Osinachi Nwachukwu Death Impact: Ihe ise ọnwụ ya kpalitere na Naịjirịa

Peter Nwachukwu Facebook Page

Ebe foto si, Peter Nwachukwu Facebook Page

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Abalị ise agafeela akụkọ ọnwụ Osinachi Nwachukwu onye e ji egwu "Ekwueme wee mara" ji wee fegharịa n'ụwa niile mana ndị mmadụ ka-akpụ akụkọ a n'ọnụ.

N'April 8, 2022 ka akụkọ ọnwụ Nwachukwu gbara na soshal midia dịka onye na-enyere aka n'imepụta egwu gwachara BBC Igbo maka ya bụ ọnwụ.

Akụkọ mbụ pụtara na ọ bụ kansa nke akpịrị gburu Osinachi mana ndị mmadụ(gụnyere ezinụlọ Osinachi) malitere kwuputewe maka mmekpa ahụ di ya bụ Peter Nwachukwu na-enye ya tupu Osinachi anwụọ.

Nke a mere ka ndị uweojii ga-anwụchie Peter ahụ ruo ugbua.

Ndị uweojii kwuru na ha eme nyocha maka ebubo niile ka ha wee mata nke bụ eziokwu.

Lee ihe ise ọnwụ Osinachi Nwachukwu kapliterela na Naịjirịa ugbua.

1. Gọọmentị Naịjirịa nụrụ iyi inwetere Osinachi Nwachukwu ikpe ziri ezi

Ministry of women Affairs, Nigeria

Ebe foto si, Ministry of women Affairs, Nigeria

Nkọwa foto, Pauline Tallen na ụmụ Osinachi Nwachukwu

Minista na-ahụ maka ụmụnwaanyị na Naịjirịa bụ Dame Pauline Tallen ṅụrụ iyi a n'akwụkwọ ozi o wepụtara na Mọnde inwete ikpe ziri ezi maka ọnwụ Osinachi Nwachukwu bụ oti egwu ụka a ma ama.

Ọ sị na akụkọ ọnwụ Osinachi kaara ịgafe etu ahụ ma ọ bụghị na kepu kepu banyere mmekpahụ site n'aka di ya bịara pụtara ihe.

Tallen sị na okwu mmekpa ahụ n'ime ezinaụlọ bụ ọrịa ọjọọ e kwesịrị iwepu na Naịjirịa n'ụzọ ọbụla.

Ọ sị na ministri ya ga-agba mbọ hụụ na ọnọdụ a agaghị emetụta ụmụ Osinachi ugbua ma ha too.

Nke a na ka a na-ebo di Osinachi bụ Peter Nwachukwu, nọ n'aka ndị uweojii ugbua ebubo na aka ya dị n'ọnwụ ya.

2. Ụmụnwaanyị na-ekwuwapụ okwu maka nkpagbu ugbua

Kamgbe akụkọ ọnwụ Osinachi pụtachara, obi akala ọtụtụ ụmụnwaanyị na-agabiga mmekpa ahụ na bee di ha ịkwụpute maka ya n'elu soshal midia.

Nwaagbọghọ a aha ya bụ Helen Michael kagburu agbamakwụkwọ, dịka ọ fọrọ abalị atọ ka ụbọchị ruo, n'ihi ebubo mmekpa ahụ na'aka di ya bụ David Okike.

Nwada Helen , onye Uburu dị n'Okpuruọchịchị Ohoazara dị n'Ebonyi steeti na di ya bụ David Okike, kwesịrị ịgba akwụkwọ n' ụlọụka 'Living Faith Church dị n'Amata Uburu n'ụbọchị Satọde, abalị 16 nke ọnwa Eprel afọ 2022, mana ya bụ agbamakwụkwọ agaghị enwezi isi.

N'ozi nke Helen wepụtara n'akara Facebook ya ụbọchị Wenezde, ọ kọwara na ihe mere ya ji kagbuo mmemme agbamakwụkwọ ha bụ n'ihi na di ya na-akụ ya ihe tinka kụrụ panụ kwa mgbe kwa mgbe.

Ihe a malitere kemgbe afọ 2020 di ya ji kwụọ ụgwọ isi ya.

Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi bụ Loveth Odah onye gwara BBc Igbo n'ekwentị na o nweghị onye wetaara ha mkpesa banyere okwu ahụ dụrụ nwaada ahụ ọdụ ka ọ bịa wetara ha mkpesa iji nweta nchekwa zuru oke.

Ọtụtụ nwaanyị ndị ọzọ pụtakwara na soshal midia kwupute maka mmekpa ahụ nke ha mana anyị ga-eme nyocha ma wepụtakwa ya ebe a.

Akpọmoku agbamakwụkwọ

Ebe foto si, Helen Michael/Facebook

3.Umụnwaanyị na ụmụnwoke ekwela onwe ha nkwa na ha ga-agbanahụ mmekpa ahụ

Ihe ọzọ anyị chọpụtara bụ na ma ụmụnwanyị nakwa ụmụnwoke na-ekwe onwe ha nkwa na ha ga-agba mbọ hụ na ha leziri anya ma ha na-achọ onye ha ga-alụ.

Ụfọdụ ọ n'elu soshal na-ede edemede ntakiri dịka " nwa m, ọ bụrụ na alụmdinanwuye gị ga-ewere ndụ gị, si ebe ahụ pụta, ihe ka mkpa bụ iji ndụ gị pụta."

Ebe ụfọdụ na-adụ ọdụ ka ndị ka nọ n'ime alụmdinanwunye ebe a na-eti ha ihe kwụsị ikpuchi onye na-emekpa ha ahụ.

Ụmụ nwaanyị na ụmụnwoke achọpụtala na ikpuchi onye na-emekpa gị ahụ bụ igwu ili gị n'oge.

4. Ndị ụka Christ elebawala anya na ntuzi alụkwaghị m (Divorce) baịble kwuru maka ya

Ụlọụka dịka nke Osinachi Nwachukwu na-aka tupu ọ nwụọ pụtara kwuo si na ha anaghị akwado mmekpa ahụ n'alụmdinanwunye.

Ụkọchukwu ụlọụka ahụ bụ Paul Enenche kwuru na ozioma ọ gbasara n'ụlọụka ya na ọ ka mma na mmadụ gbapụtara n'alụmdinwunye na-emekpa ya ahụ karịa ma ịnọrọ ebe ahụ ghọrọ ozu.

Ụfọdụ ụkọchukwu nọ n'elu soshal midia na-akatọ ndị na-akwado ka ndị a na-emegbu emegbu ka nọrọ na-edi.

Ụfọdụ mmadụ kwuru na okwu "na ntaramahụhụ na iheọma " a na-asị di na nwunye kwuo ma a na-agba ha akwụkwọ adabaghị maọlị.

5 Ngalaba Change .org na-akpọku ndị mmadụ ka ha binye aka na akwụkwọ mkpesa

Change .org

Ebe foto si, Screengrab

Ngalaba akpọrọ Change.org na-akpọkụ onyeisi uweojii Naịjiria ka o hụ na Osinachi nwetere ikpe ziri ezi.

Ha chọrọ ka ndị mmadụ binye aka n'akwụkwọ mkpesa ga-akwado ka emepụta iwu ga-akwado ntaramahụhụ nye onye ọbụla na-emekpa mmadụ ibe ahụ.

N'uche ha iwu a ga-eme ka enye ihe ọbụla gbasara ibelata mmekpa ahụ n'obodo oke ruru ya nke ga-azọpụta ndụ ọtụtụ nọ n'ọnọdụ ahụ ugbua.

Ka ọ dị ugbua mmadụ ruru puku iri na otu ebinyela aka n'akwụkwọ mkpesa ahụ, ya bụ mbinye aka ka na-aga n'ihu.