Fr Ejike Mbaka: Buhari, chee aka ghọrọ mkposa Naijiria ma i nyefe onye Ugwu ọchịchị na 2023

Fada Ejike Mbaka na Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Amen/Bashir Ahmad

    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

Ụkọchukwu Katọlik a ma ama na onye ndu 'Adoration Ministry', Enugwu bụ Fada Ejike Mbaka adụọla onyeisiala Muhammadu Buhari ọdụ ka ọgba mbọ nyefee onye Ndịda-Anyanwụ ọkwa ọchịchị na ntuliaka na-abịa n'afọ 2023.

Mbaka kwuru n'ozi o ziri ndị na-eso ya nọgbakọ ekpere o nwere ụbọchị Wenezde na a ọ bụrụ na Buhari gbaa isi akwara nyefee ọchịchị n'aka onye Ugwu, na Najiria ga-ekewaa.

Mbaka, onye boro ebubo na ndị DSS bịara na nzuzo ige ozi ọ ga-ezi n'abalị Disemba 31nke mere ya ya tinye uche na naanị ekpere sị: "Nke a bụ ozi nke afọ ọhụrụ: Buhari ọ kaara gị mma ihazi ihe ọfụma nyefee otu onye si Ndịda ọchịchị."

"Ọ bụrụ na ndị Ugwu chọọ iweghara ọchịchị, ala a ga-ekposa. "

"E nwere ike agaghị enwekwa Naijiria ọzọ."

"E nwere ike agaghị enwekwa Naijiria ọzọ, ma ọ bụrụ na Buhari ejiri ụzọ abụghị ụzọ nyefee ọchịchị n'aka ndị Ugwu. "

Mbaka gara n'ihu kwuo na etu nke a ga-esi mee ga-atụ ndị mmadụ n'anya.

"Etu ọ ga-esi mee, o nweghị onye ga-eche na ụdị ihe dị egwu dị otu ahụ ga-emenwu."

"Naijiria ga-anọ n'ụdị ọnọdụ, ịga n'ihu agaghị ekwe omume, ịla azụ abụrụ nrọ."

2022 prophecies: Naijiria ga-ekposa ma ihe mee Nnamdi Kanu na nga DSS - Mbaka

Fada Ejike Mbaka akatọla ọchịchị Buhari

Ụkọchukwu Katọlik a ma ama bụ Fada Ejike Mbaka adọọla aka na ntị ka mmiri ghara ịba onyendu otu Ipob ntị dịka ọ nọ n'ogige ndị uweojii Nzuzo Naijiria Bekee kpọrọ DSS.

Nnamdi Kanu nọ na mkpọrọ DSS kemgbe ọnwa June afọ 2021 b oge a nwuchiri ya na mba Kenya ma kpọlata ya Naijiria bú ebe a kpúúrú ya úlọikpe maka ebubo iyi ndú egwu.

N'oziọma o wepụtara na nsonso a n'ọgbakọ "Adoration", n'Enugwu, Mbaka kwuru na a chọọ Nnamdi Kanu ahụghị na Naijiria ga-ekposa.

"Ọ ka mma na ha kpachapụrụ anya n'etu ha si eso okwu Nnamdi Kanu. O nwee ihe mere nwata nwoke ahụ n'aka ha, Naijiria ga-adakpọ."

Mbaka, onye kwuru na ndị DSS bịara na nzuzo ige ozi ọ ga-ezi n'abalị 31 Disemba 2021, kwuru na ya maara kpee naanị ekpere n'abalị ahụ.

Cheta na dịka ndị mmadụ gụnyere ndị ntaakụkọ gara ụka abalị foro afọ ọhụrụ, ịnụta ozi ọ ga-ewepụta maka afọ 2022, Mbaka ji abalị ahụ duo ndị na-eso ya n'ekpere ka Chineke meere Kanu ebere.

