Ụlọọrụ Road Safety akọwaala etu unknown Gunmen si gbuo ndị otu ha abụọ

Ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ FRSC

Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Federal Road Safety Corps (FRSC) n'Anambra steeti bụ Margaret Onabe akọwaala etu ndị oji egbe si gbuo ndị ọrụ ha abụọ.

Ọ gwara BBC Igbo na o mere n'ụbọchị Sọnde abalị atọ n'ọnwa Eprel, 2022 mgbe ndị oji egbe a wakporo ha n'okporoụzọ dị n'okpuruọchịchị Ezinifite nke Anambra steeti.

N'akwụkwọ ozi ụlọọrụ ha wepụtara, ha sị na ndị ọrụ ha nọ n'ọrụ n'ụzọ Igbo-Uku-Uga mgbe ndị omekome a bidoro gbawa ha egbe.

Ha kwuru na ndị a gburu ndị ọrụ ha abụọ, gbata otu onye egbe ebe onye ọzọ gbabara n'ime ọhịa.

Boboye Oyeyemi bụ Corps Marshal tiri ezịnaụlo ndị nwụrụ kaka n'obi ma sị, " Anyị na ndị uweojii na-arụkọọrụ iji hụ na ejidere ndị kpara mkpamkpa a ma kpee ha ikpe etu ọ kwesịrị.

Ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ FRSC na-arụ ọrụ ịhụ na ụgbọala na ndị na-anya ya tozuru ma nọrọ n'ọnọdụ ziri ezi site n'usoro nchekwa iwu Naịjirịa

Ebe foto si, FRSC/Facebook

Nkọwa foto, Ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ FRSC na-arụ ọrụ ịhụ na ụgbọala na ndị na-anya ya tozuru oke

Ụfọdụ foto apụtakwala na soshal midia nke gosiri ndị a sị bụ ndị ọrụ FRSC a agbagburu mana BBC Igbo ka na-agba mbọ ima nke bụ eziokwu na foto ndị a niile na-efegharị.

Nke a na-abịa dịka naanị otu abali gacharala mgbe gọvanọ ọhụrụ steeti ahụ bụ Chukwuma Soludo mere ọgbakọ pụrụiche maka okwu nchekwa na steeti ahụ na Dora Akunyili Centre dị n'isi obodo steeti ahụ bụ Awka.

N'ọgbakọ ahụ, Soludo kwuru na ọchịchị ya dị njikere ka a kpaa akpaa ka udo wee dị n'Anambra steeti.

Ọ kpọrọ aha mpaghara Ezinifite n'okwu o kwuru n'ọgbakọ ahụ

N'okwu ya ọ sị:

"Ya mere, a na m akpọku ụmụ okorobịa niile bu egbe nọrọ n'ime ọhịa, ma ndị nọ n'Orsumoghu, ma ndị nọ na Lilu, ma ndị nọ Ụkpọ, ka ị nọ Unubi, ka ị nọ Ezinifite, ka ị nọ Aguluezechukwu, pụtanụ pụtanụ, bịanụ ka nyị dozie be anyị."

Ndị o ji egbe awakpola akụkụ dị ịcheịche n'Orsu, Imo steeti ugboro ugboro na nso nso a

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị o ji egbe awakpola akụkụ dị ịcheịche n'Orsu, Imo steeti ugboro ugboro na nso nso a

Mwakpo mere n'Orsu, Imo steeti

Akụkọ si Imo steeti apụta taa bụ Sọnde ụbọchị atọ n'ọnwa Eprel, 2022 na-ekwu na ndị o ji egbe nke amabeghị ndị ha bụ wakporo isi ụlọọrụ okpuruọchịchị Orsu.

Otu nwaada bi ebe ahụ na-achọghị ka akpọ aha ya kwuru na mwakpo a mere n'ebe elekere abụọ na ọkara nke isi ụtụtụ Sọnde.

O kwuru na ndị ahụ wụbanyere n'ime ogige isi ụlọọrụ ahụ gbaa akụkụ ọtụtụ ụlọ nọ ebe ahụ ọkụ nke gụnyere ụlọ onyeisi oche ya bụ ụlọọrụ.

Nwaada ahụ sị na a gbara ọtụtụ ugboala ndị e busara ebe ahụ ọkụ ma gbakwa akụrụngwa ndị ọzọ e ji arụ ọrụ n'ụlọọrụ ahụ ọkụ.

Otu nwoke ọzọ bi ebe ahụ na-achọghị ka akpọ aha ya gbara ama ihe a mere ma kwuo na egwu ji ha dịka Orsu abụrụla ebe oke mwakpo na-adapụta na nso nso a.

O kwuru:

"Ndị mmadụ anaghịzị abịa ebe a, ọkachasị ụmụnwoke maka etu ọtụtụ mwakpo si arị ibe ya elu na mpaghara Orsu niile"

Ndị uweojii n'Imo steeti na-ekwu na ha amaghị ihe ọbụla banyere akụkọ a.

