Bamise Murder: Ọkaikpe sị ka a tụnyegodị ọkwọụgbọala BRT a na-enyo maka ọnwụ Bamise na mkpọrọ

Ebe foto si, Bamise/ Andrew Nice- Facebook
Jọstis Sherifat Shonaike anọrọla n'ụlọikpe Ukwu Legọs steeti dị na Tafawa Balewa Square ụbọchị Tuzde nye iwu ka a tụnye nwoke a na-enyo maka ọnwụ nwaada Oluwabamise Ayanwole n'ụlọmkpọrọ ruo oge a ga-enwe ikpe ahụ ọzọ.
Gọọmenti Legọs kpụpụrụ Andrew Nice Ominnikoron, onye ọrụ ụlọọrụ ụgbọala gọọmentị Legọs steeti a kpọrọ 'BRT' n'ịchafụ n'ụlọikpe maka ebubo idina n'ike, ịkpa nkata ọjọọ nakwa igbu nwada Bamise.
A na-ekpekwa Nice ikpe maka ebubo idina nwaada ozọ aha ya bụ Nneka Maryjane Ozezulu, onye gbara afọ 29 n'ike n'abalị 25 nke ọnwa November afọ 2021.
Cheta na a malitere chọwa Bamise achọ n'abalị 27 nke ọnwa Febuwari afọ 2022, ka ọ bachara ụgbọala gọọmentị nke Ominnikoron kwọ si Chevron aga Oshodi, Legọs n'ebe Elekere asaa nke abalị.
E mechara hụ ozu ya ka ọ gachara abalị asaa n'elu akwammiri 'Carter Bridge' dịka ndị bi na nso ebe ahụ wegara ndị uweojii ozi na ha hụrụ ozu nwaanyị n'akwa mmiri ahụ.
N'ụlọikpe, ọkaikpe wetara ikpe ahụ n'aha steeti bụ Jide Martin boro ebubo na Ominnikoron na ndị ọzọ a nwụchibeghị dinara onye njem dị afọ 22 n'ike ma gbuo ya.
Martin, onye kwuru na ya bụ ihe mere n'abalị 26 ọnwa Februwarị n'okporoụzọ awara-awara Lekki - Ajah Conservation Expressway nakwa Cater Bridge n'ebe Elekere asatọ nke abalị boro ebubo na Ominnikoron na ndị otu ya si n'ụgbọala na-aga aga tụtuo nwada Bamise ka ha dịnachara ya n'ike, were si etu ahụ gbuo ya.
Mana nwa amadi ahụ gọọrọ si na aka ya dị ọcha.
Cheta na a nwụchiburu Ominnikoron bụ onye gbaburu ọsọ n'ebe o bi.
Ndị DSS anwụchiela ọkwọ ụgbọala BRT na mmadụ abụọ ndị ọzọ maka ọnwụ Oluwabamise Ayanwole

Ebe foto si, Screenshot
Ndị uweojii pụrụiche bụ Department of State Services (DSS) anwụchiela ọkwọ ụgbọala ndị Bus Rapid Transit (BRT) ahụ nwaagbọghọ gbara afọ iri abụọ na abụọ (22) bụ nwaada Oluwabamise Ayanwole banyere tupu atọrọ ma gbuo ya.
Ha jidere ya bụ nwoke ọkwọ ụgbọala na Steeti Ogun.
Ebe ha ekwughi ebe na etu ha si nwụchịe mmadụ abụọ ndị ọzọ a sị ma ya bụ nwoke.
Ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV na-akọwa na anwuchiri ya bụ nwaadị gbapụrụ ọsọ ozugbu ya bụ ihe mere n'ebe Odogbolu na steeti ahụ.
Adekunle Ajisebutu bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs steeti kwuru na Kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Abiodun Alabi hụrụ mkpa akụkọ ọnwụ nwaagbọghọ a dị.
Nke a mere o ji nye iwu ka ngabala uweojii pụrụiche bụ State Criminal Investigation Department (SCID) were ya bụ okwu ma sie ime n'ala ruo mgbe ha nyochapụtara ndị kpara mkpa mkpa a.

