Anyị dị njikere inye ndị 'unknown gunmen' 'amnesty' - Chukwuma Soludo

Gọvanọ Chukwuma Soludo ekwuola na ihe na-eche ya ugbua n'ọrụ ọchịchị ya bụ ihibe usoro ncheka n'Anambra steeti

Ebe foto si, Soludo TV/Facebook

Nkọwa foto, Gọvanọ Chukwuma Soludo ekwuola na ihe na-eche ya ugbua n'ọrụ ọchịchị ya bụ ihibe usoro ncheka n'Anambra steeti

Gọvanọ n'Anambara steeti bụ Chukwuma Soludo ekwuola ihe tụrụ ụwa n'anya dịka o kwupụtara njikere ya inye ndị ojiegbe na-akpa ike na steeti ahụ mgbaghara ma ha chịsa ngwaọgụ ha.

Na mkparịtaụka ya na ndị ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV nwere n'ụbọchịụka, abalị atọ nke ọnwa Eprel, afọ 2022, Soludo kwuru na ọ ma na ọ bụghị naani aka ike ka aga eji nweta udo kama na mkparịtaụka ka a ga esi nweta ihe ha na-achọ.

Ọ gara n'ihu kwuo na atụmatụ a a kpọrọ 'Amnesty' na Bekee ga-eru onye ọbụla kwetara pụta chịsa ngwaọgụ ya.

Cheta na n'ọgbakọ maka udo n'Anambara steeti nke e mere na Dora Akunyili Women Development Centre dị n'Ọka n'ụbọchị Satọde, Soludo kwuru na ọ na-akpọku ndị otu omekome niile bu egbe akpa ike n'ime ọhịa ka hapụta bịa zute ya maka mkparịtaụka udo.

Soludo sị "Atụmatụ ịnọ n'ụlọ nke 'sit-at-home' ebịela n'Anambra steeti, ndị Eze ọdịnala na ndị isi ụka dị ịcheịche niile ga-eme ekpere iji gosi nkwado ha nye nkwụsị atụmatụ a ma weghachịte udo n'Anambra steeti"

O kwuru maka mkpebị ịkwụsị 'sit-at-home' "ndị isi ụka dị ịche ịche n'ọwụwa anyanwụ, ndị Eze ọdịnala ndị otu Ipob sonyere anyị na mkpebị a ma sonyekwa n'ekpere nkwụsị 'sit-at-home' n'Anambra nakwa n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa"

"Ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) ekwuola na ha esoghonyeghịzị n'otu ndị omekome ndị a na-akpa ike, ekwetere m n'ihe a ha kwuru nke mere anyị na ha jị arụkọ ọrụ ugbua"

O kwuru na oke Ipob nke ya na ha na-arụkọ akatọọla iwu onye nọrọ n'ụlọ bụ sit-at-home nakwa oke ogbugbu ndị mmadụ na-eme n'ala Igbo.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ ma na otu Ipob ekesala n'oke dị ịcheịche dịka otu Ipob nke ha na ya na-arụkọ ọrụ ugbua na-atụ otu nke nwoke akpọrọ Simon Ekpe aka ma na-ebo ya ebubo dịka onye nọ n'isi mwakpo na-arị ibe ya elu n'Anambra nakwa akụkụ Ọwụwa Anyanwụ dị ịcheịche.

Ọkpụrụ ihe ndị Gọvanọ Soludo kwuru n'ọgbakọ maka udo e mere n'ụbọchị Satọde

Soludo

Ebe foto si, Soludo

Aka na-achị Anambra steeti bụ Chukwuma Soludo na-arịọ ndị ntorobịa niile na-akpa ike ọjọọ na steeti ahụ ka iwe onye ọbụla dajụọ, ka ha dotuo egbe h'ala ma si n'ime ọhị pụta ka a kpaa maka udo.

Soludo kwuru nke a n'ọgbakọ zuzugbe e nwere n'Awka taa bụ Satọde, Eprel 2, bụ ebe a nọrọ kpaa etu udo ga-esi lọghachi n'Anambra.

N'okwu ya n'ọgbakọ ahụ, Soludo kwuru na ọchịchị ya dị njikere ka a kpaa akpaa ka udo wee dị.

"Ma ndị ọma, ma ndị ọjọọ, ma onye ukwu ma onye nta, mụ na ha ga-enwe ọgbakọ, kpaa nkata."

"Ya mere, ana m akpọku ụmụ okorobịa niile bu egbe nọrọ n'ime ọhịa, ma ndị nọ n'Orsumoghu, ma ndị nọ na Lilu, ma ndị nọ Ụkpọ, ka ị nọ Unubi, ka ị nọ Ezinifite, ka ị nọ Aguluezechukwu, pụtanụ pụtanụ, bịanụ ka nyị dozie be anyị."

Anyị ga na-aga ije, na-alụ ọgụ, ka a tọhapụ Nnamdi Kanu e ji eji - Soludo

Soludo

Gọvanọ Anambra Steeti ekwuola na ha ga na-agba mbọ ma na-aga ije ka gọọmentị etiti tọhapụ Nnamdi Kanu na mkpọrọ.