Ọnụ na-ekwuru ha na steeti ahụ bụ Michael Abattam kwuru n'ụbọchị Sọnde mgbe onye ntaakụkọ BBC Igbo kpọrọ ya:

"Amaghị m ihe ọbụla maka akụkọ mwakpo a mana agam eme nnyocha ma jụọ onye nlekọta ndị uweojii (Divisional Police Officer) n'Orsu maka ya"

Ọwụwa Anyawụ Naịjirịa abụrụla ebe mwakpo na-arị ibe ya elu ọkachasị n'akụkụ Imo na Anambra steeti
Nkọwa foto, Ọwụwa Anyawụ Naịjirịa abụrụla ebe mwakpo na-arị ibe ya elu ọkachasị n'akụkụ Imo na Anambra steeti

Ọnọdụ nchekwa na Anambra na Imo steeti

Kemgbe afọ 2021 Orsu nke Imo steeti nakwa Ihiala nke Anambra steeti abụrụla ebe ndị dị egwu nye ndị mmadụ dịka mpaghara ebe ndị ahụ so n'ebe akụkọ mwakpo na-esikari apụta nke gụnyere: mwakpo ụlọọrụ ndị uweojii, mwakpo be ndị mmadụ, mwakpoo ndị ọrụ nchekwa, mwakpo ụlọọrụ gọọmentị dị ịcheịche nakwa ebe ndị ọzọ.

Gọọmentị steeti ndị a ekwuola ugboro ugboro na ha na-agba mbọ iweghachite udo na nchekwa n'ebe ndị a.

N'ọnwa Disemba 2021, ndị uweojii Naịjirịa kwuru na ha nwụchịrị mmadụ 30 a na-enyo enyo maka ebubo iso eme mwakpo ndị a n'okpuruọchịchị Orsu nakwa Ihiala.

Ndị uweojii kwukwara na ha gbapụtara ọtụtụ ndị a sị ndị a tọrọ nke gụnyere Eze obodo Ihube bụ Acho Ndukwe.

Na ọdịnso a, akụkọ mwakpo ndị a na-eme n'Imo steeti eruola onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ntị ọkachasị mwakpo e mere n'Awo-Omamma, bụ na be onyeisi otu Ohaneze ndigbo bụ George Obiozo.

Onyeisiala Buhairi kwuru na ihe a mere gbawara ya obi ma katọọ ya.

Ọ gara n'ihu kpọkụọ Gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo steeti maka ọgbakọ ime ụlọ pụrụiche nke ha abụọ nwere n'obi gọọmentị Abuja banyere ọnọdụ nchekwa n'Imo steeti n'ụbọchị 21 nke ọnwa Maachị, 2022.

Gọvanọ ọhụrụ nke Anambra steeti bụ Chukwuma Soludo ekwuola na nchekwa so n'ihe ndị kacha eche ya na steeti ahụ ugbua nke mere o ji akpọ oku udo nye ndị otu o ji egbe dị ịche ịche.

Ọ rịọla ma tie iwu ka a kagbuo iwu onye nọrọ n'ụlọ bụ sit-at-home a na-eme na steeti ahụ.

Kwa ụbọchị Mọnde ọbụla n'Ọwụwa anyanwụ Naịjirịa, ndị mmadụ na-anọ n'ụlọ maka iwu onye nọrọ n'ụlọ nke otu Indigenous People of Biafra (Ipob) tibụrụ ma mecha kagbuo.

Ugbua, Ipob ka na-dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha rubere ya bụ iwu isi naanị ụbọchị onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu pụtara n'ụlọikpe.

Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu na-azọ maka nnwereonwe Biafra nke gọọmentị Naịjirịa nwụchịrị n'afọ 2021 maka ebubo ole m ole.

Gọọmentị Naịjirịa sị na ọ bụ na mba Kenya ka ha si nwụchie ya, ma kpụlata ya Naịjrịa ka ọ zara ọnụ ya n'ụlọikpe maka ebubo iyi ndụ egwu nakwa ịchọ ịkwatu gọọmentị.

N'ihi nnwuchi a nwụchiri Kanu, ndị Ipob kwuburu na ha ga-emechi ala Igbo niile kwa ụbọchị Mọnde ọbụla iji gos iwe ha.

Ha kwuru na onweghị onye ọbụla ga-apụ ezi n'ụbọchị Mọnde, ruo mgbe gọọmentị etiti tọhapụrụ Kanu.

Ọtụtụ mwakpo na-adapụtakari n'ụbọchị Mọnde izu ọbụla n'ihi otu ndị o ji egbe dị ịcheịche ka na-amanye ndị mmadụ iwu ịnọ n'ụlọ a n'ike.