Soludo Vs Willie Obiano: 'Anambra steeti ji ụgwọ ruru N100bn'

Ebe foto si, Soludo TV/Willie Obiano/Facebook
Gọvanọ Chukwuma Soludo bụ onye na-achị Anambra steeti ugbua kwupụtara okwu ịtụ n'anya banyere etu ọnọdụ ego mkpata na ntufu steeti ahụ siri dị n'aka Willie Obiano bụ onye ka chịpụrụ Anambra steeti.
Na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ Arise TV nwere taa bụ Tuzde ọ sị:
'Ego m natara mgbe enyefere m ọchịchị nke dị n'akpa Anambra steeti ruru nde Naịra puku narị abụọ ebe ụgwọ Anambra steeti ji karịrị ijeri narịa otu narị'
O kwuru na ọnọdụ ego steeti ahụ daturu ada atu.
Lee ọkpụrụkpụ ihe ole ma ole ndị ọzọ o kwuru na mkparịtaụka ahụ banyere ọnọdụ ego steeti ahụ:
- O kwuru na ha ezipụtala ma gbaa n'anwụ akwụkwọ ebe e depụtara ihe niile banyere ọnọdụ ego steeti ahụ ruo ụbọchị 31 nke ọnwa Dịsemba
- O kwuru na naanị ihe fọrọ itinye na akwụkwọ ọnọdụ ego steeti bido na Jenụwarị ruo ụbọchị enyefere ya ọchịchị
- O kwuru na ego dị n'akpa Anambra steeti ugbua bụ naanị ihe ruru naịra nde puku narị abụọ maọbụ anọ
- Gọvano Soludo kwukwara na ụgwọ Anambra steeti ji mgbe enyefere ya ọchịchị ruru ihe karịrị narịa ijeri otu narị
- O kwukwara na dịka o si kwee na nkwa ụbọchị e nyefere ya ọchịchị na ya ga-ahụ na agbara n'anwụ etu ego si abata nakwa na-apụ na steeti ahụ
- O kwuru na agbanyeghị etu akpa ego Anambra siri datuo ugbua na gọọmentị ga-eji ego ha ha natara na nyefe ọchịchị a amalite ọrụ

Ebe foto si, Soludo TV
Lee ndị Gọvanọ Soludo Họpụtarala maka isonye n'ọrụ
N'ihe awa ole na ole e duru gọvanọ Charles Soludo nke Anambra Steetị n'iyi ọrụ, ọ kpọpụtala mmadụ atọ n'ime ndị ga-eso ya rụọ ọrụ.
Nke a dị n'ozi e wepụtara n'aka Facebook Soludo TV na mgbede Tọzde 17 Maachi, 2022.
Ndị a gụnyere;
Solo Osita Chukwulobelu - Odeakwụkwọ gọọmentị Anambra Steetị, ọ jikwa ọkwa ahụ mgbe gọvanọ Willie Obianọ nọ n'ọchịchị
Gịnị bụ ọrụ Odeakwụkwọ Gọọmentị?
- Dịka aha ya si dị, ọrụ odee akwụkwọ gọọmenti bụ ime ka ọha mara ebumnobi gọọmentị na ọrụ ndị ha na-arụ.
- Ọ na-enyere gọọmentị ịhazi ma nwete ebumnobi ndị ahụ site n'inye ndụmọdụ na ntuziaka.
- Ọ na-ahazi ụfọdụ iwu gọọmentị na-eme ma hụkwa na e tinyere iwu ndị ahụ n'ọrụ.
- Ọ bụ ya na-achịkọta ọrụ ndị ministri dị iche iche
- Gọọmentị steeti ọbụla na Naịjirịa nwere ọkwa odeakwụkwọ maka na ọ dị oke mkpa.
Chukwudi Okoli - Onyeisi ngụkọ ego Anambra Steetị
Gịnị bụ ọrụ Onyengụkọ ego Gọọmentị?
- Ọrụ onye ngụkọ ego gọọment bụ ịhazi ego niile bụ nke gọọmentị iji hụ na e nweghi 'oke maọbụ ngwere' ọbụla ga-ezuru ya.
- Ọ bụ ya na-abata ego niile na-abata n'akpa gọomentị site n'ebe dị iche iche 'revenue'.
- Ọ na-ahụkwa maka etu gọomentị si emefu ego ha, ịhụ na e tinyere ya n'ebe o kwesịrị ịga.
- Ọ bụ na-ahazikwa ego ụtụisi ndị mmadụ bi na steetị.
- Ọ bụ ya na-eji igodo ọbaego ụlọakụ ebe ego gọọmentị steetị ahụ dị.
Chinedu Nwoye - Osote onyeisi ndị ọrụ gọvanọ
Gịnị bụ ọrụ Osote onyeisi ndị ọrụ gọvanọ na-eme?
- Dịka aha ya si dị, ọrụ ya bụ inye aka ịchịkọta ndị niile na-arụrụ gọvanọ ọrụ.
- Ọ na-ata ozi n'aka gọvanọ, o ziruo ya na ntị ndị ọzọ na-arụrụ gọvanọ ọrụ.
- O nweghi onye na-ahụ gọvanọ anya ma ọ bụrụ na onye ahụ esighi n'aka ha.
- O nwereike ịrụ ọrụ dịka onye ndụmọdụ gọvanọ na onye ntụkwasị obi ya.
Ernest Ezeajughi - Onye nchịkọta ndị ọrụ oyibo a kpọrọ "Chief of Staff" na Bekee
Gịnị bụ ọrụ onye nchịkọta ndị ọrụ oyibo na steeti?
- Inyere gọvanọ aka hụ na ọrụ na-aga nke ọma nakwa ndị ọrụ steeti niile na-eme ihe ha kwesiri
- Inyere aka hụ na kwa ụbọchị ihe niile na-eme n'obi gọọmentị nakwa ụlọọrụ gọvanọ na-aga nke ọma
- Itinye aka n'ịkpa nkata banyere atụmatụ nakwa ihe ewumewu gọọmentị steeti na-ezube ime
- Ịbụ onye ndụmọdụ nakwa anya na-elechịtere gọvanọ na oge ime mkpebi dị mkpa
- Ịbụ onye ọsọ gbatagbata na enwe ọgbaghara na steeti maọbụ na ọchịchị gọọmemtị steeti
Mgbe Soludo na-ekwu okwu mbụ ya dịka gọvanọ, o kwere nkwa ịkpọpụta ndị ga-arụ ọrụ dịka kọmishọna n'ime otu izuụka.
Akụkọ ka na-abịa...






