Ụlọikpe mkpegharị atụgharịala ikpe zubere ịchụpụ Gọvanọ David Umahi n'ọkwa

Ebe foto si, Dave Umahi/Facebook
Ụlọikpe mkpegharị nke Abuja atụgharịala ikpe chụpụrụ Gọvanọ David Umahi nakwa osote ya bụ Eric Igwe n'ọkwa ha dịka gọvanọ na osote n'ihi isi na otu People's Democratic Party (PDP) banye otu All Progressives Congress (APC) dịka ha nwetachara mmerị n'okpuru PDP.
O mere mkpebi a n'ụbọchị 28 nke ọnwa Ọktoba, 2022. Ụloikpe kwuru na iwu ala Naịjirịa nke 1999 ekwughi ntaramahụhụ ọbụla dịịrị onye ọbụla gbanwere otu ndọrọndọrọ ya ma ọ banye ọkwa ọchịchị.
Ha nyekeara ntuziaka na ọ bụ naanị site n'ịchọ ụzọ ihe Bekee kpọrọ 'impeachment' ka a ga-enweike isi mezuo emunobi nchutu Umahi n'ọkwa.
Ọkaiwu Tsanammi bụkwa onye nyere ikpe gbasara Nnamdi Kanu taa bụ ụbọchị 28 nke ọnwa Ọktoba kwuru na ihe ọzọ otu PDP nwereike ịme bụ iji usoro dị n'iwuala Naịọjirịa chụtuo Umahi n'ọkwa
Cheta na n'ọnwa Maachị afọ a, Ọkaikpe Ekwo n'ụlọikpe ukwuu nke Abuja enyebuola otu PDP mmeri gbasara okwu a mgbe o kwuru na ọ bụ otu PDP meriri ntuliaka kpọbatara Umahi n'ọkwa na ọ bụghị Umahi n'onwe ya meriri.
Ihe mere Dave Umahi ji ka nọrọ n'oche dịka gọvanọ

Ebe foto si, David Umahi/Facebook
Ụlọikpe mkpegharị dị n'Enugu steeti kụchapụrụ mkpesa Sịnetọ Soni Ogbuoji na ogbo ya bụ Justin Mbam nwetere ya ka a chụtuo David Umahi na Osote ya bụ Kelechi Igwe n'ọkwa ọchịchị dịka gọvanọ na osote ya.
Nke mere n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Eprel, 2022.
Soni Ogbuoji na Justin Mbam bụ ndị zọrọ ọkwa ọchịchị steeti ahụ na ntuliaka nke afọ 2019 n'okpuru pati All Progressives Congress (APC) mana ha mere mkpesa ọhụrụ ka a chụpụ David Umahi na osote ya bụ n'ihi ha si na pati ha nọ mgbe ha nwetere ọchịchị nke bụ People's Democratic Party (PDP) gafee pati ọzọ nke bụ APC mgbe ha nwetechara ọchịchị.
Nke a na-abịa dịka ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja chuturu gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi na osote ya bụ Eric Kelechi Igwe n'ọkwa oche ọchịchị ha n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Maachị maka isi na pati People's Democratic Party (PDP) wụbanye All Progressives Congress (APC).
Na mkpebi a nke Jọstịs Inyang Ekwo nyere n'ụlọikpe ụbọchị, o kwuru na vootu 393, 042 e nyere Umahi n'abalị itoolu nke ọnwa Maachị 2019, bụ nke PDP.
Chetakwa na n'ụbọchị 28 nke ọnwa Febụwarị 2022, ụlọikpe ukwu nke Ebonyi steeti dị n'Abakaliki kụchapụrụ ikpe a ma daa ndị nwetere ya bụ mkepsa nha ego ruru N500,000.00 maka mmekpa ahụ ha nyere Umahi.
Ọkaikpe A.O Belgore kụchapụrụ ikpe n'ihi o kwuru na ọ gbadoghị ụkwụ n'iwu ala Naịjirịa.
Ihe Inec kwuru n'oge gara aga maka okwu a
Ngalaba na-ahazị ntụliaka na Naijiria bụ Inec n'ịchafụ ekwuola na ha anatabeghị akwụkwọ asambodo mkpebi Ụlọikpe Ukwu n'okwu nchụtu Dave Umahi n'ọkwa gọvanọ Ebonyi steeti.
Festus Okoye bụ kọmịshọna mgbasaozi Inec gbara ama a na mkparịtaụka ya na ụlọntaakụkọ Channels TV nwere ụbọchị Tọzde.
Cheta na Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja nọrọ n'ụbọchị Tuzde abalị asatọ nke ọnwa Maachị 8, afọ 2022, chụtuo Umahi dịka gọvanọ.
N'ikpe ahụ nke Jọstịs Inyang Ekwo nọ n'isi, ụlọikpe ahụ nyere PDP ntuziaka ka ha weta aha ndị ga-anọchi Umahi na Osote ya bụ Kelechi Igwe.
Anyị ahọpụtala ndị ga-anọchi Umahi na osote ya - Ndị PDP Ebonyi Steeti

