Ipob sit at home: Ọ kwụsịwala n'Anambra na ebe ndị ọzọ?

Ụfọdụ mpaghara Onitsha dị n'Anambra Steetị

BBC Igbo kpagharịrị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ na Mọnde 11 Eprel, 2022 ịmaka ka ndị mmadụ o rubereisi n'iwu onye apụla ezi.

Nke a na-abịa n'ime otu izuụka Gọvanọ Chukwuma Soludo nke Anambra sị na atụmatụ a akụrụla ọnụ na steetị n'ụbọchị anọ ọnwa Eprel bụ nke e ji ekpere pịachie.

Ajụjụ abụrụ "ndị mmadụ ọkachasị ndị Anambra ọ ṅara ntị n'oku a"? Nke a so n'ihe ị ga-achọpụta n'akụkọ a.

N'Anambra Steeti

Onitsha

Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara n'ụfọdụ obodo dị n'Anambra ma chọpụta ụfọdụ ihe ndị mere taa.

n'Awka, ọ chọpụtara na ụfọdụ ndị na-azụ ahịa na ndị ọzọ na-apụta na-aga mkpa dịịrị ha karịa ka o si adị n'ụbọchị Mọnde ndị ọzọ.

Ndị na-eme njem si Awka na-aga Onitsha

Ọdọụgbọala mechiri emechi mana ndị njem si Awka aga Onitsha na-abanye ụgbọala n'okpuruụzọ a kpọrọ 'ndị aka n'elu'.

Ụfọdụ ụlọahịa mechikwara emechi mana ndị na-ere ahịa n'okporoụzọ na-ere ahịa ha obere obere.

Ụfọdụ mpaghara Onitsha dị n'Anambra Steetị

N'Onitsha, ebe niile tọgbọ chakoo, ụlọahịa emepghi, ndị mmadụ na ụgbọala na-aga n'otu n'otu.

N'Imo Steetị

Ụzọ dị n'akụkụ ụlọ mkpọrọ dị n'Owerri

Na mkpagharị BBC Igbo mere n'Owerri bụ isiobodo Imo Steetị, ndị mmadụ apụtachaghị ka o si adị n'ụbọchị ndị ọzọ.

Ụlọakwụkwọ, ụlọahịa, ụlọakụ na ụlọorụ dị iche iche mechichara emechi.

Okporoụzọ Okigwe

Ebe ndị a kpagharịrị gụnyere; Okporoụzọ Okigwe, IMSU junction, Bank Road, Government Roundabout, Prisons junction Roundabout nakwa okporoụzọ Wethedral dịcha n'Owerri.

N'Abia Steetị

Okporoụzọ dị n'Aba

Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara n'Aba nakwa Umuahia dị n'Abia steetị ma chọpụta etu ihe si kwụrụ n'ebe ndị a.

N'Aba, ọtụtụ ụlọakụ na ụlọahịa dị n'okporoụzọ Azikiwe, ebe a na-ere osikapa na ọdọ ndị na-ere ọgwụ dị n'okporoụzọ Tenant gbachiri agbachi.

Okporoụzọ Azikiwe dị n'Aba

Ebe ndị ọzọ dịka Okigwe road, Eziukwu, Faulks, nakwa Ehi road tọgbọrọ chakoo, ndị mmadụ na-aga n'otu n'otu.

Ụfọdụ ndị na-ere ahịa okporoụzọ n'Aba

Onye ntaakụkọ anyị chọpụtara na ụfọdụ ndị ụka na-ebugharịzi ofufe ha n'ụbọchị Wenezde ka ọ bụrụ na Mọnde, ka ha nweeike zụọ ahịa site na Tuzde ruo Satọde.

Ụlọọgwụ gọọmentị dị n'Umuahia

N'aka nke ọzọ ndị mmadụ Umuahia, ụlọakwụkwọ, ụlọakụ, ụlọọrụ na ụfọdụ ụlọahịa mepere emepe.

Okporoụzọ dị n'Umuahia

Ndị mmadụ na-aga mkpa dịịrị mana ọ dịchaghị ka o si adị n'ụbọchị ndị ọzọ.

N'Ebonyi Steetị

Ndị na-eme njem n'Ebonyi

Onye ntaakụkọ anyị chọpụtara na ndị mmadụ na-aga mkpa dịịrị ha n'Ebonyi Steetị na-atụghị ụjọ ọbụla.

Ndị na-eme ahịa n'okporoụzọ dị n'Ebonyi

Ụlọahịa, ụlọakụ, ụlọakwụkwọ nakwa ụlọọrụ mepechara emepe n'uju, njem ụgbọala na-agakwa dịkwa o kwesịrị.

N'Enugwu

Okporoụzọ Abakpa Nike

Enugwu bụ isiobodo Enugwu Steetị tọgbọrọ chakoo dịka ibe ya dịka ọtụtụ ụlọahịa, ụlọakụ, ụlọakwụkwọ na ụlọọrụ dị iche iche mechiri emechi.

Mkpụrụ mmadụ ole na ole ji ụkwụ na-akpagharị na-enweghi nsogbu maọbụ mmaja ọbụla.

Ndị na-eme ji ụkwụ na-agagharị

Ụfọdụ ebe ndị BBC Igbo gara gụnyere; Abakpa, New Heaven.

Ọgbatumtum Keke ji nwaayọ na-agba

Etu 'sit at home' si malite

Ndị na-eme njem n'Ebonyi

Atụmatụ onye apụla ezi a na-akpọ 'sit-at-home' bụ iwu otu na-achọ nwereonwe Biafra bụ hiwere iji gosi ndị Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa kwadoro ihe ha na-eme.

A na-emekaarị otu ụbọchị kwa afọ n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee ji kwanyere ndị nwụrụ n'oge agha Biafra ugwu.

Mana kamgbe gọọmentị Naịjiria nwuchigharịrị Nnamdi Kanu bụ onye ndu ha, Ipob meziri ka iwu ahụ bụrụ ụbọchị Mọnde ọbụla nakwa ụbọchị Kanu ga-aga n'ụlọikpe.

Mana Kanu nyere iwu site n'ọnụ ọkaiwu ya bụ Ifeanyi Ejiofor sị ka Ipob kagbuo nke ụbọchị Mọnde, bụ nke ha mere.

Mana ndị mmadụ ka na-aga n'ihu ịnọ n'ụlọ kwa Mọnde bụ ọtụtụ n'ime ha sị na egwu ịpụta ezi na-atụ ha maka na ndị oji egbe egbuola ọtụtụ ndị pụtara ezi n'ụbọchị ndị ahụ.