Bianca Ojukwu: Kedụ ihe ị ma maka ya?

Bianca Ojukwu: Ihe ndị dị mkpa i kwesịrị ịma maka ya

Ebe foto si, Bianca Ojukwu/Insta

Nkọwa foto, Bianca Ojukwu: Ihe ndị dị mkpa i kwesịrị ịma maka ya
    • Onye dere ya, Chris Sanctus Okereke & Adline Okere
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Abịa n'ala Igbo nakwa na mba Naịjirịa gbaa gburugburu aha otu nwaanyị na-ada ụda maka ọtụtụ ndị dị mma bụ Bianca Ojukwu.

Ewezuga mma ọ mara n'ụzọ pụrụiche, e nwere ihe ndị ọzọ banyere ya mere o jiri bụrụ okwu akpụ n'ọnụ n'Afrịka.

Aha onyonyo, Bianca Ojukwu and Ebele Obiano: E nwere onye agbara aka ntị n'ịṅụ iyi Soludo?

Agbanyeghị esemokwu dị n'etiti ya na nwunye Obiano mere ka o wuo n'ụbọchị Tọzde, 17 Maachị 2022, ụbọchị idu n'iyi ọrụ nke Ọkammụta Soludo, e nwere ụfọdụ ihe ị kwesịrị ịma maka Bianca Ojukwu.

Bianca Ojukwu: Ihe ndị dị mkpa i kwesịrị ịma maka ya

Ebe foto si, Bianca Ojukwu/Insta

Nkọwa foto, Bianca Ojukwu: Ihe ndị dị mkpa i kwesịrị ịma maka ya

Kedụ onye Bianca Ojukwu bụ?

N'afọ 1989, Bianca Odinakachukwu Olivia Odumegwu-Ojukwu meriri nturuugo elelebe e jeghị ọrụ ụmụaghọghọ nke a kpọrọ 'Most Beautiful Girl in Nigeria' nke ndị ụlọọrụ Silverbird na-eme kwa afọ.

Bianca Ojukwu

Ebe foto si, Bianca Ojukwu/ facebook

Nkọwa foto, Bianca Ojukwu bụ onye meriri n'asọmpị 'nwaanyị kachasị maa mma' na Naịjirịa nke afọ 1988

Bianca bụ nwaanyị onye ndọrọndọrọ ọchịọchị na Naịjirịa, ọ gụrụ akwụkwọ dịka onye ọkaiwu, bụrụkwa onye ruru ọrụ dịka onye nnọchịte anya mba Naịjirịa na mba ndị ọzọ, gụnyekwa na Bianca bụ kwa onye oji ego achụ ego.

Amụrụ ya n'ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọst 1968.

Nne Bianca Ojukwu bụ Carol Onoh onye mụrụ ya na ụmụnne ya ise bụ Lilian, Josephine, Nuzo, Gabriel, na Joseph

Ebe foto si, Bianca Ojukwu/Facebook

Nkọwa foto, Nne Bianca Ojukwu bụ Carol Onoh onye mụrụ ya na ụmụnne ya ise bụ Lilian, Josephine, Nuzo, Gabriel, na Joseph

Nna ya bụ Christian Onoh onye bụbu gọvanọ Anambra steeti ochie ebe nne ya bụ Carol onye rụrụ ọrụ dịka onyeisi ụlọakwụkwọ.

Bianca toro n'obodo nna ya bụ Ngwo nke Enugu steeti.

Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadam Buckingham, nakwa mahadum Naịjirịa dị na Nsukka ebe o natara nzere dịka ọkaiwu.

O nweterekwara ntozuoke ịbụ onye ọkaiwu ma rụọ ọrụ dịka onye ọkaiwu nwamgbe nta tupu o banye ọrụ nke ya dịka onye o ji ego achụ ego na ngalaba na-emepụta uli ntecha ụmụnwaanyị nakwa ngalaba na-emezi ime ụlọ ndị mmadụ.

