Ipob alleged 'child soldiers': Anyị anaghị adọbanye ụmụaka n'otu ESN

Ebe foto si, Screen grab
Otu Ipob agọọla na ọ bụghị otu ha nwe ihe onyonyo na foto na-efegharị na soshal midia nke gosiri nwata etinyere dịka onye otu Eastern Security Network (ESN).
Agụgọ a na-abịa dịka ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ otu ahụ dịka a na-ebo ha ebubo ịdọbanye ụmụaka were ha emere ndị ọgụ.
Ebubo ahụ so ihe onyonyo wuru ewu na soshal midia ebe ndị kpọrọ onwe ha ndị Ipob/ESN bunyere nwatakịrị nwoke egbe ọ gbapụrụ otu ọnụ egbe.
Onye ndu ha n'ihe onyonyo ahụ, onye kwuru na ha nọ n'Orsu (dị n'Imo steeti), na-etu ọnụ etu ha ga-esi anyụ ndịagha Naijiria ịkpakwụ ma kwuo na otu onye n'ime ha karịrị ndịagha Naijiria 50.
Mana n'ozi mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Emma Poweful binyere aka ma wepụta n'ụbọchị Tọzde, otu Ipob kwọchapụrụ aka ha n'ihe onyonyo ahụ.
Ha sịrị, "Anyị anaghị dọbanye ụmụaka n'otu ESN n'ihi na anyị ma na o megidere iwu mbaụwa, anyị anaghị ada iwu mbaụwa."
"Ipob nwere ọtụtụ ndị ntorobịa na-adagbu onwe ha na-arịọ ka e debanye aha ha n'otu ESN, kedụzị ka ha ga-esi hapụ ndị a chọwa ụmụaka?"
Ipob boro ebubo na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ha na ndị ọrụ nchekwa na-egbunye n'otu akpa bụ ndị chọrọ inye otu ahụ na ESN ajọ aha site n'ịkpọrọ ụmụaka yinye ha akwa ESN.
Ipob ọ na-aranyezị ụmụaka ibu egbe dịka ndị otu ESN?

Ebe foto si, Screen grab
Ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu akatọọla atụmatụ itinye ụmụaka n'ihu agha nke a na-ebo otu nchekwa Ipob a kpọrọ 'Eastern Security Network'.
Nkatọ pụtara ihe ma rịa elu dịka ihe onyonyo gosiri ebe ndị yi uwe e jiri mara ndị otu ESN fegharịrị na sọshal midia ebe otu ahụ na-ama ndịagha Naijiria aka.
Ha "gosiri ndị agha ihe ha jiri biri" site na igosi nwata na-agba egbe Ak-47.
Onye bụbu Osote onyeisi Ipob bụ Uche Mefor katọrọ otu ahụ ma boo ha ebubo ịbụ isi sekpụ nti n'ebubo na alaka ọgụ ha bụ ESN na-adọbanyezi ụmụaka bụ ndị ha na-azụ n'ịlụ ọgụ egbe na ngwaọgụ ndị ọzọ.
N'ozi o wepụtara n'akara Facebook ya ụbọchị Wenezde, Mefor boro otu n'ime ndị ndu Ipob(anyị achọghị ịkpọ aha ya) ebubo na aka ya dị n'ịdọnye ụm ụaka n'otu ESN bụ ihe ọ kpọrọ 'Arụ'.

Ebe foto si, Uche Mefor
Mefor kwuru na ịkpọpụta ụmụaka bụ ndị ọ sịrị kwesịrị ịnọ n'ụlọakwụkwọ mee ha ndị na-ebu egbe megidere elu na ala.
Mefor sị: "Ala achụwala gị ọsọ maka ịlanye nwata saa ya isi ma kuziere ya tigbuo-zogbuo, napụ ya ohere ịga-akwụkwọ, napụ ya ezi mụọ."

Ebe foto si, Uche Mefor/Facebook
Mefor, onye bokwara nwa amadị ahụ ebubo aka ya ịdị na "igbusisi ndị Igbo a na-anụ aha ha," tụrụ arịrị na "arụ niile na-eme n'oge udo, ọ bụghị oge agha nke mere ya arụ kwọ nwa."

Mana ọkaiwu otu Ipob bụ Aloy Ejimakor gọrọ na ihe onyeno ahụ abụghị nke ndị Ipob.
N'otu n'ime ihe onyoonyo ndị a na-efegharị nke ngalaba nyocha akụkọ BBC bụ 'Disinformation team' gbara ama na ya bụ ihe onyonyo abụghị ihe ejije pụrụ na ntụnye, a hụrụ ndị dịka ha abụ ndị otu ESN ebe ha yi akwa e jiri mara otu ahụ, buru ọtụtụ egbe nakwa ịgba egwu ndị agha ma kwụrụ ka ndị na-eme ọzụzụ ndị agha.