O kpekwara maka ọdịmma ndị na-eso ya na ezinaụlọ ha n'afọ ọhụrụ.

Mana n'ozi ya ụbọchị Wenezde, Mbaka buru amụma maka Kanu nakwa Naijiria.

O ji okwu Kanu tụnyere ọnọdụ ọchịchị Naijiria ma kwuo na ọ bụrụ na Buhari enyefeghị onye si ọdịda Anyanwụ ọchịchị na 2023, na Naijiria ga-ekposa.

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Femi Adesina

Nkọwa foto, Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na nsonso a na agaghị atọhapụ Nnamdi Kanu , kama ụlọikpe ga-ekpe ya ikpe maka ebubo ndị e boro ya

"Andy Uba agaghị abụlata gọvanọ Anambara nke ndị APC na-abụ ya" na ihe ndị ọzọ a 'hụrụ' maka Anambara, Ebonyi, Nnamdi Kanu n'afọ 2022

Fada Ejike Mbaka, Primate Elijah Ayodele, Enoch Ayodele, Ikechukwu Samuel

Ebe foto si, AMEN,INRI,RCCG,Shiloh

Ụmụ Naijiria bụ dị na ebu ụka na ihe gbasara okpukperechi n'isi nke bụ na ha anaghị eji okwu na amụma ndị ụkọchukwu ha na ndị isi ụka ha egwu egwu.

Kwa afọ mbido afọ ọbula, ndị amụma na ndị ụkọchukwu na-ekwupụta ihe ha sị Chineke gwara ha ga-eme na Naijiria, n'ụwa nakwa na ndụ ndị welitere isi.

Lee ụfọdụ ndị ha kwuru na ọ ga-eme n'afọ 2022:

Prophet Ikechukwu Samuel

Prophet Ikechukwu Samuel

Ebe foto si, Shiloh Word Chapel

Onye Amụma Ikechukwu Samuel nke ụlọụka Shiloh Word dị n'aAbuja burru amụma na ụfọdụ ihe ọnụ ga-emere ha m, ebe ụfọdụ ihe uru ụjụ.

Iji maa atụ, o kwuru na nri ga-emere ndị ọrụugbo ọfụma n'afọ 2022 n'ihi ezigbo mmiri ozuzo nke ga-erute Ugwu Naijiria.

O kwuru na ndị gọvanọ ụfọdụ kwesịrị ịbanye na ekpere "ka a ghara isi n'ụlọikpe chutuo ha n'ọchịchị."

Ọ kwukwara na "n'afọ 2022, ikpe Chukwu ga-abịakwasị ndị kpọrọ onwe ha ụkọchukwu mana ha nwere ajọ okwu arụsị ha nwere na nzuzo ma ọ bụrụ na ha echegharịghị."

Samuel bukwara amụma na ike ọchịchị ga-agba otu onyeisi ụka ọgbara ọhụrụ kara aka mgba n'ụzọ pụrụ iche, ma rịọ ka ndịmmadụ gbuhie ya n'ọbara Jisọs Kraistị.

O kwukwara na "akụkọ ntụmadị ga-esi ndị ndu mba Briten nakwa n'ezinaụlọ Eze ha gbakapụta n'afọ 2022".

O kwukwara ka e kpee ekpere megide ọdachi ụgbọelu ọkachasị na mba ndị dị n'Asia.

Enoch Adeboye

EA Adeboye

Ebe foto si, PAstor EA Adeboye

Onyeisi ụlọụka ukwu a kpọrọ Redeem bụ Enoch Adeboye ewepụtala amụmụ ndị ọ na-ebu maka afọ ọhụrụ 2022.

Ọ sị na ihe karịrị pasentị iri na asatọ ọrụ (project) niile ebidoro n'afọ 2022 ga-abịa na mmezu.

O kwukwara na ndị amabughi ama ga-amalite ma bawanye n'afọ a.