Mgbe Bianca Onoh ritere nturugo n'asọmpị ụmụnwaanyị kacha mma na Naịjịrịa nke afọ 1988

Ebe foto si, Bianca Ojukwu

Nkọwa foto, Mgbe Bianca Onoh ritere nturugo n'asọmpị ụmụnwaanyị kacha mma na Naịjịrịa nke afọ 1988

Kedụ ka aha Bianca Ojukwu si fesa mba Naịjirịa niile?

Bianca banyere ọrụ isonye asọmpị elelebe e jeghị ọrụ ụmụnwaanyị olemole ma nwete nturuugo dị icheiche.

O nwetere nturuugo n'asọmpị elelebe e jeghị ọrụ ụmụnwaanyị n'afọ 1988, o turukwara ugo n'asọmpị nwaanyị kacha mma n'Afrịka n'afọ 1989.

N'otu afọ ahụ, o merikwara n'asọmpị ụmụnwaanyị nke 'Miss Intercontinental' nke mba 60 dị ịche ịche na-esonye n'ime ya.

Mgbe ọ gụchara akwụkwọ na mahadum dịka onye ọkaiwu

Ebe foto si, Bianca Ojukwu/Facebook

Nkọwa foto, Mgbe ọ gụchara akwụkwọ na mahadum dịka onye ọkaiwu

Ihe kwesịrị ịma maka ọrụ ya

Bianca Ojukwu ruturu ọrụ dịka onye ọkaiwu tupu o hibe ụlọọrụ nke ya.

Otu ụlọọrụ ya na-emepụta uli ntecha dị ịche ịche be nke ọzọ na-emezi ime ụlọ ndị mmadụ.

N'afọ 2011, aka chịbụrụ Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan họpụtara ya dịka onye enyemaka pụrụiche na ihe banyere mmekọ mba na mba.

N'afọ 2012 ahọpụtara ya dịka onye nnọchịte anya Naịjirịa na mba Ghana nakwa mba Spain.

N'afọ 2016, o natara nturuugo nke nyere ya asambodo na ngalaba mmekọ mba na mba na mahadum Alfonso X el Sabio dị na Spain bụ ebe ọ rụrụ ọrụ.

Dịka onye ndọrọndọrọ ọchịchị, Bianca Ojukjwu nọ n'otu pati APGA nke di ya hibere

Ebe foto si, Bianca Ojukwu/Facebook

Nkọwa foto, Dịka onye ndọrọndọrọ ọchịchị, Bianca Ojukjwu nọ n'otu pati APGA nke di ya hibere

Ugbua, ọ na-anọchịte anya Naịjirịa na ngalaba otu jịkọrọ mba ụwa bụ United Nations nke na-ahụ maka njem nlere anya (United Nations World Tourism Organization).

E chiri ya echịchị ụmụnwaanyị olemole n'ala Igbo dịka ọ bụ oke nwaanyị Igbo ji eme ọnụ.

Ọ bụ onye otu patị All Progressives Grand Alliance (APGA) nke di ya hibere nke bụkwa Patị nọ n'ọchịchị n'Anambra steeti ruo ugbua.

Ihe ị kwesịrị ịma maka alụmdịnanwunye ya

Agbamakwụkwọ Bianca na Odumegwu Ojukwu e mere n'Abuja

Ebe foto si, Bianca Ojukwu/Facebook

Nkọwa foto, Agbamakwụkwọ Bianca na Odumegwu Ojukwu e mere n'Abuja

Bianca lụrụ otu onye Igbo akacha mara bụrụkwa onye ọtụtụ na-akwanyere oke ugwu ruo taa.

Di ya bụ Chukwuemeka Odumegwu-Ojukwu onye bụ ọchịagha ndị agha Biafra ma bụrụkwa otu onye ọchịchị na Naịjirịa oge gara aga.

Ha mere agbamakwụkọụ ha n'afọ 1994 n'Abụja ma mụtakwa ụmụ atọ n'ime alụmdinanwunye ha.

Okwu ịke akụnụba di ya mgbe ọ nwụrụ butere ọtụtụ ọgbaghara n'etiti ya na ndị ezinụlọ di ya

O rịọrọ ka ndị mmadụ hapụ di ya ka ọ laa na ndokwa ma kwuo na di ya bụ onye ekwesịrị ikwanyere ugwu.