Ebe foto si, PDP/Umahi
Ndi otu Peoples Democratic Party (PDP) ekwuola na ha ahọpụtala mmadụ abụọ ga-anọchi Dave Umahi na osote ya, dika uloikpe dị n'Abuja si nye iwu.Ọ bụ Mazi Abịa Onyeike, onye bụbu Kọmishona mgbasa ozi na steeti ahụ, kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo n'ubochi Wenezde.
Onyeike kwuru na aha mmadụ abụọ ahụ bụ Ndume Igariwey, na Fred Udeogu.Ọ gara n'ihu kwuo na mkpebi ahụ bụ ikpe ziri ezi, maka na ọ bụ ihe mmadụ niile nọ na steeti ahụ chọrọ.Mana gbasara ihe Umahi kwuru na ya agaghị erubere mkpebi ahụ isi, Onyeike kwuru na nke ahụ egosila ụwa niile ụdị mmadu Umahi bụ.N'aka nke ọzọ, odeakwụkwọ ndị PDP Ebonyi Steeti, bụ Luke Nkwoagu, gwara BBC Igbo na ọṅụ juru ọtụtụ ndị mmadụ n'obi oge akụkọ gbasara nchutu Umahi pụtara.Nkwoagu kwuru na ndị mmadụ na-enwe aṅụrị n'ihi na PDP anataghachila oke ruuru ha bụ nke Umahi nyere ndị APC n'ụzọ wuruwuru.
Ka anyị chebiri ihe ụlọikpe mkpegharị nwere ikwu maka ikpe m - David Umahi

Dave Umahi bụ aka na-achị Ebonyi steeti agbaala akwụkwọ n'Ụlọikpe Mkpegharị ịgbagha mkpebi Uloikpe Ukwu dị n'Abuja nyere ka a chụtuo ya n'ọkwa dịka Gọvanọ.
N'akwụkwọ mgbagha mkpebi ahụ nke Okaiwu Chukwuma Ume(SAN) tinyere n'ụlọikpe, Umahi chọrọ ka Ụlọikpe Mkpegharị wezụga n'akụkụ mkpebi nke Jọstịs Inyang Ekwo nyere n'abalị asatọ nke ọnwa Maachị.
Nke a na-abịa oka otu abalị gachara ụlọikpe nke Jọstis Inyang Ekwo chutur ya dịka gọvanọ maka ịhapụ PDP fere APC.
Umahi katọburu ọkaikpe ahụ maka mkpebi ya ma kwuo na ya agaghị ege mkpebi o nyere mana ọgbakọ ọha ya na dị nkwado APC nwere n'Abakaliki n'ụbọchị Wenezde, Ụhahi gọrọ na ya akataghị ọkaikpe.
Ọ sị: Eji m ohere na-eme ka ụmụ Naijiria nile mata na o nweghị onye katọrọ Ọkaikpe, anyị agaghị akatọ ya."
O nwere ihe anyị kwuru ụnyaahụ mana okwu ahụ adịghị n'ihu ọkaikpe ọbụla."
Umahi gara n'ihu boo otu PDP na ọ bụ ha nyụrụ ihe na-esi."Ọ bụ PDP na-achọ imemila ala a."
"Ọtụtụ n'ime ha bụ ndị nrụụaka, ha na-ebugharị ego mana Chineke ga-ejide ha."
Ọ gwara ndị Ebonyi ha akụjala na ya ka bụ gọvanọ steeti ahụ.
Nigeria Bar Association akatọọla ọjụjụ a Gọvanọ Dave Umahi jụrụ ịnabata mkpebi ụlọikpe ukwu n'Abuja

