Governor Soludo's swearing-in: 'Anyị agaghị eji ego ndị Anambra gbaa origo' - Charles Soludo

Ido n'iyi órú Soludo

Ebe foto si, Soludo TV

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

E duru Charles Chukwuma Soludo iyi ọrụ dịka gọvanọ ọhụrụ n'Anambra steeti n'ogige gọomentị steeti ahụ taa bụ ụbọchị 17 nke ọnwa Maachị, 2022.

Soludo abụrụla gọvanọ nke isii steeti ahụ.

E dukwara Onyekachi Ibezim iyi ọrụ dịka osote gọvanọ Anambra Steeti.

Kirie ihe onyonyo a ka ị hụ etu Dkt Ibezim na Ọkammụta Soludo si ṅụọ iyi ọrụ ha:

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Soludo na Ọkaikpe Ukwu Anambra steeti

Ebe foto si, Soludo Media

Joe Anatune bụ onye nchịkọta mgbasaozi 'Soludo Media' sị na ya bụ emume nke ọtụtụ mmadụ agaghị abịa ga abụ n'obi ndị gọọmentị Anambra steeti dị n'Agụ Awka.

Ka ọ dị ugbua, ndị mmadụ nwere agba bụ ndị a kpọrọ oku abatawala n'ogige ahụ.

Ogige Gọọmenti ebe aga-edu Ọkammụta Soludo iyi ọrụ

Onye okaikpe steeti ahụ bụ Onochie Anyachebelu duru ha abụọ 'iyi ọrụ.

Okaikpe Ukwu Anambra steeti
Willie Obiano bụbu gọvanọ Anambra steeti nyefere Ọkammụta Soludo ọchịchị
Nkọwa foto, Willie Obiano bụbu gọvanọ Anambra steeti nyefere Ọkammụta Soludo ọchịchị

