Chukwuma Soludo: Ọchịchọ 'asylum' ndị bi n'ofesi o so n'ihe cheere nkwụsị 'sit at home' aka mgba?

Gọvanọ Chukwuma Soludo nke Anambra Steetị sị na atụmatụ onye apụla ezi abịala na njedebe n'ụbọchị 4 Eprel, 2022.
Okwu banyere atụmatụ a dị ka a ga-asị na ọ bụzi ogwu gbadoro mmadụ n'akpịrị, nke na-ekweghi olulo maọbụ ọgbụgbọ.
Ọtụtụ ndị bi n'Ọwụwa Anyanwụ sị na o metụtala akụnụba ha ọkachasị ndị na-akpata ihe ha na-eri kwa ụbọchị.
Ebe ndị ọzọ na-ekwu ka a gaa n'ihu na-eme ya, ọkachasị ndị bi n'ofesi, na ọ bụ maka ịchụta nnwereonwe Biafra nakwa ịtọhapụ Nnamdị Kanu.
Mana akụkọ sị na otu ihe mere ụfọdụ ndị bi n'ofesi ji akwado 'sit-at-home' bụ maka uru ha nwereike irite na ya, otu n'ime ha bụ inweta 'asylum'.
Otu onye bi n'ofesi na-achọghị ka a kpọo aha ya gwara BBC Igbo na o ma ihe ruru mmadụ atọ ji ọnọdụ ala Igbo dị ugbua nwete 'asylum' na mba ofesi.

Gịnị bụ Asylum?
Asylum bụ mkpuchi pụrụiche mmadụ maọbụ otu na-enwete n'aka mba ọzọ mgbe gọọmentị mba nke ha si na ya na-akpagbu ha.
Ndị a na-enye 'asylum' bụ ndị gbara ọsọ ndụ site na mba ha gaa mba ọzọ n'ihi ọdachị dịka agha, maọbụ ọnọdụ ndị nwereike itinye onye ahụ n'ihe ize ndụ.
Atụmatụ a malitere na mba Ijipt, Greek nakwa Hebrew tupu ọ gbasaa na mbaụwa ndị ọzọ.
Iwu United Nations nke afọ 1948 kwuru na "onye ọbụla nwere ikike ịchọ mkpuchi 'asylum' site n'aka mba ọzọ".
Kedụ ndị na-akwanye ọkụ ịnọ n'ụlọ a?

Mgbe otu na-achọ mnwereonwe Biafra site na Naịjirịa bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) sị na ha akagbuola atụmatụ onye apụla ezi kwa Mọnde ọbụla, ụfọdụ ndị otu ha gbarụrụ ihu maka mkpebi ahụ.
Ọtụtụ n'ime ha na-agbasa ozi na soshal midia na-akpọ oku ka ndị bi n'Ọwụwa Anyanwụ hapụ ige ntị n'iwu ọhụrụ ahụ.
Ha gara n'ihu kwuo na onye ọbụla a hụrụ n'ezi kwa Mọnde ọbụla ga-eji eze kpee ekwere, nke a butere ụjọ jiri dị na mpaghara ahụ ugbua.
Mana nchọpụta gosiri na ọtụtụ n'ime ndị na-agbasa ozi a bicha na mba ofesi, nọrọ ebe ahụ na-akwado 'sit-at-home' n'Ọwụwa Anyanwụ.
Lee ụfọdụ ndị na-agbasa ozi a nakwa mba ha bi:
Simon Ekpa - Finland
Simon Ekpa weere ọkwa mgbasaozi n'igwe Redio Biafra mgbe gọọmentị Naịjirịa nwuchiri Nnamdi Kanu bụ onye ndu Ipob n'afọ 2021.
Ọ sị na ọ bụ iwu Kanu nyere ka ọ nọchie anya ya na ngalaba ahụ ruo mgbe a ga-atọhapụ ya.
Ekpa, onye bi na mba Finland, so na ndị ka na-akpọ oku ka ndị Ọwụwa Anyanwụ na-anọ n'ụlọ Mọnde ọbụla.
N'ihi nke a ya na ndị isi Ipob a kpọrọ 'Directorate of State' (DOS) enweela nsogbu maka inupuisi n'iwu ha.
Ọtụtụ mgbe ka Ekpa na-eki akara soshal midia ya dị icheiche na-agbasa ozi ma na-ekwu ka 'sit-at-home' na-aga n'ihu.