Ebe foto si, Screenshot/TVC
Ihe Ọkwọ ụgbọala ahụ kwuru
Ụlọọrụ ntaakụkọ TVC wepụtara ihe onyoonyo nke gosiri mkparịtaụka ha na ya bụ Ọkwọ ụgbọala nwere n'ụbọchị Mọnde dịka ndị uweojii wụchịchara ya.
N'ihe onyoonyo ahụ ya bụ nwoke a sị bụ onye ọkwọ ụgbọala BRT ahụ kwuru na nwaada Oluwabamsi banyere ụgbọala ya na mpaghara Chevron nke Legọs steeti ebe ndị nwoke atọ ndị ọzọ banyere na mpaghara Agbighi.
O kwukwara na ndị nwoke atọ ahụ gosiri ya ngwaagha ha ji nke mapụrụ ya obi ma tinye ya ụjọ n'ahụ.
O kwukwara na mgbe ha ruru akwa mmiri nke Carter dị na Legọs steeti, ndị nwoke ahụ gwara ya kwụsị ụgbọala ya n'ike ma mepere ha ụzọ.
O sị na o ji ụjọ mee ihe ha kwuru dịka ma malitere dọwa ya bụ nwaada ka ha dọpụta ya n'ike n'ime ụgbọala ahụ.
N'okwu ya ọ sị: "Nwaada ahụ malitere tibe mkpu akwa ma na-arịọ ka ụwa bịa nyere ya aka"
Ọ gara n'ihu kwuo "Ihe a gbawara m obi dịka enweghị ihe m nwereike ime i ji nyere ya aka"
O kwuru na ọ mechara malite inya ya bụ ụgbọala mgbe ndị a kpụpụrụ ya bụ nwaada.
Onye ọkwọ ụgbọala ahụ kwukwara na ọ gbapụrụ ọsọ gbaga Ogun steeti n'ihi ya bụ ihe mere tinyere ya egwu n'ahụ.

Ebe foto si, Oluwabamise/BRT
Etu e si hụ ozu Ayanwole Oluwabamise dịka o furu n'ụgbọala BRT ndị Legọs steei
Ndị mmadụ na-akwa arịrị maka etu e si tọrọ ma gbuo Oluwabamise Ayanwole na Legọs steeti n'izu ole m ole gara aga.
Ndị uweojii nke Legọs steeti mechara kwupụta n'ozi ha ziputere n'ụbọchị Mọnde, asaa nke ọnwa Maachị, 2022, na ọ bụ eziokwu na Olubamise anwụọla.
Kunle Ajisebutu bụ ọnụ na-ekwuru ha sị "Ọ na-ewute ndị uweojii Legọs steeti ikwupute na Oluwabamise Ayanwole, bụ nwaagbọghọ afọ 22 furu efu dịka ọ nọ na-eme njem n'ụgbọala (Bus Rapid Transit System) BRT n'ụbọchị 26/02/2022, anwụọla".
Ajisebutu kwuru sị "Anyị hụrụ ozu ya n'elu akwammiri Carter dị n'obodo Ogogoro dị na Legọs Aịlandị. Ozu ahị dị n'ụlọozu dị n'ụlọọgwụ Mainland Hospital na Yaba ebe a ga-enyocha ya.
"Anyị akpọkuola ezinụlọ ya, ha ekwuola na ọ bụ ozu nwanne ha."
Nke a na-abịa dịka ndị uweojii kwuputeburu na ngwụcha izu gara aga, na ha nọ na-eme nnyocha na nchọpụta gbasara nwaagbọghọ ahụ na-efu kemgbe ọnwa Febrụwarị.
Akụkọ Ayanwole wuru na soshal midia mgbe ezinụlọ ya kwuru na ha ahụbeghi ya kemgbe o si n'ụgbọala ọ banyere kpọọ ha.
Dịka ndị uweojii si kwuo, ya bụ ihe mberede mere mgbe Bamise banyere BRT si na Chevron bus stop dị na Lekki na-aga Oshodi ebe elekere asaa nke mgbede.
Nwaagbọghọ ahụ bụ onye na-akwa akwa, kpọrọ enyi ya n'ihe onyonyo oge ọ dị ya ka ihe ọjọọ ọ na-achọ ịdakwasị ya.
Ọ gwara enyi ya n'onyonyo ahụ sị "Ụmụnwoke atọ na otu nwaanyị nọ n'ime bọọsụ a. Nke nwaanyị nọ n'azụ azụ."
O wegakwara onyonyo ahụ ebe ọ ga-esete akara bọọsụ ahụ wee kwuo "nke a bụ akara bọọsụ a ka ị mara amara. Biko kpeere m ekpere."
N'ime otu onyonyo ahụ, enyi ya gwara ya sị rituo n'Oworonshoki, mana enweghi onye mazị ihe mere ka ha kpachara.
Akụkọ na-efegharị kwuru na ọkwọụgbọala BRT ahụ tọrọla ya kemgbe ahụ.