Ọkpụrụkpụ okwu sị n'Okwu mbụ Gọvanọ Charles Soludo kwuru dịka gọvanọ

  • Ọ malitere ịdọ ndị na-eme mkpọtụ na steeti ahụ aka na ntị sị ha nye efe ma ọ bụrụ na ha achọghịzị ịnọ maka na "Anambra anyị na-ekwu maka ya bụ ebe udo na-achị".
  • Ọ sị na ya chọrọ ịgbapụ ya ọsọ maka na ndị mmadụ na-eche ya maka nzụkọ mbụ ya nwere taa na ya chọrọ itinye awa asatọ zụrụ oke n'ọrụ nke taa.
  • Ka ọ malitere okwu ya, o kelechere Osote ya bụ Mazi Onyekachukwu Gilbert Ibezim ya na oriaku ya bụ Nnonye Francess Soludo.
  • Ọ miltere gụwa egwu: "Ihe Chukwuru kwuru okwugonụ ya, Ihe ọ okwuru ga-eme..."
Willie Obiano
Nkọwa foto, Willie Obiano, gọvanọ ochie Anambra steeti
  • Ọ chetere ma kwanyere ugwu ndị uweojii ahụ agbagburu mgbe ọ gara ịchụnta vootu n'Isuọfịa afọ gara aga.
  • Ọ kpọrọ aha ha ka; Inspectọ Murtala Saudi, Mudashiru Ahmed na Samuel Ishaya bụ ndị o ji egbe amaghị ndị ha bụ gbagburu.
  • Ọ kelekwara Gọvanọ nke nyefere ya ọchịchị bụ Willei Madụabụrọchukwu Obiano.
  • Ọ kwuru na ọ na-ekele ya maka idobe nkwa ọ kwere ya kemgbe, ma sị na ọ bụ ezigbo onye ọchịchị.
Ndị ọkaikpe doro Soludo n'iyi ọrụ
  • Ọ kelekwara onyeisi pati All Progressives Grand Alliance (APGA) bụ Victor Ike Oye na ndị pati ha niile maka nkwado ya.
  • Solude jikwa ohere ahụ kele ndị kọmiti ọ hibere maka ịtụtara ya alọ dị otu narị na iri ise nke Oby Ezekwesili nọ n'isi ya.
  • Ọ sị na ya na-ekele ndị ọrụ nchekwa na ndị ọrụ ngalaba 'Independent National Electoral Commission' (Inec) maka ike ha kpara ịhụ na ntuliaka 2021 wepụtara ya gara nke ọma.
  • O jikwa otu ọnụ ahụ keele onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari maka nkwado ya n'ọchịchị onye kwuo ụche ya.
Ido n'iyi órú Soludo
  • Ọ kwuru na ụgwọ ya ji ha niile bụ ịrụsị ọrụ ya ike rụọ mgbe ya ga-aritu na ya bụ oche ọchịchị.
  • Ọ chetere nne ya na nna ya bụ nke ọ sị na nna ya na-ekiri ya bụ emume n'onyonyo ebe "nne me nọ n'ile aṅụrị".
  • Soludo sị na ha nwerela otu ọnwa kemgbe ha nwetere mmeri ntụlịaka ahụ nwere mee nwee aṅụlị so ya ma kwuo "ugbua oge ọrụ eruola".
  • O kwuru na ya ga-etinye uche ịhụ na nchekwa dị n'Anambra steeti ọkachasị dịka mwakpo na-arị ibe ya elu na steeti ahụ.
Charles Chukwuma Soludo na Onyekachi Ibezim aṅụọla iyi ọrụ dịka gọvanọ na osote gọvanọ Anambra steeti
Nkọwa foto, Charles Chukwuma Soludo na Onyekachi Ibezim aṅụọla iyi ọrụ dịka gọvanọ na osote gọvanọ Anambra steeti
  • Ọ sị na ya ga-akpọpụta ndị kọmishọna ya mgbe na-adịghị anya.
  • O kwuru na ọ ga--agba mbọ ihu na nwata obụla ruru ịga akwụkwọ na steeti ahụ gara akwụkwọ etu o ruru ya.
Gọvanọ Chukwuma Soludo
  • Soludo sị na uche ya adịghị na ịna ụmụnwaanyị n'azụahịa ụtụisi, ma kwuo na ọ ga-ahụ na ya na-akwụchị ụgwọ ọnwa na ụkwọ ndị ezụmike nka anya.
  • Ọ sị na taa bụ ụbọchị mbụ n'ọrụ nke mere na ya ga aru awa asatọ taa.
  • O kwukwara na taa guzoro na ntọala ndị niile chigoro ala Igbo malite na Chukwuemeka Ezeife, Chiwoke Mbadi na Uju, Christina Onoh, Jim Nwobodo, Peter Obi na Willie Obiano.
  • Ọ sị na odoro ya anya na ọtụtu mmadụ nwere ntụkwasi obi na-ebe ọ nọ.
  • N'okwu ya, ọ kọwara etu ndị mmadụ si nwee ntụkwasị obi n'ebe ọ nọ nke bụ na ọ dị ụfọdụ ka ọ bụrụ na ya welie aka elu, nsogbu nille alaa.
"Ekwuru m na ụgbọ na ihe niile m ga-eyi ga-abụ ihe arụpụtara n'aka ndị Anambra" Ọkammụta Soludo
Nkọwa foto, "Ekwuru m na ụgbọ na ihe niile m ga-eyi ga-abụ ihe arụpụtara n'aka ndị Anambra" Ọkammụta Soludo

"Akwụ m nzọmụkwụndị bu m ụzọ"

  • Soludo sị na ihe ya yi n'olu na-echetere ya maka ndị niile chigoro Africa.
  • Ọ kwukwara maka otu pati APGA nke ọ sị na ebumnobi ha bụ ọchịchọ ọdịmma ndị Igbo.
"Ekwuru m na ụgbọ na ihe niile m ga-eyi ga-abụ ihe arụpụtara n'aka ndị Anambra" Ọkammụta Soludo
Nkọwa foto, "Ekwuru m na ụgbọ na ihe niile m ga-eyi ga-abụ ihe arụpụtara n'aka ndị Anambra" Ọkammụta Soludo
  • Ọ sị na ha gọọmentị ya ga-ebuli ọrụ ndị niile ndị chogoro rụgọrọ na steeti ahụ.

Kedụ ihe o kwuru maka mmepụta ego?