Ebe foto si, Screen scrab
Nelly Iduu-Ofoegbu
Nelly Ofoegbu bụ onye ọzọ so na-akpọ oku ka atụmatụ onye apụla ezi gaa n'ihu.
O bi na mba Amerịka, ọ rụrụ ọrụ dịka onye na-agba ụgwọ na Ipob a kpọrọ 'financial recovery officer'

Ebe foto si, Screen scrab
Ofoegbu katọkwara atụmatụ ekpere Soludo wepụtara banyere mpịachi ọnọdụ 'sit-at-home'
Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị bi n'ofesi na-akatọ 'sit-at-home', mana e nwekwara ụfọdụ ndị ọzọ bi na mba ofesi nakwa n'Ọwụwa Anyanwụ na-akwado atụmatụ a.
Ihe otu jikọtara ndị Igbo bi n'ofesi kwuru
Onyeisi otu World Igbo Congress bụ Ọkammụta Anthony Ejiofor sị na ha anaghị akwado atụmatụ onye apụla ezi nke na-eme n'ala Igbo.
Ọ sị na ha so na ndị gbara mbọ ịhụ na a gara n'ihu mee ntuliaka ọkwa gọvanọ n'Anambra n;'afọ 2021.
Ejiofor "Anyị bụ ndị nọ n'ofesi na-agba mbọ ụtụtụ na abalị ịhụ na a kwụsịrị 'sit at home' maka na ọ gaghị enyere ndị Igbo aka.
Ọ gara n'ihu kwuo na onye ọbụla bi n'ofesi na-akpọ oku ka 'sit at home' na-aga n'ihu abụghị onye otu ha.
Onye ozo bi na mba Briten bụ Tochukwu Ezeoke sị na ndị ji ọgbaghara dị n'Ọwụwa Anyawụ achọ 'assylum' n'ofesi amaghị ihe ọ na-eme.
"O nweghi etu 'sit at home' ga-esi nwete mnwereonwe Biafra a na-achọ"."
Kedụ mgbe sit at home malitere?
Atụmatụ onye apụla ezi a na-akpọ 'sit-at-home' bụ iwu ndị Ipob hiwere iji gosi na ndị Ọwụwa Anyanwụ kwadoro ọchịchọ nnwereonwe.
Ha na-emekarị ya n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee kwa afọ, iji kwanyere ndị nwụrụ n'oge agha Biafra ugwu.
Kamgbe gọọmentị Naịjiria nwuchigharịrị Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Ipob, ha meziri ka 'sit-at-home' bụrụ ụbọchị Mọnde ọbụla nakwa ụbọchị ọbụla Kanu ga-aga n'ụlọikpe.
Ha sị na ha agaghị akwụsị atụmatụ a ma ọ bụrụ na gọọmentị Naịjirịa atọhapụghị Kanu.
Ipob dọrọ aka na ntị na onye ọbụla pụtara ezi n'ụbọchị ndị ahụ ga-eji isi ya buru ihe o kotere.
Ha mechara kagbuo ya mana ọtụtụ ndị otu ha jụrụ ajụ, ebe ndị oji egbe na-awakpo ma na-egbu ndị pụtara ezi.
Nke a so n'ihe mere ndị mmadụ ka ji na-anọ n'ụlọ kwa Mọnde, na-ekwu na egwu ịpụta ezi na-atụ ha maka na e gbuola ọtụtụ ndị pụtara ezi.
Ihe ndị Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ merela iji kwụsị ya

Ebe foto si, Soludo TV/Facebook
Ndị Gọvanọ Steetị Ọwụwa Anyanwụ agbaala mbọ ịkwụsị 'sit-at-home' a mana ihe na-ebe ka na-ebe.
Ha tinyere iwu dịka 'ịta ndị ọrụ Bekee na-agaghị ọrụ ahụhụ, ịnapụ ndị na-emepeghi ahịa ọdọahịa dgz.'
Dịka Gọvanọ Chukwuma Soludo weere ọchịchị n'Anambra Steetị, ọ gbapụrụ ọsọ ịhụ na o wetere nchekwa ma kwụsị iwu onye apụla ezi.
Ọ rịọrọ ndị niile na-ebu egbe ka ha wụsa ngwaọgụ ha, na ọ ga-azụ ha n'ụzọ ọbụla ha chọrọ site n'atụmatụ 'amnesty'.
Soludo kpọrọ oku ekpere na steetị ya na Mọnde 4 Eprel, 2022 bụ nke ọ sị e ji apịachi atụmatụ 'sit-at-home'.
Ụfọdụ ụlọụka nọ n'Anambra rubereisi n'oku ahụ ma kpee ekpere ụbọchị banyere nchekwa na ọganihu steeti.
BBC Igbo gagharịrị n'Anambra n'ụbọchị 4 nke Eprel ma chọpụtara na ọtụtụ mmadụ erubechaghị isi n'oku ahụ gọvanọ Soludo kpọrọ.









