ ya ụgwọ ụlọọgwụ.

Obi Cubana gwara BBC Igbo na ya amaghi onye Egbeigwe bụ.

Ọ sị: "Amaghi m onye ọ bụ. Mu na ya ezutebeghị. Ọ sịghịkwa ka m nye ya ego, enyeghịkwam ya ego."

Cheta na Egbeigwe na-ewu na soshal midia maka ego nwoke akpọrọ James Onwordi Ibori Ubulu nyere ya nde naịra ise maka ọgụgwọ ọ chọrọ ịga n'India.

Maazị Ubulu mechara werekwa ego ahụ dịka Maazị Orji na Harrissom Gwamnishu bụ onye e nyere ego ahu nwere nghọtaghe.

Ka nke a mere, ọ malitere wuwe na soshal midia na Maazị Iyiegbu abatala dịka onye enyemaka ọhụrụ.

Ọ bụ na mkparịtaụka ya na BBC Igbo ka Maazị Iyiegbu kwuru maka okwu Egbeigwe.

O kwukwara ọtụtụ okwu maka ndụ ya nakwa etu o si jiri ego achụ ego.

Ọ sị na ihe mere ya ji akpọ ụlọ ọrụ ya aha dị ka Opium, Pablo, Montana na ndị ọzọ bụ maka na ọ bụ ebe a na-ezu ike n'abalị.

"Ọbụghị ụlọụka. Ọ ka anyị kpọọ ha club Augustine dị asọ, ọ bụ ụka?"

"ka anyị a ga-akpọ ya Obinna Club?"

Obi Cubana si na-ebe ndị bụ ebe ndị mmadụ na-enwe aṅụrị.

Ego ole ka e fere ya n'akwamozu

Maazị Iyiegbu si na agaghị ekwunwu ego ole e fere ya n'akwamozu nne ya mana ihe ọ ma bụ na ọtụtụ n'ime ya laghachiri iji nyere ndị mmadụ aka ozugbo ozugbo.

Kedụ kwanụ maka ehi ahụ niile?

Iyiegbu sị na ya amaghị ehi ole akpụnyere ya n'eziokwu mana "ha dị ọtụtụ".

Ọ sị na egburu ọtụtụ n'ime ha, kenye ndị ụmụnna ụfọdụ - ekenyere ruo ibe nne. E nyekwere ndị eze niile nọ ebe ahụ ji ehi laa.

Ọsịkwa na ihe ụfọdụ ka dị na ụlo ya.

"Ehi ka na-abịakwa. Ka m gara Ebonyi ụbọchị ole ma ole gara aga e nyere m ehi 13."

Ihe mere eji akpọ ya "Okpole Yankee"

Iyiegbu kọwara ihe mere e ji akpọ ya "Okpole Yankee". Ọ sị na a na-etu onye tọrọ ya "Yankee" n'oge ha na-agu akwụkwọ, emechara kpọwa ya aha ahụ ka nwanne ya gụchara.

"A kpọrọ m Yankee ruo oge ndị mmadụ tinyere ya Okpole. Ụfọdụ na-akpọ m Okpole ebe ndị ọzọ na-akpọ m Okpole Yankee."

Ụmụ ya a ga-eso nzọmụkwụ ya?

Maazị Iyiegbu kwuru na ya ga-akwado ụmụ ya n'ihe ọbụla ha chọrọ ime.

Ọ sị: "Otu n'ime nwa m dị afọ anọ sị na chọrọ ị na-ese ihe. Aga m akwado ya. Ụmụ Davido na Wizkid na-agụ egwu. Anyi anụla na e nwere ihe esre ese a na-ere nde kwuru nde dọla. Mmadụ ole n'ime anyị nwere nde kwuru nde dọla? Mana onye na-ese ihe nwereike nwete ya site n'otu o sere."