Osinachi Nwachukwu's Twin Sister: A nọ m n'anyammiri ụbọchị Osinachi na di ya gbara akwụkwọ - Ejima Osinachi Nwachukwu
Dịka ụwa niile ka na-eru uju Osinachi Nwachukwu, bụ onye a ma ama na-eti egwu ụka, ejima ya bụ Amarachi Eze agwala BBC Igbo na ihe niile a ka dị ya ka na nrọ.
O kwuru na ya ekwetabeghị na nwanne ya nwaanyị anwụọla n'ezie, mana ihe niile dị Chukwu n'aka.
Amarachi kwuru na Peter Nwachukwu bụ di Osinachi kpasoro ya ezinụlọ ha nnukwu agwa ọjọọ oge nwanne ha nwaanyị dị ndụ.
"Ihe mbụ Peter Nwachukwu mere gbawara m obi bụ oge ya na Osinachi na-agba akwụkwọ."
"Ebu m Osinachi ụzọ lụọ di, ọ bụ ya kpooro m akwa n'ụbọchị agbamakwụkwọ m, o kwere m nkwa na ọ bụ m ga-ekporo ya akwa n'ụbọchị nke ya."
"Mana di ya bụ Peter Nwachukwu fooro ntutu ya taa sị na nke ahụ agaghị eme."
"N'ụbọchị agbamakwụkwọ Osinachi, ọ bụ onye ọzọ kpooro ya akwa, mụnwa anọrọ n'akụkụ na-ebe sọ akwa."
BBC agbalịala ugboro ugboro ịnụ n'ọnụ Peter Nwachukwu mana ọ mịtabeghị mkpụrụ.
Anyị kpọrọ ekwentị ya mana ọ zaghị, anyị zigakwaara ya ozi ekwentị, mana ọ zaghachighi n'agbanyeghị na o gosiri na a gụọla ozi ahụ.
Amarachi kọkwara ọtụtụ ihe ọjọọ o kwuru na Peter Nwachukwu mere ya onwe ya.
O kwukwara na ọ naghị ekwe ka ndị ezinụlọ ha ọbụla rute nwanne ha nwaanyị bụ osinachi nso.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na Osinachi anaghị ekwe ka ha kọtara onye ọzọ ihe ọ na-agabiga n'aka di ya bụ Peter Nwachukwu.
Cheta na Osinachi Nwachukwu nwụrụ n'ọdị nso a dịka ọ rịachara obere ọrịa.
Akụkọ bu ụzọ pụta bụ na ọ bụ ọrịa kansa ka Osinachi rịara tupu ọ nwụọ.
Mana ọ bụ oge ọ nwụchara ka kepukepu pụtawara na di ya na-emekpa ya ahụ, ma na-eti ya ihe kwa mgbe kwa mgbe.
Ndị uweojii ekwuola na ha anwụchiela nwoke ahụ bụ Peter Nwachukwu ma malite nnyocha gbasara ebubo ahụ.
Oge ọ dị ndụ, Osinachi Nwachukwu bụ onyeisi ukwe n'ụlọụka Dunamis International dị n'Abuja.
Onyeisi ụlọụka a bụ ụkọchukwu Paul Enenche apụtala kwuo na ya amaghị na Osinachi gabigara ụdị ihe dị etu ahụ n'aka di ya bụ Peter Nwachukwu.
Enenche kọwara na Osinachi gwara ya na ọ bụ obi mgbu na-eme ya, nke mere o ji ziga ya ụlọọgwụ maka ịnata ọgwụgwọ.