  • Soludo sị na ya ma na ego adịghị mana ya ga-ahụ na ego ọ bụla dị ga-aba n'ọrụ.
  • Ọ kwukwere na ihe mere na ya achọghị iji ego Anambra steeti mee oriri na ngwọrị na a ga-eji ego niile ekwesiri iji mee oriri ebe ahụ rụọ ụlọọgwụ.
Peter Obi
Nkọwa foto, Peter Obi gara emume ido n'iyi ọrụ Soludo
  • Ọ sị na ya agaghị enwe oriri na Steeti ahụ ruo mgbe ọkụ latrịk, mmiri, ụbịam, nchekwa batara na steeti ahụ ma kwusie ike na ya agaghị eji ego ndị Anambra gbaa origo.
  • Ọ sị na ọrụ ya ga-agbado ụkwụ na akwụkwọ nke si na ọgbakọ ha mere
  • Ọ sị na ya ga-amalite ọrụ ya na Okpoko
  • Ọ sị na ya chọrọ ịrụ Anambra
  • Gọvanọ Soludo sị na ya ga-ahụ na iwu na udo na-achị na steeti ahụ.
  • "Malite echi bụ ụbọchị nke iri na asatọ nke ọnwa Maachị, onye ọbụla siri gị kwụọ ya ụtụisi n'aka bụ onye ohi".
  • Mana ọ na-arịọ ndị mmadụ ka ha nwee nghọta ma nweere ya ndidi.

Onye bụkwanụ Osote Gọvanọ Anambra ọhụrụ?

Nwunye Gọvanọ Anambra, Nonye Soludo, Ọkammụta Chukwuma Soludo nakwa Dọkịnta Onyekachi Ibezim, osote Gọvanọ Anambra steeti ka ha na-abata ogige Gọọmenti ebe a ga-edubanye ha n'ịṅụ iyi ọrụ

Ebe foto si, Soludo TV/Facebook

Nkọwa foto, Nwunye Gọvanọ Anambra, Nonye Soludo, Ọkammụta Chukwuma Soludo nakwa Dọkịnta Onyekachi Ibezim, osote Gọvanọ Anambra steeti ka ha na-abata ogige Gọọmenti ebe a ga-edubanye ha n'ịṅụ iyi ọrụ
  • Dọkịnta Onyekachukwu Ibezim, tupu ọ bụrụ osote Govanọ Anambra Steeti bụbu onye ndụmọdụ Gọvanọ Obianọ n'ihe gbasara ndị ntoroọbịa ma bụbukwa onyeisi ụlọọrụ AIDS Control Agency (ANSACA) maka ndị na-arịa ọrịa mkpọnwụ n'Anambra steeti.
  • Ibezim si Ovulu Umuoma na Mbaukwu, n'okpuruọchịchị Ọka Saut n'Anambra Steeti.
  • Ọ bụ onye oke amamihe n'ihe gbasara ahụike obodo ma bụrụkwa dọkịnta ahụike
  • Ọ bụ nwanne Arkbishop Awka Diocese bụ Ụkọchukwu Alexander Ibezim.
  • Ọ bụ onye ụka Kraịst ma bụrụkwa nna na di ọmalịcha Oriakụ.
Osote Gọvanọ na nwunye ya
Nkọwa foto, Osote Gọvanọ bụ Dkt Onyekachi Ibezim na nwunye ya na-aritu ka ha binyechara aka ka e duru Dkt Ibezim n'iyi ọrụ

Ọkammụta Patrick Utomi, Chiwetalu Agu, Bianca Ojukwu na ndị ọzọ bịara ya bụ mmemme

Pat Utomi
Nkọwa foto, Ọkammụta Pat Utomi so na Transition komitee Ọkammụta Soludo hibere maka iwepụta atụmatụ nchịkọta steeti bịakwara gara emume ido n'iyi ọrụ Soludo

Ọkammụta Pat Utomi so na Transition komitee Ọkammụta Soludo hibere maka iwepụta atụmatụ nchịkọta steeti bịakwara gara emume ido n'iyi ọrụ Soludo.

Bianca Ojukwu
Nkọwa foto, Bianca Ojukwu

Odoziakụ Bianca Ojukwu, nwaada aka chibụrụ Anambra steeti bụ CC Onoh nakwa nwunye Ike mba Nnewi; Chukwuemeka Odimegwu Ojukwu bụbu onyeisi agha duru agha Biafra.

Nonye Francess Soludo

Bianca Ojukwu ka ọ nọ ebe a na-eche ka ịṅụ iyi bido. Tupu ya bụ esemokwu n'etiti ya na Ebere Obiano eme.

Aha onyonyo, Bianca Ojukwu and Ebele Obiano: E nwere onye agbara aka ntị n'ịṅụ iyi Soludo?
Chiwetalú Agu
Nkọwa foto, Chiwetalu Agu gara emume ido n'iyi ọrụ Soludo

Chiwetalu Agu bụ onye amaama na-eme ejije Nollywood bịakwara emume idu n'iyi ọrụ Soludo

Lee ndị Nze na ọzọ bịara nnyefe ọchịchị
Nkọwa foto, Lee ndị Nze na ọzọ bịara nnyefe ọchịchị