Ụlọikpe ajụla arịrịọ ịhapụ Abba Kyari nwa mgbe nta

Abba Kyari

Ebe foto si, Abba Kyari Facebook

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ajụla arịrịọ ndị ọkaiwu Abba Kyari bụbu osote Kọmishọna uweojii na-arịọ ka a gbapụta ya nwa mgbe nta.

Ọkaikpe Inyang Ekwo nke Federal High Court dị n'Abuja kwuru n'ụbọchị Mọnde, Febrụwarị 28, 2022, na ha agaghị enye ya ohere ka ọ kwụọ ụgwọ nwere onwe ya nwa mgbe nta (bail), n'ihi na ụlọikpe ọzọ - nke Ọkaikpe Zainab Abubakar nọ n'isi ya - enyela National Drug Law Enforcement Agency's (NDLEA) ikike imecha nnyocha ha na-eme n'isi Kyari n'ime abalị 14 ọzọ na-abịanụ.

Ọkaikpe Ekwo kwuru na ụlọikpe ahụ kpenyeere NDLEA n'ụbọchị 22 nke ọnwa Febrụwarị, bụ ụlọikpe nwere ikike ikpekwa ikpe ahụ.

O kwuru na ọ ga-ekpekwa ikpe ahụ mgbe ụbọchị 14 ụlọikpe nyere gachara.

O yigharịrị ụbọchị ikpe ahụ buga ya ụbọchị 15 nke Maachị, iji kpee ya bụ ikpe maka ikike ruru Kyari dịka mmadụ.

Cheta na Kyari bụ onye a nwụchiri maka ebubo ibu ọgwụ ike, tinyere akwụkwọ n'ụlọikpe n'izu gara aga ebe o kwuru ka gọọmentị etiti Naịjiria kwụọ ya nde narị naịra ise (N500m) ma rịọkwaa ya mgbaghara n'akwụkwọ ntaakụkọ abụọ maka imegide ikike ruru ya dịka mmadụ.

Kyari gbara akwụkwọ a site n'aka ọkaiwu ya bụ Cynthia Ikena, n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja, ma kwuo na ahụ esighi ya ike ịnọ na mkpọrọ, rịọ biko ka a hapụtu ya nwa mgbe nta ka o nwee ike ilekọta ahụike ya.

Ọ gwara ụlọikpe na ọ na-arịa "ọrịa shuga, ọbara mgbali elu na ezigbo ọrịa obi nwere ike ibutere ya ọnwụ."

Aha onyonyo, ‘Ebubo ndị uweojii na-ebo ndị otu anyị maka ibu ọgwụike adabaghị’ – Femi Babafemi, NDLEA

Guillame Soro nke Ivory Coast agọrọla isi ya n'okwu ngwaagha a hụrụ n'ụlọ ya

Guillame Soro

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Guillame Soro bi na mba France ugbua

Guillaume Soro bụbu onyeisi ụlọomeiwu mba Ivory Coast agọọla agọ na ahụghị ngwaagha ọbụla n'ụlọ ya na Bouake, n'isiobodo Abidjan.

Toure Moussa na-ekwuru ya sị na o bibeghi ebe ahụ kemgbe ọtụtụ afọ, dịka ọ gbagara Europe n'afọ 2019.

Nchọpụta a na-abịa ka a chọtachara ọtụtụ ngwaagha n'ụlọ Souleymane Kamarate Kone, bụbu onye isi nhazi ya n'afọ 2017.

Ndị otu Soro kwuru na akụkọ a so na nkata a na-akpa iji dughie ndị mba Ivory coast.

Cheta na a tụrụ Soro nga mkpụrụ ọka n'azụ ya (nke a kpọrọ 'in absentia') n'ọnwa Juun afọ 2021, ka e boro ya ebubo ịkpa nkata nnapụ Onyeisiala Alassane Ouattara ọchịchị n'ike.