Ahiazu Mbaise Inec attack: Ọ bụ ndị ohi biara iwakpo ụlọọrụ Inec mana anyị nyere ha mbo mbo ọsọ - Uweojii

Ụlọọrụ Inec

Ebe foto si, Mfon Obong(BBC Pidgin)

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ndị uweojii nọ n'Imo steeti ekwuola na bụghị eziokwu na a wakporo ụlọọrụ Independent National Electoral Commission dị n'okpuruọchịchị Ahiazu Mbaise dị n'Imo steeti n'ụbọchị Mee iri abụọ na atọ, 2021.

Ha kwuru na ha chumiri ndị ohi biara ịwakpo ụlọorụ Inec dị n'Ahiazu Mbaise nke mere na o nweghị ihe ha mebiri maọbụ zunwo tupu ha agbapụ ọsọ.

Ndị uweojii Imo steeti depụtakwara na ugbua ndị otu ha kwụ chịm na-elekọta okiriokiri ebe ahụ ma na-elekọta ụlọrụ ndị Inec niile dị na steeti ahụ.

Mana ndị mmadụ nọ n'elu soshal midia ekwu na-ekwu na ndị oji egbe gara ebe ahụ ma gbaa ụlọọrụ Inec ahụ ọkụ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Cheta na ndị o ji egbe wakpokwara ụlọọrụ Inec nakwa nke ndị uweojii dị n'Awka dị n'Anambra n'otu ụbọchị ahụ.

Lee etu e si gbaa ụlọọrụ Inec dị n'Enugu steeti ọkụ

Ụlọọrụ Inec a gbara ọkụ n'Enugwu steeti

Ebe foto si, Inec Twitter

Ndị omekome wakporo ma gbaa ụlọọrụ ndị Independent National Electoral Commission (Inec) dị n'Okpuruọchịchị Igboeze Saụt nke Enugwu steeti ọkụ n'ehihie Sọnde, Mee 23, 2021.

Mwakpo a malitere ebe elekere otu nke ehihie, bụ nke atọ a na-eme na steeti ahụ n'ime ihe na-erughi izu abụọ.

Ndị Inec kwuru na ụfọdụ akụkụ ụlọọrụ ha gbara jaa jaa tupu ndị nche na ndị ọrụ mmenyụ ọkụ Enugwu steeti enwee ike irute ebe ahụ bịa menyụọ ọkụ ahụ ma gbochie ya ịgafe ebe ndị ọzụ.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Dịka ozi Inec wepụtara si kwuo, enweghi onye nwụrụ na mwakpo ndị a n'Enugwu steeti.

Ụlọọrụ Inec wepụtara ozi a dịka ha mechara nzukọ gbasara mwakpo ụlọọrụ ha dị iche iche na mpaghara dị iche iche na Naịjiria.

Ha kọwara etu mwakpo atọ si mee n'ụlọọrụ ha dị n'Enugwu, Imo nakwa Anambara steeti, n'ime otu ụbọchị (Mee 23).

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ka ọ dị ugbua, Inec ekwuola na mwakpo ụlọọrụ ha abanyela n'ọnọdụ gbata gbata.

Lee etu ụlọọrụ Inec nke Anambara steeti dị ka a wakpochara ya n'abalị Sọnde:

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Lee etu mwakpo ụlọọrụ Inec dị n'Ahiazu Mbaise si gaa:

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

Ebonyi Inec attack: Gọvanọ Umahi agwala ndị ọrụ ya kọwaa ihe e jiri gbaa ụlọọrụ Inec ọkụ

Dave Umahi na ụlọọrụ Inec

Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi agwala ndịisioche okpuruọchịchị obodo atọ na kọmishọna na-ahụ maka okpuru ọchịchị obodo ka ha zaa ajụjụ banyere ọkụ a gbara ụlọọrụ Inec atọ dị n'obodo ha na-achị.

Ndị nke a metụtara gụnyere kọmishọna na-ahụ maka okpuruọchịchị obodo bụ Samuel Okoronkwo, onyeisioche Okpuru Ọchịchị Ezza North bụ Nora Alo na Chinyere Nwaogbaga nke Okpuru Ọchịchị Ebonyi.

Umahi sị ka ndị a dee akwụkwọ ma kọwaa ihe mere ha enweghi ike chekwaa ụlọọrụ Inec abụọ a gbara n'Ebonyi steeti n'ụbọchị Wenezde.

O kwuru nke a dịka ha mechara nzukọ ndịisi ọchịchị steetị ahụ bụ ebe kọmishọna mgbasaozi bụ Uchenna Orji wepụtara akwụkwọ ozi a.

O nyere odeakwụkwọ gọọmentị iwu ka o zigaara mmadụ anọ akwụkwọ ozi a kpọrọ 'query' na bekee ka ha kọwaa ebe mmiri si banye n'opi ụgbọghọrọ.

Cheta ndị ekperima wakporo ụlọọrụ ndị Inec abụọ dị n'Okpuru Ọchịchị obodo ndị a ma kpọọ ha ọkụ n'ụbọchị Wenezde.

Ịgba ụlọọrụ Inec ọkụ nwere ike imetụta ntuliaka - Mahmood Yakubu onyeisi Inec

Mahmood Yakubu

Ebe foto si, Getty Images

Mahmood Yakubu bụ onyeisi ngalaba na-ahazị ntuliaka bụ Inec ekwuola na mwakpo ụlọọrụ ha dị iche iche nwereike imetụta ntuliaka.

Yakubu kwuru nke a na nzukọ ya na ndị kọmịshọna na-ahụ maka ntuliaka na steeti a kpọrọ, 'Resident Electoral Commissioners' (RECs) na Bekee nwere n'Abuja n'ụbọchị Wenezde, May 19, 2021.

O kwukwara na etu e si amụnye nakwa emebi ụlọọrụ ha dị iche iche na mpaghara Naịjiria ọkachasị ndị nke e mere nso nso a, nwereike ịmetụta njikere ha maka ntuliaka ndị na-abịa n'oge adịghị anya.

Skip X post, 6
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 6

Steeti ndị nọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ebe ọkụ gbarala ụlọọrụ Inec site n'afọ 2019 ruo 2021

Abịa steeti:

E mebisiala ihe n'ụlọọrụ Inec dị na steeti a.

Nke mbụ bụ n'ụbọchị 13 nke ọnwa Disemba 2020, mgbe a gbara nke dị n'Aba Saụt ọkụ.

Nke abụọ, ha agbaghị ụlọọrụ ahụ ọkụ mana ndị omekome gara kwasasịa ma mebisia ihe n'ụlọọrụ Inec dị n'okpuruọchịchị Arọchukwu, n'ọnwa Ọktoba 2020.

N'ụbọchị itoolu nke ọnwa Mee 2021, a gbara ụlọọrụ nke dị n'okpuruọchịchị Ọhafịa ọkụ.

Skip X post, 7
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 7

Anambara steeti:

Ụlọọrụ Inec abụọ dị na steeti a agbaala ọkụ.

N'ọnwa Febrụwarị 2020, ụlọọrụ Inec dị n'okpuruọchịchị Idemili Nọt dị na steeti a nwurula ọkụ, dịka a sị na ọ bụ ọkụ a mụnyere n'ọhịa kpatara ya.

Mara na nke mbụ gbara n'ọnwa Febrụwarị 2019.

Skip X post, 8
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 8

Imo steeti:

Ụlọọrụ Inec abụọ dị na steeti a agbaala ọkụ. Nke mbụ bụ n'ọnwa Maachị 2019 mgbe ndị omekome gbara nke dị n'okpuruọchịchị Ngọ Ọkpala ọkụ.

Nke abụọ mere n'ọnwa Febrụwarị 2020, mgbe ụlọorụ Inec dị n'okpuruọchịchị Ọlụ gbara ọkụ mgbe ọkụ si n'ọhịa ndị ọrụ ugbo mụnyere gafere n'ụlọọrụ ahụ.

Enugwu steeti:

Isiụlọọrụ ndị Inec dị n'Enugwu steeti gbakwara ọkụ n'ụbọchị 16 nke ọnwa Mee 2021.

Skip X post, 9
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 9

Tupu nke a emee, a gbakwara ụlọọrụ ha dịkwa n'okpuruọchịchị Udenu ọkụ n'ụbọchị 13 nke ọnwa Mee, 2021.

Ụlọọrụ Inec abụọ gbara ọkụ n'Ebonyi steeti n'otu ụbọchị

Onye ntaakụkọ BBC setere foto gosiri mmebi ụlọorụ ndị Inec dịka a mụnyechara ya ọkụ taa n'okpuruọchịchị Ezza Nọt nakwa okpuruọchịchị Ebonyi dị n'Ebonyi steeti.

Ụlọọrụ Inec gbara ọkụ n'Ebonyi
Ụlọọrụ Inec gbara ọkụ n'Ebonyi
Ụlọọrụ Inec gbara ọkụ n'Ebonyi
Ụlọọrụ Inec gbara ọkụ n'Ebonyi

Inec ziputara ihe onyonyo gosiri etu ihe si mebie n'ụlọọrụ ha dị n'Ezza Nọt, Ebonyi, n'ụbọchị Mee 18 2021.

Skip X post, 10
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 10

Ha gosikwara nke dị n'okpuruọchịchị Ebonyi ndị omekome mụnyekwara ọkụ n'otu ụbọchị ahụ.

Skip X post, 11
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 11