Ada Uburu: Ọ bụ di m ji aka ike tipụ afọ ime ọ sị m tepụrụ n’ụlọọgwụ

Ebe foto si, Ada Uburu
Nwaada Sandra Obi nke eji Ada Uburu mara na soshal midia agbaghala asịsa onye ọ chọbụrụ ịlụ bụ David Okike nyere n'okwu iti ya ihe nakwa ịtepụ ime ụmụ ha ugboro atọ.
N'abali Fraịd, nwaada Obi dere na soshal midia ya nke akara ya bụ Ada Uburu na ihe di ya kwuru banyere iji aka ya tepụ ime ugboro atọ bụ ụgha.
N'okwu ya, ọ sị: "Ọ bụ aka ike na ihe di m tiri m mere ụmụ m ji tepụ n'afọ m"
Nwaada Obi kwusiri ike na ọ bụ akụkọ ihe a sị mere onye otiegwu a ma ama bụ Osinachi Nwachuwku bụ ihe gbara ya ume ikagbu agbamakwụkwọ ha ma gaa n'ihu kwuo na ihe di dere maka ya iji ụzọ agụghọ mee ka agbamakwụkwọ ha gara ịdị ire bụ akụkọ ụgha.
N'okwu ya, Obi dere: "Ihe mere agamakwụkwọ anyị adịghị ire ka anyị si chọọ bụ n'ihi ezinụlọ anyị chọpụtara na ndị be di m ha bụ ndị ohu nke mere ha akwadoghị ya bụ agamakwụkwọ"
O kwuru na ndị obodo ha anaghị akwado alụmdinanwunye nye ndị ohu.
Obi si na o ji maka ịhụnanya ọ nwere n'ebe di ya bụ David Okike nọ were buso mmadụ niile n'ezinụlọ ya agha ma gbaa isi akwara na ọ ga-alụ ya.
O kwuru na anya ya emehela ugbua dịka onye o ji maka ya were buso ndị be ya agha bụ onye tiri ya ihe ugboro ugboro nke mere na nwa o bu n'afọ ji tepụ.
Ọ gara n'ihu kwuo "Di m ekweghị m ka m gaa ụlọọgwụ oge ime m tepụrụ agbanyeghị ihe mgbu ahụike m nọ na-agabiga"
Obi sị na ebubo Okike boro ya na o jiri aka ya tepụ ime nwa ha nke o kwuru na ọ maghị maka ya bụ ụgha n'ihi na nwanne ya nwaanyị bụ onye mechara duru ya gaa ụlọọgwụ Alex Ekwueme Federal University Teaching Hospital ebe ọ natara ọgwụgwụ maka nwa ha pụrụ n'afọ ya nwereike igba ama nke bụ eziokwu.

Ebe foto si, Ada Uburu
O kwukwara na mgbe ọ dị ime n'oge gara aga na kwa mgbe kwa mgbe ọ na-arịọ di ka ha gara inwe mmekọ mana ọ naghị ege ntị ma na-eji aka ike eso ya.
O kwuru na nwanne di ya nke nwaanyị bụ onye ọrụ ahụike bụ onye mechara duru ya ọ gaa ụlọọgwụ dịka izu ole m oke gachara mgbe di ya enweghị ya gaa nata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ maka ntepụ nwa ha.
Obi kesara foto ọ sị nwanne di ya nke o kwuru dụgara ya ụlọọgwụ sere ya ụbọchị ahụ.
O kwukwara na ọ natara ndụmọdụ n'aka ndị uweojii maka okwu ihe mere tupu ọ kagbuo agbamakwụkwọ ha ebe ọ sị na ha gwara ya hapụ ya bụ nwoke ma si n'obodo ahụ pụọ.
Marakwa na ụfọdụ ji aha Helen Michael mara Sandra Obi dịka di ya kwuru na ọ na-agbanwe aha ya kwa mgbe kwa mgbe na soshal midia.

Ebe foto si, Ada Uburu
Anaghị m eti nwaanyị m ihe, ọ tepụrụ ime nwa m ugboro atọ - David Okike

Ebe foto si, Ada Uburu
Nwoke a kpọrọ David Okike nke gaara agba akwụkwọ taa bụ Satode mana nwaanyị ya gbara ya alụkwaghị abalị atọ gara aga ekwuola na ebubo e boro ya bụ okpotokpo asị.
Nwanyị ya bụ Helen Michael bụ onye a ma dịka 'Ada Uburu' na soshal midia kagburu agbamakwụkwụọ ha na nsonso a sị na nwoke ahụ na-akụ ya ike tinka j=kụrụ panụ nke mere o ji kpebie ịgba ọsọ ndụ ya dịka akụkọ Osinachi Nwachukwu na-ewu..
Okike boro ebubo n'ozi o wepụtara na soshal midia ụnyahụ bụ Fraide na " nwaanyị ya etepụla ime nwa ya ugboro atọ n'ihi na ọ chọghị ịmụrụ ya nwa oge ha agbabeghị akwụkwọ na-agbanyeghị na o meela ihe n'isi ya.
N'okwu ya:,"Mụ na nwaanyị a yiri ruo afọ asatọ. Enweghị mgbe m ji tie ya ihe maọbụ nwere mma obejiri chụọ ya ọsọ"
O kwuru na ihe so kasuo nwaanyị iwe bụ na ndị ụka ha sị na agaghị eme usoro agbamakwụkwọ ha nke zuru oke n'ihi ọ tụrụla ime nke mere o ji malite imekpa ya ahụ.
Okike boro ebubo na nwaanyị ahụ ji ụzọ aghụghọ mee ka agamakwụkwọ ha hapụ ịdị ire agbanyeghị na o ji ego mepere ya ụlọọrụ ebe a na-ere ọgwụ nakwa ebe a na-azụ ụmụ ọkụkọ nakwa hizierie ya ego enyemaka maka oge ọrịa covid-19.

Ebe foto si, Ada Uburu
O gara n'ihu kwuo: "Ọ rịkpọrọ ego m dịka ọ na ekpori ndụ"
N'okwu ya ọ sị: "Ọ na-akọ akụkọ ndị na ịntanetị ka ọ teetọọ aha m ma ghọrịa ndị mmadụ"
Okike kwuru na ya na nne nwaada Uburu ka dị na mma ruo ugbua, dịka o kwuru na ezinụlọ ya bụ nwaada akwadoghị agwaa ya n'okwu a.
Ọ gakwara ama na nwaada ka dịrị ya ịme ugbua nke mere ọ gabeghị be ya ga nweghachịte ego o mere n'isi ya dịka omenala ha anabeghị ya ime nke ebe ọ ka dị ime.
Okike kwuru: 'Ọ mụcha nwa m nke a nọ n'afọ ya, aga m aga nata ego m mere n'isi YA'
O kwukwara na nwaanyị ahụ abụghị nke chi ya dobere ya.
Nwaagboghọ akagbuola agbamakwụkwọ n'ihi ebubo iti ihe

Ebe foto si, Ada Uburu
Ndị uweojii Ebonyi Steeti adụọla nwata nwaanyị gbara alụkwaghịm ọdụ ka ọ bịa wetara ha mkpesa iji nweta nchekwa n'aka di ya onye o boro ebubo na ọ na-akụ ya ihe.
Nwaagbọghọ a aha ya bụ Helen Michael kagburu agbamakwụkwọ, dịka ọ fọrọ abalị atọ ka ụbọchị ruo, n'ihi ebubo mmekpa ahụ na'aka di ya bụ David Okike.
Nke a na-abịa dịka o mere abalị olemole akụkọ gbasara otiegwu ụka a ma ama bụ Osinachi Nwachukwu, onye lara mmụọ n'ihi ebubo mmekpa ahụ site n'aka di ya bụ Peter Nwachukwu.
Nwada Helen , onye Uburu dị n'Okpuruọchịchị Ohoazara dị n'Ebonyi steeti na di ya bụ David Okike, kwesịrị ịgba akwụkwọ n' ụlọụka 'Living Faith Church dị n'Amata Uburu n'ụbọchị Satọde, abalị 16 nke ọnwa Eprel afọ 2022, mana ya bụ agbamakwụkwọ agaghị enwezi isi.
N'ozi nke Helen wepụtara n'akara Facebook ya ụbọchị Wenezde, ọ kọwara na ihe mere ya ji kagbuo mmemme agbamakwụkwọ ha bụ n'ihi na di ya na-akụ ya ihe tinka kụrụ panụ kwa mgbe kwa mgbe.
Ihe a malitere kemgbe afọ 2020 di ya ji kwụọ ụgwọ isi ya.
Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi bụ Loveth Odah onye gwara BBc Igbo n'ekwentị na o nweghị onye wetaara ha mkpesa banyere okwu ahụ dụrụ nwaada ahụ ọdụ ka ọ bịa wetara ha mkpesa iji nweta nchekwa zuru oke .
Ọ sịrị: " Anyị enwetaghị mkpesa ọbụla banyere nke a."
" Ihe nwaada ahụ mere ịjụ ịgbawa nwoke nji mma achụgharị ya akwụkwọ bụ ihe kwesịrị ekwesị, ka ọ ghara ịdị ya ka ọ dị Osinachi (Nwachukwu),"
" Mana ọ dị mkpa na ọ bịara wetara ndị uweojii mkpesa ka e were nye ya nchekwa n'ihi na ị maghị ihe nwoke ahụ ọ ghapụrụ ịlụ na-echere ya."
N'ozi Helen depụtara na Facebook o boro ebubo na di ya na-akụ ya ụdọukwu, azịza na osisi ma jirila 'hammer chọọ ịkụ ya ugboro ugboro,

Ebe foto si, Helen Michael/Facebook
Mana nke mere nkịta jiri sị onye ya tụrụ ahịa oche welatakwara ya ego ya mere n'Monde gara aga bụ ụbọchị nwoke ahụ kụrụ ya 'ga-kọsara-chi-gị ma buru nnukwu mma chọọ igbu ya.
O kọwara na nne di ya, ụnụnne ya ndị nwaanyị na ndị agbatobi gbodoro ya.
Ọ sịrị,"Onye a kpọrọ di bụ onye iwe juru afọ na-akụ m ụdọukwu, ozizi ma azịzagbe ọbụla."

Ebe foto si, Helen Michael/Facebook
"Ọtụtụ mgbe ọ bulitere 'hammer' ịkụ m"?
"Na Monde a gara aga, n'ihi obere nghọtahie, o tirere m gwogwo na-emeghị ebere, gbabaa n'usekwu nne ya buru mma oge,"
"Mgbe m hụrụ na ọ gara iweta ngwaọgụ, a gbachiri ọnụụzọ, nne ya, ụmụnne ya nwaanyị na ndị agbata obi gbakọrọ na-arịọ ya ka ọ ghara igbu m mma."
"N'ihi ihe ndị a, ike agwụla."
"Agaghị m esonye n'ịgbankwụ na agbamakwụkwọ ga-adị n'etitui mụ na David Okike na Satode na-abịanụ bụ abalị 16, nke ọnwa Eprel."
Mbo BBC Igbo gbara inweta olu David Okike amịtaghị mkpụrụ.
Okike azaghị ekwentị ya oge BBC Igbo kpọrọ ya.













