Etu 'unknown gunmen' si wakpoo ụlọọrụ NDLEA n'Ebonyi steeti, gbuo mmadụ anọ taa

Ebe foto si, NDLEA
Ndị a na-eche bụ ndị o ji egbe egbuola ihe ruru mmadụ anọ n'ụlọọrụ NDLEA, Ebonyi steeti ma merụọ ọtụtụ ahụ n'ụtụtụ taa bụ Tuzde.
Mkpamkpa kpara n'ụlọọrụ ngalaba na-ebu agha megide ibu ọgwụike na Naịjirịa bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) n'Ebonyi steeti.
- Ebonyi NDLEA killing: Ndị ojiegbeeyiegwu egbuola ndị ọrụ NDLEA abụọ ma gbaa ụgbọala ha ọkụ
- Etu ndị ojiegbe si wakpo ndị uweojii na Anambra, gbuo ndị uweojii abụọ n'Imo
- Mwakpo niile ndị 'Unknown Gunmen' mere na mpaghara Ọwụwa anyanwụ a n'izu a
- Ọ bụ ndị ohi biara iwakpo ụlọọrụ Inec dị n'Ahiazu Mbaise mana anyị nyere ha mbo mbo ọsọ - Uweojii
Akụkọ kwuru na ndị a wakporo ụlọọrụ ahụ ma gba egbe aghara aghara ebe ahụ nke gburu mmadụ anọ ma merụọ ọtụtụ ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Loveth Odah gbara ama na ihe a mere n'ezia.
O kwuru na mmadụ anọ nwụrụ ebe mmadụ abụọ merụrụ ezigbo ahụ.
N'okwu ya, ọ sị: "Otu n'ime ndị merụrụ ahụ bụ onye ọrụ ngalaba NDLEA ebe onye nke ọzọ bụ onye na-anata ọgwụgwụ ebe ahụ maka ụtọ ọgwụike banyere ya ụmị nke bụ na ọ nweghị ike ịhapụ ịṅụ ya:"

Odah kọwara na ndị o ji egbe ahụ amabeghị ndi ha bụ bu ụgbọala Toyota 4Runner Jeep wee wụbata n'ụlọọrụ ahụ dị n'okporoụzọ Abakaliki-Enugu.
O kwukwara na ha mara ụlọaja 'fence' ebe ahụ wee malite ịgba egbe na mwakpo a.
Odah sị na ihe chụpụrụ ha bụ agha ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa busoro ha nke mere ha ji rie mbọ mbọ ọsọ.
Nke na-eme ya ụgbọrọ abụọ n'ihe na-erubeghị ịzọ atọ a wakporo ndị ọrụ NDLEA n'Ebonyi steeti.
Cheta na n'ụbọchị 20 nke ọnwa Febụwarị, afọ 2022, ndị o ji egbe gbagburu otu onye ngalaba NDLEA dịka ha wakporo ha n'okporoụzọ Enugu - Abakaliki.
Ndị nkiti ndị ọzọ nwụrụ na mwakpo a, ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ.









