Governor Charles Chukwuma Soludo: Ihe ndị Anambra steeti chọrọ n'aka ọchịchị ya

Aha onyonyo, Governor Charles Chukwuma Soludo: Ihe ndị Anambra steeti chọrọ n'aka ọchịchị ya

Ụfọdụ ụmụafọ Anambra Steetị ekwuola ihe ha chọrọ n'aka Charles Soludo dịka a ga-edu ya n'iyi ọrụ gọvanọ n'ụbọchị 17 Maachị, 2022.

Soludo meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra nke e mere n'ọnwa Nọvemba afọ 2021.

BBC Igbo gara n’isi obodo Anambra Steeti bụ Awka ịchọpụta ihe bụ olileanya ndị mmadụ n'ebe ọchịchị Soludo nọ n'ime afọ na-abịa abịa.

Otu nwokorọbịa na nwagbọghọbịa sị na ha chọrọ ka Soludo leba anya n'ihe banyere nchekwa obodo, ọkachasị ndị otu nzuzo na-akpa ike n'Awka na gburu gburu ya.

Ihe ndị Anambra chọrọ n'aka Soludo

Otu nwaanyị na-ere ahịa mbugharị sị na ọ chọrọ ka Soludo binye ndị na-azụ ahịa ego iji kwalite azụmahịa ha.

Ụfọdụ ndị ọzọ kwukwara na mmepe obodo, mmụbawanye akụnaụba na ihe ndị ọzọ bụ mkpa ha chọrọ ka Soludo gboo n'ime.

Anambra steeti so na steeti ndị di n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ebe azụmahịa nakwa iji ego chụọ ego bụ isi mmiri akụnaụba ha.

Gere ihe ha kwuru n’uju n'ime ihe onyonyo a.