O kwuru na amụma mmiri abụọ ga-asi n'osimiri Pacific na osmiri Atlantic pụta ga-emebi ihe maọbụụ na akwụsịghị ya n'oge.

Ejike Mbaka

Fada Ejike Mbaka akatọla ọchịchị Buhari

N'ozi n'abalị banyere afọ ọhụrụ (2022), Ụkọchukwu Katolik a ma ama bụ Fada Ejike Mbaka nke Adoration Ministry.

Enugwu kpọrọ ndị otu ya oku ha welite ọkụ mpanaka ha elu ma kpee ekpere maka ọdịmma Nnamdi Kanu nakwa ndị nwụọrọla na mbọ nnwereonwe Biafra.

Ọ sịrị, "Anyị na-eweli mpanaka ndị a maka ụmụokorobia na ụmụagbọghọ anyị ndị nwụọrọla na mbọ nwereonwe Biafra."

"Anyị na-ewelitekwa ya elu maka ọdịmma nwanne anyị nwoke bụ Nnamdi Kanu, na ọ ga-adịlị ya mma ebe ọbụla ọ nọ."

"Anyị na-arịọ Chukwu ka o gosi ya ebere."

Mbaka kwuru na ebe ọ bụ na ụka Catholik na-ekpe ekpere maka Naijiria nọ na oke nsogbu, "O nweghị onye ga-akwụsị anyị ikpere Nnamdi Kanu nọ na nsogbu ekpere."

O kwukwara na ọ bụ ihe mmụọ nsọ gwara ya kwuo ka ọ na-ekwu.

O sị na ọ hụrụ Nnmadi Kanu dịka nwa ya ma kwuo na ọ gaghị abụ ya ọnụ ma ncha.

"Onye ọbụla chọrọ ịbụ ya ọnụ nwereike ịbụ ya ọnụ" ka o kwuru n'ụka ngafe ọ kara n'Enugwu n'abalị/ụzụ ụtụtụ nke ụbọchị mbụ na 2022.

David Oyedepo

Bishop David Oyedepo

Ebe foto si, Bishop David Oyedepo

David Oyedepo bụ onyeisi ụlọụka ukwu ọzọ bụ Living Faith Tabernacle ebuola amụmụ nke ya maka afọ 2022.

Amụma ndị o buru metụtara ndị nso ụlọụka ya dịka o sị ha na o nweghi onye ga-eleda ha anya n'afọ a.

"Ihe ndị buburu gị ọgbatuhie ga-apụrụ gị n'ụzọ n'afọ a. Agaghị a nụ ụzụ akwa n'ezinaụlọ gị n'afọ a!"

Primate Elijah Ayodele

Primate Elijah Ayodele

Ebe foto si, Primate Elijah Ayodele Facebook

Primate Elijah Ayodele nke ụka 'INRI Evangelical Spiritual Church' bụ ụkọchukwu a ma ama.

O kwuru n'amụma ọ mara n'ọnwa Disemba afọ 2021 maka 2022 na "Naijria ga-etozu iso zọọ asọmpi AFCON mana ha agaghị ebu iko ahụ".

Chineke gosiri m na Buhari ga-achịcha oge ya na-agbanyeghị na ọ ga-enwe nsogbu elu na ala."

Maka Ebonyi steeti, o kwuru na "Pati anọghị na gọọmenti ga-eweghara ọchịchị ma ọ bụrụ na e meghị wuruwuru na ntuliaka."

N'ọkwu Anambra steeti, Ayodele sịrị, "Andy Uba agaghị abụlata gọvanọ Anambara nke ndị APC na-abụ ya. A ga-edu Charles Soludo iyi ọrụ dịka Gọvanọ."

Ayodele kwuru na otu onye oziọma TV a na-anụ aha ya n'ụwa ga anwụ n'afọ 2022 ma kwukwa na "Mmụọ Chineke ga-agba n'anwụ arụrụala ụfọdụ ndị pastọ na-arụ."

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: