Ipob bans cow meat: Otu ndị na-ere ehi Awụsa amachiela ibudata ehi n'Ọwụwa Anyanwụ

Ndị ọchịehi na ndị Ipob

Ebe foto si, Getty Image/BBC

Dịka otu Ipob machiri iri anụ ehi Awusa n'Ọwụwa Anyanwụ, otu jikọrọ ndị na-ebudata anụ na nri n'Ọdịda Anyanwụ a kpọrọ 'Amalgamated Union of Foodstuff and Cattle Dealers of Nigeria' ekwuola na ha ga-agbaso mkpebi Ipob site n'ịkwụsị ibudata ahịa na mpaghara ala Igbo.

Na nkata onyeisi otu ahụ bụ Comrade Mohammad Tahir, na BBC kpara, o kwuru na "anyị chọrọ otu Naijria, otu ndị mmadụ, mana ọ dị ka ha achọghị nke ahụ."

"Ihe a na-ekwu bụ nri ka a na-ebugara ha, ọ bụghị nsi.

"Onye ị na-ebugara nri sị na ọ chọghịzi nri gị, ị ga-asị na ọ bụrụgodị na ọ na-egbu gị egbu na ị ga-ebugara ya ya?"

Cow

Ebe foto si, Getty Images

O kwuru na ike egbe ọnụ ndị otu a agwụla ha ike.

Cheta na ụbọchị Monde, otu Ipob kwuru na ha amachiela iri anụ ehi Awụsa nakwa ife ọkọlọtọ Naijiria na mmemme nakwa n'ụlọakwụkwọ n'Ọwụwa Anyanwụ.

Ihe ndị a so n'iwu asaa Ipob kwuru na ha ga-amalite itinye n'iwu n'afọ 2022.

'Agụla 'National Anthem,' 'erila anụ ehi Awụsa' na iwu atọ ndị ọzọ Ipob tirila n'Ọwụwa Anyanwụ

Okporoụzọ chakoo/ehi/ụmụakwụkwọ

Ebe foto si, BBC/ Getty Images

Otu Indigenous People of Biafra (Ipob) ekwuola na ha na-amachi ịbụ abụ ọdịnala Naịjiria n'ụlọakwụkwọ niile dị n'Ọwụwa anyanwụ.

"Director of State" ha bụ Chika Edozie kwuputere nke a n'ozi afọ ọhụrụ otu Ipob n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Jenụwarị.

Ọ gụpụtakwara ọtụtụ iwu Ipob tiri maka Ọwụwa anyanwụ dịka a batara afọ ọhụrụ 2022.

Mana akụkọ a ga-eleba anya n'iwu ise otu Ipob tigoro maka Ọwụwa anyanwụ bido n'afọ 2021.

1. Iwu ka a kwụsị igụ abụ ala Naịjirịa.

Ụmụakwụkwọ

Mmachi a pụtara ihe n'ozi afọ ọhụrụ Director of State Ipob bụ Chika Edozie kwuputara.

Ipob kwuru na ọ bụzị abụ ala nke "Biafra nation" ka ndị isi ụlọakwụkwọ nọ na mpaghara Ọwụwa anyanwụ ga na-akụziri ụmụakwụkwọ nọ ebe ahụ bido n'ụbọchị atọ nke ọnwa Jenụwarị 2022 gawazie.

2. Mmachi nchịgharị ehi ndị Fulani na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ

Cow

Ebe foto si, Getty Images

Ipob tiri iwu na site n'ọnwa Epreelụ 2022, ha achọghịzị ka e jiri ehi ndị Fulani na-eme emume ọbụla n'ala Igbo.

Ha kwuru ka e jiri ehi Igbo na-emezi mmemme makana ha "achọghị abụmọnụ na mmetọ iri ehi Fulani ga-ebutere ala Igbo".

3. Atụmatụ sit-at-home

Owerri
Nkọwa foto, Ụzọ Owere-Okigwe na-ekwokarị ekwo tọgbọ chakoo n'ụtụtụ Mọnde

N'ọnwa Ọgọst 2021 ka Ipob hibere atụmatụ "sit-at-home" n'ụbọchị Mọnde ọbụla ma mechaa kagbuo ya.

Ha kwuru na ọ bụzi ụbọchị Nnamdi Kanu na-apụta ụlọikpe ka a ga na-emezi ya bụ nọrọ n'ụlọ.

Atụmatụ a metụtara ụmụakwụkwọ na-ele ule West African Examination Council (WAEC ) tụmadị mgbakọ "Maths" nke afọ 2021, dịka o mere ka ha ghara ile ule ahụ bụ nke e tinyere ụbọchị Mọnde.

Nke a metụtakwara akụnaụba mpaghara Ọwụwa anyanwụ dịka ndị mmadụ kwuru na atụfuru nnukwu ego na Mọnde ndị ahụ e mere 'sit-at-home'.

Ugbua, ọ bụ eziokwu na a kagbuola ya bụ nọrọ n'ụlọ, mana ụfọdụ ndị omekome ka na-eji ya akpa mkpamkpa n'ala Igbo.

4. Iwu ka ndị mmadụ ghara isonye na ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti

Nnyocha ntuliaka

Ebe foto si, Getty Images

N'afọ 2021, Ipob kwuru na agaghị eme ntuliaka ọkwa gọvanọ n'Anambra steeti, dịka ha sị onye apụtakwala ezi ụbọchị ahụ.

Mana ha mechara kagbuo ya n'abalị fotere ụbọchị Novemba 6, 2021, bụ ụbọchị e mere ya bụ ntuliaka.

Nke a abụghị mbụ ha na-eti ụdịrị iwu a, dịka ha gwara ndị ntoroọbịa nọ n'ala Igbo ka ha ghara ịpụta tụọ vootu n'afọ 2019.

Ha mechara wepụ iwu ahụ ka ụbọchị a ga-atụ vootu rutewere nso.

5. Iwu ka akwụsị ife kọlọtọ Naịjiria na mpaghara wụwa Anyanwụ

N'ụbọchị Sepụtemba 25, 2021 ka Ipob wepụtara iwu ka ewetuo ọkọlọtọ Naịjirịa n'ebe niile ọ dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ.

"Bido bụ ụbọchị Seputemba 25,2021, Ipob na-enye iwu ka ewetuo ọkọlọtọ Naịjiria ebe niile ọ dị na mpaghara ọwụwa anayanwụ. ọchịchị Ipob ga-agwa ndị ụlọakụ kpọkwem ihe mere ha ga-eji were udo wetuo ọkọlọtọ ahụ." dịka Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru otu ahụ si depụta.

Ha gakwara n'ihu nye iwu ja ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ ụbọchị nwereonwe Naịjiria bụ October 1, 2021 iji wee jụụ Naịjirịa.

Ihe ndị gọọmenti nọ n'wụwa Anyanwu kwuru maka iwu ndị a

Don Adinuba bụ onye mgbasaozi Anambra steeti kwuru na onweghị ihe gọọmenti Anambra ga-asa maka mmachị igụ abụ ala Naịjirịa n'ụlọ akwụkwọ.

Onye mgbasaozi Imo steeti bụ Nwachukwu Oguike azabeghị ozi BBC Igbo zigara ya n'ekwenti ya.

Gọọmenti Abia steeti azabeghị ozi ezigara onye mgbasaozi steeti ahụ n'ekwenti. Anyị ga-agbalị inweta ọnụ okwu ha gbasara iwu ndị a.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị