Etu mgbọ si tụgbuo nwaagbọghọ n'Azia, dịka ndị uweojii sị n'aka ha adịghị ya

Chidimma Ezeanochie

Ebe foto si, Facebook screengrab

Ihe anyammiri mere n'obodo Azia nke dị n'okpuru ọchịchị Ihiala, n'Anambra steeti n'ụbọchị Tọzde, abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Nọvemba afọ 2021.

Mgbọegbe tụgburu nwaagbọghọbịa aha ya bụ Chidimma Ezeanochie, onye gbara afọ iri abụọ.

Ndị obodo Azia na-ekwu na ọ bụ ndị uweojii gbagburu nwata nwaanyị a na-enwghị ihe ọbụla o mere.

Mana ndị uweojii agọọla na aka ha adịghị n'ọnwụ nwa ada a.

Gịnị mere kpọmkwem?

Ndị obodo Azia kwuru na Chidimma na nwanne ya nwoke nke nta na-agara nne ha ozi oge ha zutere ndị uweojii n'ụzọ.

Ha sị na ndị uweojii gbara Chidimma egbe n'isi ugboro agbụọ, ma gbakwaa nwanne ya nwoke egbe, mana o zere ya.

Nke a mere ka ndị ntorobịa malite ime ngagharịiwe na ekwu na ha achọghịzi ndị uweojii n'obodo ha.

Ngagharịiwe n'Azia

Ebe foto si, Facebook screengrab

N'otu aka ahụ kwa, otu jikọrọ ndị obodo Azia dekwara akwụkwọ mkpesa degara onyeisi ndị uweojii n'Abuja.

N'ime akwụkwọ mkpesa ahụ, ha dere sị: "Onweghị ihe ọbụla nwa ada a mere iji kpasuo ndị uweojii iwe kpatara ha jiri gbaa ya egbe."

"Oge anyị jụrụ ajụjụ, ndị uweojii kwuru na ndị ahụ bụ ndị e si n'Awka zite ka ha ga buso ndị IPOB agha n'obodo Orsumoghu."

"Obodo anyị bụ Azia na Orsumoghu abụghị otu ihe. Anyị bụ ndị udo."

Ha kpọrọ oku ka onyeisi ndị uweojii nyochaa ya bụ ihe ma mee ka ndị obodo Azia nweta ikpe ziri ezi.

Ihe ndị uweojii kwuru

Echeng Echeng

Ebe foto si, Nigeria Police

Nkọwa foto, Echeng Echeng bụ onyeisi ndị uweojii n'Anambra steeti

N'akwụkwọ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Toochukwu Ikenga, o kwuru na aka ndị uweojii adịghị n'ọnwụ Chidimma Ezeanochie.

Ikenga kwuru sị: "N'ụbọchị ahụ, ndị ekperima wakporo otu ụgbọala ndị uweojii bu ndị uweojii asaa, nakwa ụgbọala ndị nkịtị atọ, n'okporoụzọ si Azia gawa Orsumoghu."

"Ndị ekperima a gburu ndị uweojii abụọ ma gbaa ozu ha ọkụ, ebe otu onye uweojii ọzọ ka a na-achọ achọ."

"Ndị uweojii ndị ọzọ jisi ike lụọ ọgụ ma zọpụta onwe ha nakwa ndị nkịtị atọ ahụ."

"Oge onyeisi ndị uweojii bụ Echemg Echeng nụrụ nke a, o zipụrụ ndị uweojii ọzọ ka ha ga chọta onye uweojii ahụ na-efu efu, ma wetakwa egbe ha nke ndị ekperima wekọọrọ."

"Mgbe ndị uweojii ahụ rutere n'okporo ụzọ Azia/Orsumoghu, ndị ekperima ahụ malitekwara ịkwa ha mgbọ ọzọ ma na-atụkwa ha ogbunigwe."

"Mana ndị uweojii ahụ jisi ike chụsaa ha, ma wetakwa egbe ndị uweojii nke mbụ nke ndị ekperima ahụ zuru."

"Oge niile ihe ndị a na-eme, onweghị otu onye nkịtị maọbụ nwatakịrị a hụrụ n'okirikiri ahụ."

"Ọ tụrụ anyị n'anya ịnụ na mgbọ ndị omekome ahụ tụgburu otu nwaagbọghọ."

"Akụkọ a wutere onyeisi ndị uwojii nke ukwu. Ọ na-arịọ ezinụlọ nwa ahụ nwụrụ anwụ ka ha kara obi."

"Onyeisi ndị uweojii kwere nkwa na ha ga-agba mbọ ime ka ezi nchekwa laghachi n'obodo ahụ n'oge adịghị anya."