Unknown gunmen attacks: Ọ bụ eziokwu na e gburu ndị nchekwa n'ụlọụka dị n'Ekwulobia?

St Joseph Cathederal Ekwulobia

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra Steetị bụ Tochukwu Ikenga ekwuola ihe mere n'Ekwulobia ebe a sị a ndị oji egbe gbagburu ndị nchekwa n'ụlọụka St. Joseph Cathederal.

Ikenga gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ndị oji egbe gbara egbe n'ogbe ahụ kama na ọ bụghị ụlọụka ka ha wakporo kpọmkwem.

O kwuru "ndị oji egbe awakpoghi ụlọụka ahụ kpọmkwem dịka akụkọ asịrị si kwuo."

"ndị oji egbe nọ na-agbafe n'okporoụzọ dị n'ihu ụlọụka a n'ihe dịka elekere iri nke abalị Mọnde 4 Eprel, 2022 ma malite ịgba egbe aghara aghara."

"Mgbọ egbe ha tụtara otu onye nchekwa nọ n'ụlọụka St Joseph's Cathedral dị n'obodo Ekwulobia, okpuruọchịchị Aguata ma gbuo nwoke ahụ."

Ndị oji egbe eyi egwu
Nkọwa foto, Ndị oji egbe eyi egwu

Ikenga kwuru sị "ihe ndị a mere bụ iji tinye ndị mmadụ egwu n'ahụ maka ekpere e mere n'ụbọchị Mọnde".

Ikenga gara n'ihu kwuo na nyocha ka na-aga n'ihu ugbua banyere ihe a mere ma rịọ ka ndị mmadụ dere jụụ.

Azịza ndị uweojii a na-eso kepu kepu na-ekwu na ndị oji egbe a na-akpọ wakporo ụlọụka a maka ha mere ekpere iji pịachie 'sit at home' nke Gọvanọ Chukwuma Soludo hiwere.

Mwakpo a na-abịa dịka a wakpochara ndị ọrụ 'Road Safety' n'okporoụzọ Igboukwu dị n'Ezinifite na Sọnde 3 Eprel, 2022 ma gbuo mmadụ abụọ.

Gịnị jịkọrọ ekpere na mwakpo ndị omekome a?

Gọvanọ Anambra Steeti bụ Charles Soludo dịka ọ na-ekwe ekpere

Ebe foto si, Charles Soludo/Facebook

Nkọwa foto, Gọvanọ Anambra Steeti bụ Charles Soludo dịka ọ na-ekwe ekpere

Gọvanọ Anambra Steetị bụ Chukwuma Soludo ekkwuru na otu Indigenous People of Biafra (Ipob), ndị ndu obodo nakwa ndịisi ụlọụka kwadoro ya ka e kpochapụ atụmatụ 'sit-at-home'.

Soludo kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ na Channels TV n'abalị ụbọchị 3 Eprel 2022 banyere ọnọdụ nchekwa na etu ọ ga-esi rụọ ọrụ.

N'okwu ya, "anyị amalite ịkpọku nakwa ịkparịtaụka n'etiti ndị o metụtara maka na ihe niile abụghị ihe a na-emeta n'ụzọ ikike".

"Anyị akagbuola atụmatụ ịnọ n'ụlọ dịka ndị ndu obodo, ndịisi ụlọụka, ndị Ipob na ndị ọzọ kwadoro anyị n'atụmatụ ahụ."

Soludo sị malite Mọnde 4 Eprel, 2022 na a ga-enwe ọgbakọ ekpere n'ụlọụka niile dị n'Anambra nakwa Ọwụwa Anyanwụ iji kagbuo atụmatụ 'sit-at-home'.

Kama ndị omekome a hụrụ ọkwa a dịka imegide iwu ha hiwere gbasara Sit-at-home n'ụbọchị mọnde niile nke mere ka ha gaa Ekwuloboa gbaa egbe etu ha siri gbaa n'abalị mọnde.

Kedụ mgbe sit at home malitere?

Atụmatụ onye apụla ezi a na-akpọ 'sit-at-home' bụ iwu ndị Ipob hiwere iji gosi na ndị Ọwụwa Anyanwụ kwadoro ọchịchọ nnwereonwe.

Ha na-emekarị ya n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee kwa afọ, iji kwanyere ndị nwụrụ n'oge agha Biafra ugwu.

Kamgbe gọọmentị Naịjiria nwuchigharịrị Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Ipob, ha meziri ka 'sit-at-home' bụrụ ụbọchị Mọnde ọbụla nakwa ụbọchị ọbụla Kanu ga-aga n'ụlọikpe.

Ha sị na ha agaghị akwụsị atụmatụ a ma ọ bụrụ na gọọmentị Naịjirịa atọhapụghị Kanu.

Ipob dọrọ aka na ntị na onye ọbụla pụtara ezi n'ụbọchị ndị ahụ ga-eji isi ya buru ihe o kotere.

Ha mechara kagbuo ya mana ọtụtụ ndị otu ha jụrụ ajụ, ebe ndị oji egbe na-awakpo ma na-egbu ndị pụtara ezi.