Ebe foto si, Screengrab
Mmadụ abụọ n'ime ha, ndị ka nọ n'ihu bụ ọkọlọtọ ndị otu Ipob.
N'ime ya bụ ihe onyonyo, olu otu nwoke a na-eche bụ ọchịagha ndị otu a kpọpụtara onye dịka ọ bụ nwatakiri nwoke na-erubeghi afọ 11 ka ọ pụta gosi ọha na ọ bụ ọkaibu n'ịgba egbe.
Ya bụ nwata nwoke gaara ka onye ụjọ ji pụta, napụ otu onye n'ime ndị ahụ egbe.
A gwara ya gbalie ya bụ egwu elu dịka olu onye na-ese ihe onyoonyo ahụ sị ya gosi ọha etu o si agba ya bụ egbe.
Nwoke ahụ mere ihe a si ya mee dịka ọ gbaliri nnukwu egbe ahụ o ji obere gafee n'ogologo elu.
Ndị otu tiri mkpu kwuo: "Gọọmentị a bụ nke anyị, Gọọmentị a bụ nke anyị.

Ebe foto si, Screengrab
Onye na-ese ya bụ ihe onyonyo gbara ama na ha bụ ndi ESN dịka o kwukwara na ha nọ n'ogige agha ha nke nọ n'okpuruọchịchị Orsu nke Imo steeti ebe ọtụtụ mwakpo nakwa ọgbaghara na-apụ ọkụ dapụtarala kemgbe otu afọ.N'ihe onyoonyo ọzọ yiri nke a, nke sokwa na-efeghari na soshal midia ugbua, a hụrụ ebe ọtụtụ ụmụnwoke kwụ n'okporoụzọ nke gụnyere onye dịka ọ bụ nwatakiri so ha.
Olu onye na-ese ya bụ ihe onyonyo gbara ama na onye ahụ bụ nwata dịka o kwuru,"Ọ bụ ogbunigwe mụ na nwata a tụrụ chụghachiri ha azụ."
Ndị ahụ nọ n'okporo ụzọ ahụ bụ egbe kwara ndị agha Naịjirịa emo ma kwuo na ha bịa buso ha agha.
Ha kwuru na ha anaghi atụ ụjọ.

Ebe foto si, Screengrab
Olu onye na-ese ya bụ ihe onyoonyo kwuru "Unu eche na ebe a bụ ala ndị Yoruba? Maọbụ na ebe bụ Obi Igbo nke o jiri bụrụ Port Harcourt?"
"Unu bịa ebe, anyị a melina unu"
"Otu onye ndị agha anyị kariri mmadụ 50 ndị agha Naịjirịa".
Ha kwupụtara ụbọchị esere ya bụ ihe onyoonyo dịka ụbọchị 27 nke ọnwa Febụwarị.
Ha gakwara n'ihu kwuo na ebe ha nọ see ya bụ ihe onyoonyo bụ n'oke ala Imo na Anambra steeti nke na-egosi na ihe mere na mpaghara okpuruọchịchị Orsu/Ihiala ebe ndị uweojii Naịjirịa kwuru n'oge gara aga na-agba mbọ idaju ọtụtụ mwakpo na-arị ibe ya elu ebe ahụ.
Ọtụtụ ndị mmadụ akatọọla atụmatụ itinye ụmụaka n'iru agha nke a na-ebo otu nchekwa Ipob a kpọrọ Eastern Security Network.
Kedụ ka Eastern Security Network (ESN) si bido?
Cheta n'ọnwa Disemba afọ 2020, Nnamdi Kanu malitere otu ọrụ nche o kwuru ga-echekwa Ọwụwa Anyanwụ megide mwakpo ndị ọ nke ọ kpọrọ 'Eastern Security Network'.
Malite mgbe ahụ rue ugbua, tigbuo zogbuo rịrị eru n'a mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n'ụdị a hụbeghị mbụ ma e wezuga n'oge Agha Biafra( 1967-1970).
A gbazaala ọtụtụ ogige ndị uweojii na ụlọ ndị nkịtị ọkụ ma gbusịa ọtụtụ ndị uweojii na ndị Igbo nwere agba.
Ndị ọrụ nchekwa nakwa Gọọmentị Naijiria eboola Ipob na ESN ebubo ịbụ ndị na-akpa arụ ndị a ahụ n'ala Igbo mana Ipob agọọla ugboro ugboro na aka ha dị ọcha.








