Nnwụchi Nnamdi Kanu, Chiwetalụ Agụ, akwamozu nne Obi Cubana, 'ntọọrọ Fada Mbaka' na akụkọ ndị ọzọ kpọtụrụ akpọtụ n'afọ 2021

Ejike Mbaka, Nnamdi Kanu, Obi Cubana

Ebe foto si, AMEN/Facebook/NGR Government/ObiCubana/Instagram

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Afọ 2021 bụ afọ ndị mmadụ atụghị anya maka ụdịrị akụkọ si na ya apụta.

Ọ bịara dịka ụwa niile ka ji nwayọ apụta n'ahụhụ nke mgbachi obodo maka ọrịa coronavirus butere dịka o kezuru ụwa niile.

Lee akụkọ ndị kacha ibe ha wu n'afọ a, ọ kachasị ka o si metụta ndị Igbo.

Akụkọ na 'atọọrọ' Fada Mbaka

N'ụbọchị 5 nke ọnwa Mee afọ 2021, akụkọ pụtara na-ewu na a tọrọla Fada Mbaka nke mere na ndị mmadụ malitere ịchọ ya.

BBC Igbo gara n'ụlọụka ya ịmata ihe na-eme were sete onyonyo ebe ndị mmadụ malitere imebisi ihe maka na ha cheere na Bishopu jichiri Mbaka.

Akụkọ wuru ewu na 2021

Ebe foto si, Psquare/bbc/NGR Presidency/charles soludo

Ha sị na ọ bụ n'abalị ka Bishopu kpọrọ ya oku ma kwuo na kemgbe ahụ ọ kwụsịrị ịza ekwentị ya.

Fada Mbaka mechara pụta kọwaa ihe mere ma rịọ mgbaghara maka etu ndị nso ya si mebisie ihe n'ụlọụka nke gụnyere sacrament nsọ.

Mmebọ gọọmentị etiti mebọrọ Fr. Mbaka

Ụkọchukwu Ejike Mbaka

Ebe foto si, Adoration Ministry/ Getty Images

Ọzọkwa gbasara okwu Fada Mbaka, bụ mgbe ụlọorụ onyeisiala gbara Fada Mbaka n'anwụ ma kwuo na iwe ya ebe Buhari nọ bụ n'ihi ọrụ ngo ọ chọrọ n'aka ha enyeghi ya.

Ọ bụ ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Garba Shehu kwuru nke a dịka ọ na-azaghachi Mbaka okwu o kwuru sị onyeisiala ritue n'ọkwa maka ọnọdụ nchekwa n'ala Naịjirịa niile.

Ọ bụ mgbe nke a mechara ka ndị ụka Katọlik kpọrọ Mbaka oku, nke ndị mmadụ jiri chee na atọrọla ya.

Nnwuchi Nnamdi Kanu

Akụkọ kachasị wu ewu na Naịjirịa bụ mgbe gọọmentị etiti Naịjirịa kwuputara na ha anwụchiela Nnamdi Kanu.

Ha nwụchiri nwuchiri onyeisi otu Ipob na abalị 29 nke ọnwa Juun na mba Kenya ka ha ahụ ma dulata ya Naịjirịa.

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Nigeria Presidency-Facebook

Akwamozu nne Obi Cubana

Obi Cubana Oba Anambra: Cubana Chief Priest oga mama burial fotos

Ebe foto si, Cubana/Instagram

Nkọwa foto, Cubana Chief Priest, Obi Cubana

Ọnwa Julai kpọtụrụ akpọtụ dịka Obinna Iyiegbu a ma dịka Obi Cubana liri nne ya.

Akwamozu ahụ malitere wube tupu e mee emume dị na ya dịka Cubana Chief Priest gosiri ebe ezitere ehi karịrị narị abụọ a ga-eji kwa ozu ahụ.

O bụ otu akụkọ tinyere obodo 'Oba', Anambra steeti na mapụ ụwa niile dịka ọtụtụ ndị a ma ama gbagara ebe ahụ gosi ihu.

Ịmanye na mbido 'Sit at home'

Mpaghara ebe a nọrọ gbaa ụgbọala ahụ bu ngwa nri ọkụ n'ụbọchị Mọnde, Sepụtemba 27
Nkọwa foto, Mpaghara ebe a nọrọ gbaa ụgbọala ahụ bu ngwa nri ọkụ n'ụbọchị Mọnde, Sepụtemba 27

Ọ bụ dịka ndị Ipob na-ewe iwe maka nwuchi Nnamdi Kanu ka ha ji manye atụmatụ sit at home kwa ụbọchị Monde.

Nke a bidoro n'ụbọchị Monde mbụ n'ọnwa Ọgọst bụ 9 dịka ebe niile n'ọwụwa anyanwụ kpọchiri akpọchị ọfụma.

Nnwụchi Chiwetalu Agu

Chiwetalu Agu
Nkọwa foto, Chiwetalu Agu na ndị agha Naịjirịa

Akụkọ pụtara na anwụchiri Chiwetalu Agu n'ahịa Ọnịcha n'ehihie n'ihu mmadụ niile n'ọnwa Oktoba.

Ndị agha mechara kọwaa na ọ bụ maka na Chiwetalu na-akwado ndị otu Ipob ka ha ji nwuchie ya.

Ha si n'Enugwu ebe eji ya bụrụ ya gawa n'ụlọọrụ ndị uweojii pụrụiche bụ DSS n'Abuja.

Emechara tọghapụkwa ya.

Ntuliaka ọkwa Gọvanọ Anambra

Ọkammụta Chukwuma Charles Soludo emeriela ntuliaka Anambra dịka Gọvanọ

Ebe foto si, Soludo/Facebook

Nkọwa foto, Ọkammụta Chukwuma Charles Soludo emeriela ntuliaka Anambra dịka Gọvanọ

N'agbanyeghị ụjọ mwakpo na-akpọtụ n'ọnwa Novemba, ntụliaka ọkwa gọvanọ ehibere n'ọnwa ahụ bịara na mmezu

Ndị mmadụ cheere na a ga-eyigharịya maka ọnọdụ nchekwa n'ebe ahụ dịka a na-awakpo ma na-egbu ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ.

Nke a bịara n'ihi na otu Ipob foro ntutu taa na agaghị enwe ntuliaka ọbụla n'ala Igbo maọbụrụ na atọghapụghị Nnamadi Kanu.

Ha mechara kwuo na o nweghi mgbe ha ji sị ndị mmadụ apụtala tụọ vootu.

Ọnwụ Chike Akunyili

Akamozu Akunyili
Nkọwa foto, Dkt Chike Akunyili bụ Dọkịta Oyibo na-enyere ndị ogbenye aka mara

P-square ịbịaghachi

Paul na Peter

Ebe foto si, Psquare/Instagram

O teela aka ndị mmaọ̄ụ na-arụ anya na otiegwu abụọ a ma ama bụ Paul na Peter Okoye ga-abịaghachi ọzọ dịka ha sere okwu.

Olileanya ndị mmadụ bịara na mmezu n'ọnwa Ọktoba dịka nwanne abụọ ahụ kwekwara ijikọ aka tiputewe egwu ka ọ dị na mbụ.

Amaghị ụbọchị o mere kpọm kwem mana ihe onyonyo gisiri ebe ha na-amakụ onwe ha malitere ifesa n'ụbọchị.