George Obiozor: Buhari agbarụọla ihu maka mwakpo e mere n'ụlọ ya

bbc

Ebe foto si, Onyeisiala Buhari na George Obiozor

Onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla mwakpo mere n'Imo Steeti nke gụnyere ogbugbu ndị uweojii na ịgba ụlọ onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ George Obiozor ọkụ.

N'ozi onye ndụmọdụ ya bụ Garba Shehu wepụtara, Buhari tiri Obiozor na ndị uweojii aka n'obi maka ọdachi ahụ.

Aha onyonyo, George Obiozor: Nnamdi Kanu bụ nwa anyị, okwu Biafra abụghị okwu ụmụntakịrị

Buhari sị na mwakpo ndị a bụ ihe oke mwute ma kwee nkwa na ọnọdụ nchekwa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ ihe a na-eleba anya.

Ọ rịọrọ ndị Imo Steeti ka ha dere jụụ ma nyere ndị uweojii aka ịchọpụta ndị na-akpa arụ.

Ihe Gọvanọ Hope Uzodinma kwuru maka mwakpo ụlọ George Obiozor

Hope Uzodinma

Ebe foto si, Hope Uzodinma/Facebook

Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma ekwuola na ọ bụ ndị omekome si n'aka ndị ndọrọndọrọ ochịchị tụrụ ogbunigwe n'ụlọ onyeisi otu Ohaneze ndigbo bụ George Obiozor n'isi ụtụtụ Satọde.

Uzodinma kwuru na ọ bụ ihe nwute na ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ekweteghị na ọbụghị ọgụ ka aga-eji egbo nsogbu, agbanyeghị arịrịọ a na-arịọ ha.

O bụ n'akwụkwọ ozi gọọmentị Imo steeti depụtara ka o kwuru nke a.

O gosịpụtara obi nwute ya na ọ bụ ọgbaaghara oge niile ka ụfọdụ ndị ndọrondọrọ ọchịchị ji egbo nsogbu ha ma sị na Gọọmentị Imo Steeti agaghị anabata ụdịrị agwa a ọzọ.

N'okwu, ọ gara n'ihu kọwa, " Oge ndị na-akpa ụdịrị mkpamkpa n'Imo steeti abịala n'isi njedebe. Anyị ga-achọta ha ma hụ na atara ha ahụhụ dịka iwu Naijirịa siri dị".

Uzodinma kwuru na ọ ghọtaghi ihe eji wakpoo ụlo onye na-abụghị onye ndọrọndọrọ ọchịchị kama na ọ bụ onye na-achọ ọdịmma ndị Igbo.

Dịka o tiri George Obiozor aka n'obi, ọ gwara ndị Imo Steeti na gọọmentị ga-eme ihe niile dị n'ikike ya ịhụ na echekwara ndị nakwa akụnụba ndị Imo steeti niile.

Ihe ndị uweojii kwuru maka ijide ndị gbara ụlọ onyeisi Ohaneze Ndigbo ọkụ

George Obiozor

Ndị uweojii nke Imo steeti ekwuola na ha ebidola nyocha ha ji achọpụta ma nwuchie ndị wakoro ma gbaa ụlọ George Obiozor onye bụ onyeisi otu Ohaneze nke dị na Awo-Omanma, Oru, Imo Steeti ọkụ, n'ụtụtụ Satọde a, ụbọchị 19 nke ọnwa Maachị 2022.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii nke Imo steeti bụ Mike Abattam kwuru nkea ma sịkwa na kọmịshọna uweojii steeti ahụ bụ Rabiu Hussaini nyere iwu ka ebido nyocha ma kwusie ike na a ga-ejide ndị kpara arụ a n'oge adịghị anya.

Dịka o siri dị, enweghị etu ya bụ mwakpo siri metụta onye ọbụla dịka Obiozor anọghị n'ụlọ mgbe ya bụ ihe mere.

Abattam kwuru sị, "Mwakpo awakporo ụlọ ọkankuzi George Obiozor nke dị n'obodo dị na mpghara ọwụwa anyanwụ nke okpuruọchịchị Osu nke dị nImo Steeti. Enweghị onye ọmetụtara. Nyocha ebidola ozugbo ozugbo".

Dịka otu onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya si gwa BBC Igbo, ndị omekome ahụ ruru itoolu (9) bu ụgbọala abụọ nyabata ma mụnye ọkụ n'ụlọ ahụ dị n'obodo ya n'Awo-Omamma.

Etu e si gbuo ndị uweojii abụọ na mwakpo ụlọọrụ ndị uweojii n'Umuguma

Ụlọọrụ ndị uweojii Umuguma

Ndị uweojii abụọ nwụrụ na mwakpo ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ wakporo ụlọọrụ ha dị n'Umuguma, Okpuru ọchịchị Owerri West, Imo steeti n'isi ụtụtụ Satọde.

Ụlọọrụ ndị uweojii Umuguma

Dịka onye ntaakụkọ BBC Igbo gara ebe ahụ si kwuo, e ji mma wakasịa otu n'ime ndị uweojii a ahụ, ebe mgbọ gbagburu onye nke ọzọ.

Onye uweojii nọ ọrụ ma jiri ndụ ya rie mbombo ọsọ oge ihe ahụ mere ma na-achọghị ka a kpọọ aha ya, gwara BBC na ndị omekome ahụ bu ma egbe ma mgbọ wakpoo ụlọọrụ ha dịka ha dọchichara ihu ụlọọrụ ha.

Ndị obodo ahụ nọ oge ihe mere, gwara onye ntaakụkọ BBC na ndị omekome ahụ tụbanyere ogbunigwe n'ụlọọrụ ndị uweojii ma kwawa mgbọ.

Ha kwukwara na ndị omekome ahụ bịara chebiri ndị uweojii na-agba ọsọ ndụ, mana ha gburu Iyke na Ifeanyi bụ ndị ha nwetanwuru.

Umuguma police station

Otu onye achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru sị "Ifeanyi bụ onye Umunkwo n'Umuguma ebe a. Ọ nọ n'afọ ikpeazụ ya na mahadum Imo State University, naanị otu afọ ka ọ rụrụla ọrụ uweojii a.

Ọ nọ na-achọ ịwụ mgbidi aja tupu ha ejiri mma wakasịa ya ahụ, ọ nọrọ ebe ahụ nwụọ ozugbo."

"Onye nke ọzọ bụ Iyke bụ onye Avu. Ha gbara ya egbe n'ụkwụ ebe ọ na-agba ọsọ. A hụrụ ozu ya n'ebe ọ dị ka ọ kwụsịrị ịṅụ mmiri. Ihe nke a nwere ka ọ dị."

Umuguma police station

Ndị ọrụ mmenyụ ọkụ si Owerri bịazịrị mmenyụọ ya bụ ọkụ n'ụtụtụ ahụ.

Nke a na-abịa dịka osote onyeisi ndị uweojii Naịjiria bụ Isaac Akinmoyede, bụ onyeisi mpaghara zone 9 nke Umuahia, hapụrụ steeti ahụ ka ọ bịachara njem ọrụ otu ụbọchị.