Ebonyi NDLEA killing: E gbuola ndị ọrụ NDLEA abụọ ma gbaa ụgbọala ha ọkụ n'Ebonyi Steeti

Onye ndụmọdụ nchekwa pụrụiche nke gọọmentị Ebonyi Steeti bụ Stanley Okoroemegha ekwuola na ndị ọrụ ngalaba Nigerian Drug Law Enforcement Agency bụ NDLEA anwụọla dịka ndị oji egbe wakpooro ha n'ụbọchịụka n'okporoụzọ jịkọrọ Enugwu na Ebonyi Steeti.
Okoroemegha kwuru na ebidola nyocha iji mere ndị kpara ya bụ mkpamkpa ma kwuo na ha ga-agba mbọ nwuchie ndị omekome mere ihe a.
Mgbe BBC Igbo garuru Obodo Ezzamgbo ebe ya bụ ihe mere, otu onye akaebe na-achọghị ka akpọọ aha ya kwuru na ọ nụ n'elekere abụọ nke abalị ka ya bụ ihe mere.
O kwuru sị, "Anyị nụrụ ụda egbe ruo awa abụọ".

Onye a kọwara na ụda egbe a mere ka egwu jide ndị obodo a.
O kwukwara na ebe awakporo ndị ọrụ NDLEA a eteghị aka n'ebe ndị agha na-echekwa okproụzọ.
Onye a kwuru sị, " Anyị bidoro ịnụ ụda egbe n'ihe dịka elekere abụọ nke abalị Sụnde".

O kwuru na ha amaghị ma e nwere onye nwụrụ kama mgbe ha pụtara ka ha hụrụ ụgbọala ndị NDLEA agbara ọkụ.
Onye a bi nso ebe ihe mere kwukwara na enweghị ndị ọrụ nchekwa ha hụrụ mgbe ya bụ ihe mere.
BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndị ụlọọrụ NDLEA n'Ebonyi steeti n'ekwe ntị ya kama ọgbanyụrụ agbanyụ.
Cheta na o rubeghị otu izuụka awakporo ma gbuo ndị uweojii atọ n'ụlọọrụ ndị uweojii nke dị n'Ezillo dị n'ụzọ jikọrọ Enugwu na Ebonyi Steeti.
Ọ bụ dịka ndị uweojii hiwere ebe ha nọ echekwea ụzọ n'ihu ụlọọrụ ha ka awakporo ha.