Ebe foto si, EBONYI GOVERNMENT
Otụ ụbọchị ụlọikpe ukwu dị n'Abuja chụpụchara Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi steeti n'oche dịka Gọvanọ, ndị otụ jikọtara ndị ọkaikpe na Naịjirịa bụ Nigeria Bar Association akatọọla otu ya bụ gọvanọ siri katọ ọkaikpe kpebiri ya bụ ikpe bụ Ọkaikpe Inyang Ekwo na akaọrụ ya.
Ya bụ ụlọikpe nyere Dave Umahi na osote ya bụ Eric Kelechi ọsọ maka ihe ọ kọwara ka iburu mmeri ndị People's Democratic Party, PDP gbafee na All Progressive Congress, APC.
NBA na-akọwa na Umahi kwufere okwu oke maka iwe ihe ya bụ ụlọikpe kpebiri.
Ha sị na Umahi kparịrị Ọkaokpe ahụ site n'ịkpọ ya aha ọjọọ nakwa ịkatọ ya dịka ikpa akwụghị ọtụ ma sịkwa ọnwụ na ya agaghị edowe iwu ya.
NBA kọwara akwa Umahi ka "mpụnaiti kachasị elụ na okwu ndị agboro".
N'akwụkwọ ozi ha detere, NBA sị na ọtụtụ mmadụ akpọọla ha na-ekwu na NBA ekwesighị ịleghara ụdị ihe ahụ anya, mana akpọkụ ka ha gbaa mbọ hụ na ha ahapụghị ya maka ịchakwa ọrụ ndị ọkaikpe.
Ha sị na ọ bụ ihe ihere na onye dị otu ahụ na-ekwu ụdiri okwu ahụ ma katọkwa ya bụ agwa Umahi kpara.
Ha sịkwa na ihe atụrụnya n'aka Umahi bụ ịme ka ndị otu ya daa juu were gaa ụlọikpe mkpeghari, kama na ọ
Aka m bụ gọvanọ Ebonyi steeti, ọkaikpe ahụ enweghị ike iwepụli m- Umahi

Dave Umahi nke Ebonyi steeti ekwuola na ya agaghị ege ntị na mkpebi nke Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja nyere iji chụtuo ya n'ọkwa dịka gọvanọ steeti ahụ.
N'ụbọchị Tuzde,abalị asatọ nke ọnwa Maachị, Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja napụrụ Ụmahi na Osote ya ọkwa dịka gọvanọ Ebonyi steei maka isi na pati PDP bụ ebe ha nwetara mmeri fenye n'APC.
Mana n'okwu ya dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ n'Abakaliki n;'ehihie Tuzde, Umahi kwuru na ya agaghị ege ntị na mkpebi ahụ nke Jọstịs Inyang Ekwo nyere n'ihi na ọ dabaghị.
O boro Ọkaikpe ahụ ebubo ịnaa akaazụ na ị chọo imechu APC na gọọmenti etiti ihu.
Umahi onye kwuru na ya bụ mkpebi gosiri na Ọ sị, "Anyị anụlarị m kepukepu na ọ chọro inye ikpe megide m iji mechu APC,imechu Gọọmenti Etiti .
"Aka m bụ gọvanọ Ebonyi steeti, ọkaikpe ahụ eweghị ike iwepụli m"
"Anyị agaghị ege ntị na mkpebi Ọkaikpe ahụ. "
"Ụlọikpe dị na Zamfara enyela mkpebi na ya bụ okwu. Ulọikpe dị n'Ebonyi enyekwala nke ha. Ihe ọ dịr m bụ ịhọrọ nke m ga-ege ndị."
Cheta na otu PDP gbara Umahi akwụkwọ maka ịgbahapụ pati ha banye PDP.
Ụlọikpe esepụla Umahi oche n'otele dịka Gọvanọ Ebonyi

Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja achụpụla gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi na osote ya bụ Eric Kelechi maka isi na pati People's Democratic Party (PDP) wụbanye All Progressives Congress (APC).
Na mkpebi nke Jọstịs Inyang Ekwo nyere n'ụlọikpe ụbọchị Tuzde, abalị asatọ nke ọnwa Maachị, 2022, o kwuru na vootu 393, 042 e nyere Umahi n'abalị itoolu nke ọnwa Maachị 2019, bụ nke PDP.
Ọkaikpe nyere PDP iwu ka ha wegara Inec onye ha chọrọ ka ọ zọ ọkwa gọvanọ n'aha pati ha na ntuliaka ọhụrụ.
Umahi, onye nọ agba nke abụọ ya dịka gọvanọ Ebonyi banyere APC n'ọnwa Novemba m,afọ 2021 sị na ọ bụ maka "enweghị ikpemnkwụmọtọ na PDP" ka o ji pụọ.
O kwuru na agbanyeghị nkwado ndị Ọwụwa Anyanwụ nyere PDP kemgbe afọ 1998, na o nweghị ihe ha ritere.