O kwuru nke a n'ụbọchị Satọde oge ọ gara njem nleta na mpaghara dị iche iche n'Ọnịcha ị ga lee etu atụmatụ mkpocha na nazacha si aga.

O kwuru sị: "Anyị ga na-alụ ọgụ, na-aga ije, na-ekwu okwu ka a tọhapụ nwanne anyị nwoke bụ Nnamdi Kanu na mkpọrọ."

"Ụmụ akwụkwọ anyị ga-amalite ịga akwụkwọ n'ụbọchị Mọnde, ndị ahịa ga-amalite ịzụ."

"Anyị enweela nkwekọrịta: ndị eze, ndị isi ụka, ndị ọchịchị, ma ndị IPOB."

Usoro a ga-eso iji weta nchekwa ma kwụsị nkwafu ọbara n'Anambra

Ihe ndị a bụ ụzọ Gọvanọ Soludo kwuru na ọchịchị ya ga-esi chọọ udo na nchekwa n'Anambra

  • Anyị ekwekọrịtala na a ga-akwụsị sit at home
  • Anyị ga-enwe atụmatụ ebe ndị ntorobịa niile na-arụ agboro ugbua ga-edenye aha, nweta ọzụzụ iji malite ndụ bara uru
  • Anyị ga-ehibe 'truth and reconciliation commission' ebe onye ọbụla ga-abịa kwuo ihe bụ iwe ha ka udo wee dị
  • Anyị ga-ehibe 'security trust-fund' ka onye ọbụna, ma ndị nọ n'ụlọ ma ndị nọ n'ama tinye akụ ha iji nweta ezi nchekwa
  • Obodo niile kwesịrị inwe atụmatụ ha ga-agbaso ma ọnọdụ gbatagbata dapụta, nke a kpọrọ 'community response plan' na bekee

Etu a ga-esi kwụsị 'sit-at-home' kwa Mọnde ọbụla

Soludo

Ebe foto si, Soludo

Soludo gara n'ihu kọwaa atụmatụ gọọmentị ya wepụtara gbasara ọnọdụ onye apụla ezi nke a na-eme na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kwa ụbọchị Mọnde ọbụla kamgbe ọnwa June afọ 2021.

O kwuru sị: "Ụnụ hụrụ akwụkwọ ndị IPOB wepụtara ụnyaahụ wee kwuo na ha kwenyere n'ihe m kwuru banyere ịkwụsị 'sit-at-home'."

"Anyị na-aga n'Awka ugbua ka anyị nwee nzuko etu udo, agamnihu, na nchekwa ga-esi lọghachite n'Anambra steeti."

"Ndị ụka niile ga-aka ụka n'elekere iri na otu nke ụtụtụ ụbọchị Mọnde, iji gosipụta na 'sit-at-home' abịala n'isi njedebe."

Etu nchekwa si kawanye njọ n'Ọwụwa Anyanwụ

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Nigeria Presidency-Facebook

Nkọwa foto, Ọnọdụ nchekwa kawanyere njọ n'Ọwụwa Anyanwụ oge gọọmentị Naịjirịa nwụchiri Nnamdi Kanu onyeisi ndị IPOB

Ọ bụ eziokwu na ọnọdụ nchekwa dị njọ na Naịjirịa niile, mana ọ kawanyere njọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ oge gọọmentị etiti nwụchiri Nnamdi Kanu n'ọnwa June afọ 2021.

Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu na-azọ maka nnwereonwe Biafra aha ha bụ 'Indigenous People of Biafra' (IPOB).

Gọọmentị Naịjirịa sị na ọ bụ na mba Kenya ka ha si nwụchie ya, ma kpụlata ya ka ọ zara ọnụ ya n'ụlọikpe maka ebub iyi ndụ egwu nakwa ịchọ ịkwatu gọọmentị.

N'ihi nnwuchi a nwụchiri Kanu, ndị IPOB kwuru na ha ga-emechi ala Igbo niile kwa ụbọchị Mọnde ọbụla iji gos iwe ha.

Ha kwuru na onweghị onye ọbụla ga-apụ ezi n'ụbọchị Mọnde, ruo mgbe gọọmentị etiti tọhapụrụ Kanu.

Oge gọọmentị kpụpụrụ Kanu ụlọikpe, ndị IPOB kwuru na ha akagbuola iwu ahụ ha nyere, kama ọ bụ naanị n'ụbọchị Kanu nwere ikpe ka onye ọbụla ga-anọ n'ụlọ.

Mana ọtụtụ ndị ekperima kachiri ntị na-eyi ndị mmadụ egwu n'ụbọchị Mọnde ọbụla na steeti ise dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, nke a mere ka onye ọbụla were ụbọchị Mọnde dịka ụbọchị ezumike.

Kamgbe ahụ kwanụ, ogbugbu mmadụ, ntọrị mmadụ nakwa ịwakpo ndị ọrụ nchekwa arịala elu.